Iji Obi Ụtọ Na-anabata Nduzi Jehova
Dị Ka Ulysses V. Glass Si kọọ
Ọ bụ ihe omume pụrụ iche. E nwere nanị ụmụ akwụkwọ 127 nọ na klas ahụ na-agụsị akwụkwọ, ma ndị bịaranụ dị 126,387, bụ́ ndị si ọtụtụ mba. Ọ bụ ngụsị akwụkwọ nke klas nke 21 nke Watchtower Bible School of Gilead, nke e nwere n’Ámá Egwuregwu Yankee nke New York City na July 19, 1953. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji bụrụ nnọọ ihe omume dị ịrịba ama ná ndụ m? Ka m kọtụrụ gị banyere nzụlite m.
A MỤRỤ m na Vincennes, Indiana, U.S.A., na February 17, 1912, ihe dị ka afọ abụọ tupu ọmụmụ nke Alaeze Mesaịa ahụ, dị ka a kọwara ná Mkpughe 12:1-5. N’afọ bu ya ụzọ, nne na nna m malitere ịmụ Bible tinyere mpịakọta nke Studies in the Scriptures. Kwa ụtụtụ Sunday, papa m na-agụrụ ezinụlọ anyị akụkụ nke otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ, nke ahụ gasịa anyị ekwurịta banyere ya.
Mama m ji ihe ọ na-amụta na-eme ihe iji nye aka ịkpụzi echiche nke ụmụ ya. Ọ bụ nnọọ ezigbo mmadụ—ọ dị nnọọ obiọma, dị nnọọ njikere inye aka. Anyị dị ụmụaka anọ, ma ịhụnanya mama m ruru n’ebe ụmụaka ndị ọzọ anyị na ha gbara agbata obi nọ. Ọ na-eso anyị anọkọ. Ọ na-enwe ọṅụ ịkọrọ anyị akụkọ Bible na iso anyị bụọ abụ.
Ọ na-akpọkwa ndị dị iche iche na-eje ozi oge nile òkù ịbịa n’ebe obibi anyị. Ha na-anọ nanị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, na-enwekarị nzukọ, na-ekwukwa okwu n’ebe obibi anyị. Anyị na-enwe mmasị karịsịa n’ebe ndị na-eji ihe atụ eme ihe ma na-akọrọ anyị akụkọ nọ. N’otu oge na 1919, ihe dị ka otu afọ mgbe agha ụwa mbụ bisịrị, nwanna nwoke ahụ si esi bịa kwuru okwu ya karịsịa banyere anyị bụ́ ụmụaka. O kwuru okwu banyere ido nsọ—ihe anyị na-ezo aka ugbu a n’ụzọ ka zie ezi dị ka nraranye—ma nyere anyị aka ịghọta otú o si metụta ndụ anyị. Mgbe e mesịrị n’uhuruchi ahụ, mgbe m labara ụra, ekpekuru m Nna m nke eluigwe ekpere ma gwa ya na achọrọ m ijere ya ozi mgbe nile.
Otú ọ dị, mgbe 1922 gasịrị, nchegbu ndị ọzọ nke ndụ chọrọ ịkwaga mkpebi ahụ n’ọnọdụ nke abụọ. Anyị si n’otu ebe kwaga n’ọzọ, n’esoghịkwa ọgbakọ ndị Jehova kpakọrịta. Nna m anọghị n’ụlọ n’ihi ọrụ ọ na-arụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè. Ọmụmụ Bible anyị echighị anya. Agụrụ m akwụkwọ n’echiche nke ịghọ ọkà ná mkpọsa ngwá ahịa, na-emekwa atụmatụ ije mahadum a ma ama.
Ịgbanwe Ebe M Na-etinye Uche ná Ndụ
N’etiti afọ ndị 1930, ụwa malitekwara iche ihu n’agha zuru ụwa ọnụ. Anyị bi na Cleveland, Ohio, mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị. Anyị malitere ichesi echiche ike karị banyere ihe anyị mụtaworo n’oge anyị bụ ụmụaka. Nwanne m nwoke nke tọrọ m, bụ́ Russell, ji ya kpọrọ ihe karịsịa, e bukwa ụzọ mee ya baptism. Mụ onwe m dịtụ iche, ejichaghị m ya kpọrọ ihe, ma na February 3, 1936, e mekwara m baptism. Nghọta m nwere banyere ihe mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova gụnyere na-amụba, ana m amụtakwa ịnabata nduzi Jehova. N’otu afọ ahụ, e mekwara ụmụnne m ndị inyom abụọ, bụ́ Kathryn na Gertrude, baptism. Anyị nile weere ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ.
Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na anyị echetụghị echiche banyere ihe ọ bụla ọzọ. Emeghepụrụ m ntị m mgbe nwunye nwanne m nwoke gwara m banyere otu ọmarịcha nwa agbọghọ aha ya bụ Ann bụ́ onye “na-anụ nnọọ ọkụ n’obi” kemgbe ọ nụrụ banyere eziokwu ahụ, bụ́ onye gajekwa ịbịa nzukọ ndị a na-enwe n’ụlọ anyị. N’oge ahụ, Ann na-arụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ n’otu ọfịs ndị ọkaikpe, e mekwara ya baptism n’ime otu afọ. Emebughị m atụmatụ ịlụ nwanyị, ma o doro anya na Ann nabatara eziokwu ahụ kpam kpam. Ọ chọrọ ikere òkè zuru ezu n’ozi Jehova. Ọ bụtụghị onye ga-asị, “Àpụrụ m ime ya?” Kama nke ahụ, ọ ga-ajụ, sị, “Olee ụzọ kasị mma m ga-esi mee ya?” Ọ na-ekpebisikwa ike imecha ya. Inwe nchekwube dị otú ahụ masịrị m. E wezụga nke ahụ, ọ bụ asampete, ọ ka bụkwa. Ọ ghọrọ nwunye m, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ ghọrọ onye mụ na ya na-asụkọ ụzọ.
Ọzụzụ Bara Uru Dị Ka Ndị Ọsụ Ụzọ
Dị ka ndị ọsụ ụzọ anyị mụtara isi ihe na-eduga n’inwe afọ ojuju ma mgbe anyị na-enwechaghị ihe ma mgbe anyị nwere ihe n’ụba. (Ndị Filipaị 4:11-13) Anyasị eruwela n’otu ụbọchị, ma anyị enweghị ihe oriri ọ bụla. Anyị nwere nanị cent ise. Anyị bara na nke onye na-ere anụ, m wee jụọ, sị, “Ị̀ pụrụ inye anyị anụ cent ise?” O lere anyị anya ma betazie ọkpụrụkpụ anọ. O doro m anya na ọ karịrị anụ cent ise, anụ ahụ dozikwara anyị ahụ.
Ọ bụghị ihe ọhụrụ izute mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ka anyị na-eje ozi anyị. N’otu obodo dị nso na Syracuse, New York, anyị nọ n’okporo ámá na-ekesa mpempe akwụkwọ, nyarakwa kaadị mkpọsa iji dọta uche ndị mmadụ gaa n’otu nzukọ ihu ọha pụrụ iche. Dimkpa abụọ nwụdere m ma nyụọ m ịkpakwụ. Otu bụ onye uwe ojii, ma o yighị yunifọm ya, ọ ṅaghịkwa ntị n’arịrịọ m rịọrọ ka m hụ baajị ya. Kpọmkwem mgbe ahụ, Grant Suiter nke si Betel dị na Brooklyn gafetara ma kwuo na anyị ga-aga n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii iji dozie okwu. Mgbe ahụ ọ kpọrọ ọfịs Society dị na Brooklyn na fon, a gwakwara anyị abụọ ka anyị jiri kaadị mkpọsa na mpempe akwụkwọ pụọ ọzọ n’otu ụbọchị ahụ iji nweta ihe a ga-agbakwasị ụkwụ na ya kpee ikpe mbụ. Dị ka a tụrụ anya, e jidere anyị. Otú ọ dị, mgbe anyị gwara ndị uwe ojii na a gaje ịgba ha akwụkwọ n’ụlọikpe maka ijide anyị n’ụzọ na-ezighị ezi, ha hapụrụ anyị ka anyị laa.
N’echi ya, ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-akpa aghara, n’ịbụ ndị otu ụkọchukwu kpaliri, wakporo ebe anyị na-enwe mgbakọ, o nweghịkwa ebe a hụrụ ndị uwe ojii. Ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike ji mkpara baseball kụọ n’ala ụlọ ahụ e ji osisi rụọ, kwada ụfọdụ ndị na-ege ntị site n’oche ha, ma rịgoro n’ikpo okwu, bụ́ ebe ha nọ welie ọkọlọtọ ndị America elu ma tie mkpu, sị, “Gbuchapụrụnụ ya! Gbuchapụrụnụ ya!” Mgbe ahụ ha malitere ịbụ abụ bụ́ “Beer Barrel Polka.” Ha wetara nzukọ ahụ ná njedebe kpam kpam. Anyị ji anya anyị na-ahụ ihe Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “N’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama Mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.”—Jọn 15:19.
Okwu ihu ọha ahụ bụ n’ezie mkpọghachi e ji ígwè okwu kpọghachi okwu J. F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Society n’oge ahụ. Mụ na Ann nọrọ n’obodo ahụ ruo ụbọchị ole na ole ma kpọtụrụ ndị mmadụ iji nye ha ohere ịnụ okwu ahụ n’ebe obibi ha. Mmadụ ole na ole nabatara ya.
Iwepụta Onwe Anyị Maka Ozi Ala Ọzọ
Ka oge na-aga, ohere ndị ọhụrụ nke ije ozi meghere. A kpọrọ nwanne m nwoke, bụ́ Russell, na nwunye ya, bụ́ Dorothy, òkù dị ka di na nwunye ije klas mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead na 1943, mesịakwa ziga ha Cuba dị ka ndị ozi ala ọzọ. Nwanne m nwanyị bụ́ Kathryn gara klas nke anọ. E kenyekwara ya ọrụ na Cuba. E mesịrị kenyegharịa ya ọrụ na Dominican Republic, e mesịakwa na Puerto Rico. Gịnị banyere mụ na Ann?
Mgbe anyị nụrụ banyere Ụlọ Akwụkwọ Gilead na eziokwu bụ́ na Society chọrọ iziga ndị ozi n’ala ndị ọzọ, anyị chere na ọ ga-amasị anyị iwepụta onwe anyị maka ozi ala ọzọ. Na mbụ, anyị tụlere ịgawa n’onwe anyị, ikekwe gawa Mexico. Ma mgbe ahụ, anyị kpebiri na ma eleghị anya ọ ga-aka mma ichere ka Society kenye anyị ọrụ mgbe anyị gasịrị Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Anyị ghọtara na nke a bụ ndokwa Jehova ji na-eme ihe.
A kpọrọ anyị òkù ịga klas nke anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ma n’oge na-adịghị anya tupu klas ahụ amalite, N. H. Knorr, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, matakwuru nnọọ banyere erughị eru ndị Ann nwere n’ihi ọrịa polio ọ rịara n’oge ọ bụ nwata. O so m kwurịta ya ma kpebie na ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya iziga anyị ije ozi ná mba ọzọ.
Ihe dị ka afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe m na-arụ ọrụ nkwadebe maka mgbakọ, Nwanna Knorr hụrụ m ọzọ ma jụọ ma anyị ka nwere mmasị ịga Gilead. Ọ gwara m na anyị agajeghị ije ozi ala ọzọ; o nwere ihe ọzọ o bu n’uche. Ya mere mgbe klas nke itoolu debanyere aha na February 26, 1947, e denyere aha anyị n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ.
Ụbọchị ndị ahụ anyị nọrọ na Gilead bụ ndị a na-agaghị echefu echefu. Ihe ọmụmụ ndị ahụ mara abụba n’ụzọ ime mmụọ. Anyị nwetara enyi ndị ga-adịgide ruo ogologo ndụ anyị nile. Ma òkè m keere n’ụlọ akwụkwọ ahụ karịrị nnọọ nke ahụ.
N’Agbata Washington na Gilead
Ụlọ Akwụkwọ Gilead ka dị nnọọ ọhụrụ. Gọọmenti United States amachaghị nzube nke ụlọ akwụkwọ ahụ, ya mere a nọ na-ajụ ọtụtụ ajụjụ. Society chọrọ inwe onye nnọchiteanya na Washington, D.C. Ọ bụ ebe ahụ ka e zigara anyị mgbe ọnwa ole na ole anyị gụsịrị akwụkwọ na Gilead gasịrị. Aga m na-enye aka n’inweta visa maka ndị a kpọrọ òkù ịbịa Gilead site n’ala ọzọ nakwa n’inweta akwụkwọ iwu ka e wee nwee ike iziga ndị gụsịrị akwụkwọ n’ofesi maka ọrụ ozi ala ọzọ. Ụfọdụ ndị ọrụ obodo nwere obi ọma ma na-enye aka. Ndị ọzọ nwere echiche siri ike megide Ndịàmà. Ole na ole bụ́ ndị nwere echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị siri ike kwuru na ọ dị ihe jikọrọ anyị na òtù ndị ha lere anya dị ka nke na-adịghị mma.
Otu nwoke nke m gara n’ọfịs ya katọrọ anyị n’ụzọ siri ike n’ihi na anyị adịghị ekele ọkọlọtọ ma ọ bụ aga agha. Mgbe ọ basịrị mba banyere nke ahụ ruo oge ụfọdụ, emesịrị m kwuo, sị: “Achọrọ m ka ị mara, ị makwa, na Ndịàmà Jehova adịghị eso onye ọ bụla alụ agha n’ụwa. Anyị adịghị ekere òkè n’ihe omume nke ụwa. Anyị adịghị ekere òkè n’agha ha, ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha. Anyị na-anọpụ iche kpam kpam. Anyị emeriworị nsogbu ndị unu na-enwe; anyị nwere ịdị n’otu ná nzukọ anyị. . . . Ugbu a, gịnị ka unu chọrọ ka anyị mee? Ùnu chọrọ ka anyị laghachi n’ụzọ unu si eme ihe ma hapụ nke anyị?” O kwughị ihe ọ bụla mgbe m kwuchara nke ahụ.
E wepụtara ụbọchị abụọ zuru ezu n’izu maka ọrụ m ga na-arụ n’ọfịs dị iche iche nke ndị ọchịchị. Tụkwasị na nke ahụ, anyị nọ na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’oge ahụ, nke a gụnyere itinye awa 175 n’ozi ubi kwa ọnwa (mgbe e mesịrị, a gbanwere ya gaa n’awa 140), n’ihi ya anyị na-anọkarị n’ozi ruo anyasị. Ọ tọrọ anyị ụtọ. Anyị duziiri ezinụlọ dị iche iche ọmụmụ ihe ndị dị mma, ha nwekwara ọganihu dị mma. Mụ na Ann ekpebiwo na anyị agaghị amụ ụmụ, ma n’ụzọ ime mmụọ, anyị nwere ọ bụghị nanị ụmụ kamakwa ụmụ ụmụ na ụmụ ụmụ ụmụ. Lee oké ọṅụ ha bụụrụ obi anyị!
Ná ngwụsị 1948, e nwetara m ọrụ ọzọ. Nwanna Knorr kọwara na Nwanna Schroeder, bụ́ onye na-edebanye aha nakwa otu n’ime ndị nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, gaje iji ọrụ ndị ọzọ dị mkpa n’aka, ya mere a rịọrọ m ka m na-akụziri klas Gilead ihe mgbe ọ dị mkpa. N’ịbụ onye chị obi n’aka, mụ na Ann bịaghachiri Gilead, dị na South Lansing, New York, na December 18. Na mbụ, anyị na-anọ na Gilead ruo nanị izu ole na ole n’otu mgbe, e mesịa, anyị ga-alaghachi Washington. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, anọwara m oge dị ukwuu na Gilead karịa ka m na-anọ na Washington.
Ọ bụ n’oge a, dị ka m bu ụzọ kwuo, ka klas nke 21 nke Gilead gụsịrị akwụkwọ n’Ámá Egwuregwu Yankee dị na New York. Ya mere dị ka otu n’ime ndị nkụzi ha, enwere m ihe ùgwù nke ikere òkè n’usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ.
Ije Ozi n’Isi Ụlọ Ọrụ Ụwa Nile
Na February 12, 1955, anyị malitere ọrụ ije ozi ọzọ. Anyị ghọrọ ndị òtù nke ezinụlọ Betel dị n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke nzukọ Jehova a na-ahụ anya. Ma gịnị ka ọ ga-agụnye? N’ụzọ bụ́ isi, ịdị njikere ịrụ ọrụ ọ bụla e kenyere anyị, ikere òkè n’ọrụ ndị chọrọ iso ndị ọzọ na-emekọ ihe. N’ezie, anyị emewo nke ahụ na mbụ, ma ugbu a anyị ga-abụ akụkụ nke ìgwè ka ukwuu—ezinụlọ Betel dị n’isi ụlọ ọrụ. Anyị ji obi ụtọ nara ọrụ ọhụrụ a dị ka ihe àmà nke nduzi Jehova.
Akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke ọrụ m gụnyere okwu ndị metụtara ụlọ ọrụ mgbasa ozi. N’ihi ọchịchọ maka akụkọ ndị na-adọrọ mmasị nakwa n’ihi inweta ihe ọmụma site n’ebe e nwere ajọ mbunobi, ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi edewo ihe ụfọdụ na-adịghị mma banyere Ndịàmà Jehova. Anyị gbalịrị ime ka ọnọdụ ahụ ka mma.
Nwanna Knorr chọrọ ijide n’aka na anyị nile nwere ọrụ dị ukwuu ịrụ, n’ihi ya anyị nwekwara ọrụ ndị ọzọ. Ụfọdụ n’ime ọrụ ndị a chọrọ nkà ndị m nweworo dị ka ọkà ná mkpọsa ngwá ahịa. Ndị ọzọ metụtara ụlọ ọrụ redio Society, bụ́ WBBR. E nwere ọrụ ndị a ga-arụ n’ihe metụtara sinima ndị Society mepụtara. Akụkọ ọchịchị Chineke bụ, n’ezie, akụkụ nke ihe ọmụmụ Gilead, ma ugbu a a malitere ihe omume dị iche iche iji mee ka ọtụtụ ndị Jehova nweta nkọwa zuru ezu nke akụkọ ahụ banyere nhazi ọchịchị Chineke nke oge a, na ime ka ọha na eze nweta nke a. Akụkụ ọzọ nke ọzụzụ Gilead gụnyere ikwu okwu n’ihu ọha, ọ dịkwa mkpa ịrụ ọrụ iji mekwuo ka ihe ndị bụ́ isi banyere ikwu okwu n’ihu ọha ruo ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị iche iche aka. N’ihi ya, e nwere ọtụtụ ihe ime.
Ịnọ na Gilead Mgbe Nile
Na 1961, mgbe a chọrọ ịmalite ọzụzụ nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ọrụ alaka ụlọ ọrụ, e bugara Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Brooklyn, bụ́ ebe Watch Tower Society nwere ụlọ ọrụ ya ndị bụ́ isi. Ọzọkwa, alaghachiri m na klas—n’oge a, ọ bụghị dị ka onye na-arụchitere onye nkụzi ọrụ kama dị ka onye so n’òtù ndị nkụzi. Lee ihe ùgwù ọ bụ! Ekwenyesiri m ike na Ụlọ Akwụkwọ Gilead bụ onyinye sitere n’aka Jehova, onyinye nke bawooro nzukọ ya dum a na-ahụ anya uru.
Na Brooklyn, klas Gilead nwere ohere ndị ụmụ akwụkwọ nọ na klas ndị bu ụzọ na-enweghị. E nwekwuru ndị nkụzi na-esi esi abịa, a na-esokwa Òtù Na-achị Isi na ezinụlọ Betel dị n’isi ụlọ ọrụ akpakọrịta n’ụzọ chiri anya. O kwekwara ụmụ akwụkwọ omume inweta ọzụzụ n’usoro ọrụ si aga n’ọfịs, n’ụzọ ebe obibi Betel si arụ ọrụ, nakwa n’akụkụ dị iche iche nke ọrụ ebe obibi akwụkwọ.
Eri ọtụtụ afọ, ọnụ ọgụgụ nke ụmụ akwụkwọ na-adịgasị iche, otú ahụkwa ka ọnụ ọgụgụ ndị nkụzi na-adị. E bugharịkwara ụlọ akwụkwọ ahụ ọtụtụ ugboro. Ọ dịzi ugbu a na gburugburu ebe mara mma dị na Patterson, New York.
Iso Ụmụ Akwụkwọ Na-arụkọ Ọrụ
Ọ bụworo m nnọọ ihe ọṅụ ịkụziri klas ndị a ihe! Ndị a bụ ndị na-eto eto bụ́ ndị na-enweghị mmasị ime ihe n’usoro ihe ochie a. Ha na-ahapụ ezinụlọ ha, ndị enyi ha, ebe obibi ha, na ndị na-asụ asụsụ ha. Ihu igwe, nri—ihe nile gaje ịdị iche. Ha amaghịdị mba ha gaje ịga, ma ihe mgbaru ọsọ ha bụ ịbụ ndị ozi ala ọzọ. Ọ dịghị gị mkpa ịkwali mmadụ ndị dị otú ahụ.
Mgbe m banyere na klas, ọ na-abụkarị nzube m ime ka ahụ ruo ụmụ akwụkwọ ahụ ala. Ọ dịghị onye na-amụta ihe nke ọma mgbe ahụ na-erughị ya ala na mgbe ọ na-enwe nchegbu. N’eziokwu, abụ m onye nkụzi, ma amaara m ihe ọ dị ka ya ịbụ nwa akwụkwọ. Anọtụla m n’oche ndị ahụ. N’ezie, ha na-amụsi ihe ike, na-amụtakwa ihe dị ukwuu na Gilead, ma achọkwara m ka ha nụrụ ụtọ ya.
Amaara m na mgbe ha ga-aga n’ebe e kenyere ha ọrụ, a ga-enwe ihe ụfọdụ ga-adị ha mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma. Okwukwe siri ike dị ha mkpa. Ịdị umeala n’obi dị ha mkpa—n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Ọ dị ha mkpa ịmụta isoro ndị ọzọ na-emekọ ihe, ịnakwere ọnọdụ ọ bụla, ịgbaghara mmehie n’ụzọ dị mfe. Ọ dị ha mkpa ịnọgide na-azụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ọ dịkwa ha mkpa ịhụ ndị mmadụ n’anya nakwa ịhụ ọrụ e zigara ha ịrụ n’anya. Ihe ndị ahụ ka m nọgidere na-emesi ike n’ihu ụmụ akwụkwọ ahụ n’oge ha nọ na Gilead.
N’ezie amaghị m ụmụ akwụkwọ ole m kụziwooro ihe. Ma amaara m mmetụta m na-enwe banyere ha. Mgbe mụ na ha nọsịrị ọnwa ise na klas, ana m enwe nnọọ mmasị n’ebe ha nọ. Mgbe m hụziri ha ka ha na-aga n’ikpo okwu ma nara diplọma ha n’ụbọchị ngụsị akwụkwọ, ana m ama na ha enwechawo ihe ọmụmụ ha n’ụzọ gara nke ọma nakwa na ha ga-apụ n’oge na-adịghị anya. Ọ dị ka akụkụ ụfọdụ nke ezinụlọ m ịhapụ m. Olee ihe ga-eme ka ị ghara ịhụ ndị dị njikere iwepụta onwe ha ma na-arụ ọrụ ndị a na-eto eto ga na-arụ, n’anya?
Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, mgbe ha bịaghachiri maka nleta, ana m anụ ka ha na-ekwu banyere ọṅụ ndị ha na-enwe n’ozi, amakwa m na ha ka na-arụ ọrụ e kenyere ha, na-arụ ọrụ a zụrụ ha ịrụ. Olee mmetụta nke ahụ na-eme ka m nwee? Ịgwa gị eziokwu, ọ bụ mmetụta dị mma.
Ilepụ Anya n’Ọdịnihu
Anya m na-ahụzi inyoghi inyoghi ugbu a, ana m enwekwa nkụda mmụọ nke a na-eweta. Enweghịzi m ike ịkụzi ihe na klas Gilead. Na mbụ, nke ahụ bụ mgbanwe siri ike omume, ma ná ndụ m nile amụtawo m ịnakwere ọnọdụ dị iche iche na ịnagide ha. Ana m echekarị echiche banyere Pọl onyeozi na “ogwu n’anụ ahụ” ya. Pọl kpere ekpere ugboro atọ ka e mee ka o nwere onwe ya pụọ ná nsogbu ahụ, ma Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Amara m ezuworo gị: n’ihi na emewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:7-10) Pọl nọgidere na-anagide ya. Ọ bụrụ na ọ pụrụ ime ya, ekwesịrị m ịgbalị ime ya. Ọ bụ ezie na adịghịzi m akụzi ihe na klas, enwere m ekele na m ka pụrụ ịhụ ụmụ akwụkwọ ka ha na-abata ma na-apụ kwa ụbọchị. Mgbe ụfọdụ enwere m ike iso ha kwurịta okwu, ọ na-enyekwa m obi aṅụrị iche echiche banyere ezi mmụọ ha na-egosipụta.
Ihe na-abịanụ n’ọdịnihu dị ebube icheta n’uche. A na-atọ ntọala ugbu a. Gilead ekerewo òkè pụtara ìhè na ya. Mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị, mgbe e meghere akwụkwọ mpịakọta ahụ e zoro aka na ya ná Mkpughe 20:12, a ga-enwekwu otu puku afọ nke izi ihe kpụ ọkụ n’ọnụ n’ụzọ Jehova. (Aịsaịa 11:9) Ma ọbụna nke ahụ abụghị ngwụsị ya. N’ezie, ọ bụ nanị mmalite. Ruo mgbe nile ebighị ebi, a ga-enwekwu ihe ndị a ga-amụta banyere Jehova na ihe ndị a ga-emekwu ka anyị na-ahụ ka nzube ya na-emezu. Enwere m obi ike zuru ezu na Jehova ga-emezu nkwa nile dị ebube o kwere, achọkwara m ịnọ n’ebe ahụ iji kere òkè n’ịnabata nduzi nile nke Jehova ga-enye anyị mgbe ahụ.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ngụsị akwụkwọ Gilead e mere n’Ámá Egwuregwu Yankee nke New York na 1953
[Foto dị na peeji nke 26]
Gertrude, mụ, Kathryn, na Russell
[Foto dị na peeji nke 26]
Iso N. H. Knorr (n’isi isi aka ekpe) na M. G. Henschel na-arụkọ ọrụ n’ịhazi mgbakọ
[Foto dị na peeji nke 26]
Mgbe m nọ n’ụlọ ọrụ redio WBBR
[Foto dị na peeji nke 29]
Mgbe m nọ na klas Gilead
[Foto dị na peeji nke 31]
Mụ na Ann, n’oge na-adịbeghị anya