Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 9
  • Ndịàmà Ejekwuru Ọha na Eze na France

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Ejekwuru Ọha na Eze na France
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmeghachi Omume Dị Ngwa ma Dị Mma
  • ‘Ha Na-ekwu Banyere Ịdị Mma Na Ịhụnanya’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jiri Traktị Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Jiri Traktị Malite Mkparịta Ụka
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Nkesa Pụrụ Iche A Ga-ekesa Traktị Malite na January 19 Ruo February 15, 2009!
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 9

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ndịàmà Ejekwuru Ọha na Eze na France

SITE n’ụtụtụ Friday, January 29, 1999, ruo ná ngwụsị izu ahụ, Ndịàmà Jehova nọ na France ji ịnụ ọkụ n’obi kesaa nde traktị 12 nke isiokwu ya bụ People of France, You Are Being Deceived! (Ndị France, A Na-aghọgbu Unu!), n’okporo ámá, e mesịakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ihi gịnị ka ha ji mee mkpọsa dị otú ahụ?

Ná nzukọ ịgwa ndị nta akụkọ okwu nke e nwere na Paris n’ụtụtụ Friday ahụ, e kwuru ihe mere e ji mee mkpọsa ahụ. Onye na-ekwuchitere Ndịàmà kọwara, sị: “Ihe anyị chọrọ ime taa bụ ime ka a mara anyị maka ihe anyị bụ ma mee ka okwu ndị na-emebi aha a na-agbasa banyere anyị kwụsị. Anyị dị njikere ịnabata nkatọ, ma anyị agakwaghị ege okwu ụgha na okwu ndị na-emebi aha anyị.”

Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova bụ okpukpe ndị Kraịst nke atọ kasị ukwuu na France, a kparịwo ma majaa ọtụtụ ụmụaka bụ́ Ndịàmà n’ụlọ akwụkwọ. A napụwo ndị toworo eto ọrụ ha ma yie ha egwu n’ihi okpukpe ha. Nke siri ike nkweta bụ na ọbụna onyinye afọ ofufo okpukpe ndị ha nataworo ka e kwuru na ha ga-akwụ ụtụ isi pasent 60 na ya. Olee otú mkpọsa ahụ si mee ihe banyere ịkpa ókè a?

Traktị ahụ na-ekwu, sị: “Ndịàmà Jehova 250,000 na ndị enyi ha bi na France NA-EME MKPESA megide ụzọ ụgha e siworo kwuo na o nwere ihe jikọrọ okpukpe ndị Kraịst ha, bụ́ nke dịworo na France kemgbe 1900, na òtù nzuzo ndị dị ize ndụ kemgbe 1995. . . . NA-EME MKPESA megide mmaja a majaworo ha n’esepụghị aka.” E kpughere ebubo ụgha ndị e boro Ndịàmà nọ na France nakwa ụzọ aghụghọ nke ndị nkwutọ siworo chọọ ime ka e mee mkpọsa na-ezighị ezi banyere ha. Traktị ahụ mechiri site n’ịsị: “Taa, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova abụọ na ndị enyi ha bi na Europe. Ha na-akwanyere iwu nke Ọchịchị ha nọ n’okpuru ya ùgwù site n’ịgbaso ụkpụrụ ndị dị n’Oziọma ahụ. Ndị France, ihe ndị a bụ nke bụ́ eziokwu. Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ikwu ha otú ha dị n’ezie!”

Mmeghachi Omume Dị Ngwa ma Dị Mma

E kesara ọtụtụ nde traktị n’ụbọchị mbụ. Na Paris nanị, ka ọ na-erule etiti ụbọchị ihe karịrị Ndịàmà 7,000 enyefeela ihe karịrị 1.3 nde traktị n’aka ndị mmadụ. Ịhụ ka ọtụtụ Ndịàmà na-enyefe traktị n’okporo ámá bụ ihe ọhụrụ n’ezie nye ndị mmadụ. Usoro mgbasa ozi, gụnyere akwụkwọ akụkọ mba na ndị nke ime obodo nakwa telivishọn, meghachiri omume n’ụzọ dị mma nye mkpọsa ahụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Progrès de Lyon kwuru, sị: “Ihe a e mere . . . wepụtara nghọtahie e nwere banyere otu okwu. N’afọ iri gara aga, okwu ahụ bụ́ ‘ịrọ òtù’ . . . enyewo echiche na-ezighị ezi, nke dị ize ndụ, ma na-emerụ ahụ. . . . Ndịàmà Jehova adịghị ize ndụ n’ụdị yiri ka ọ ga-etisasị ọha na eze.”

Ndị maara Ndịàmà Jehova na-aghọta na ha bụ ndị udo nakwa na ha na-enwe nkwanye ùgwù miri emi n’ebe usoro iwu e guzobere eguzobe nke na-achịkwa ọha na eze dị. N’ihi ya, ọtụtụ ndị nọ n’okporo ámá gosipụtara ekele na nkwado ha n’ebe ọtụtụ iri puku Ndịàmà bụ́ ndị keere òkè ná mkpọsa ahụ nọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, e nwetara òkù telifon, ozi fax, na akwụkwọ ozi dị iche iche site n’aka ndị mmadụ bụ́ ndị na-egosipụta ekele ha nwere maka traktị ahụ. Nke kasịnụ, e nyere ndị nwere obi eziokwu ohere ịnụ ihe bụ́ eziokwu banyere Ndịàmà nke na-abụghị okwu ụgha na nke nzuzu, ndị ahụ e kwutọworo okpukpe ha nwekwara ike igosipụta mmetụta ha maka ihe ha ji kpọrọ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya