Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/15 p. 19-24
  • Jehova Na-edozi Ụzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-edozi Ụzọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Tara Akpụ
  • Ọnọdụ Okpukpe
  • Uru Ndị Iwu Bara
  • Oge Udo na nke Ikwe Ibe Nọrọ
  • Òkè Nkà na Ụzụ Na-ekere
  • Ịkwadebe Mba Niile Maka “Ozizi Jehova”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Jehova Na-eduzi Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa n’Ụwa Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • “Àmà Nye Mba Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/15 p. 19-24

Jehova Na-edozi Ụzọ

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe.”—MATIU 24:14.

1. Gịnị ka ọrụ nkwusa ahụ rụzuworo ma na narị afọ mbụ ma na narị afọ nke 20?

EBE ọ bụ na Jehova bụ Chineke nke ịhụnanya, ọ bụ uche ya ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Nke a achọwo ka a rụọ ọrụ nkwusa na izi ihe zuru ụwa ọnụ. Na narị afọ mbụ, nkwusa a mere ka ọgbakọ ndị Kraịst bụrụ “ide na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) Mgbe e mesịrị, e nwere ogologo oge nke ndapụ n’ezi ofufe bụ́ mgbe ìhè nke eziokwu ahụ nyụlatara. N’oge ndị na-adịbeghị anya, na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” “ihe ọmụma” abawokwa ụba ọzọ, na-ewetara ọtụtụ nde mmadụ olileanya nke nzọpụta ebighị ebi nke dabeere na Bible.—Daniel 12:4.

2. Gịnị ka Jehova meworo n’ihe banyere ọrụ nkwusa ahụ?

2 N’agbanyeghị mgbalị Setan na-eme n’esepụghị aka iji gbochie nzube Chineke, ọrụ nkwusa ahụ enwewo ihe ịga nke ọma na-eju anya ma na narị afọ mbụ ma na narị afọ nke 20. Ọ na-eme ka e cheta amụma Aịsaịa. Aịsaịa dere banyere nlọghachi nke ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ga-alọghachi na Juda na narị afọ nke isii T.O.A., sị: “A ga-eme ndagwurugwu ọ bụla ka ọ dị elu, a ga-emekwa ka ugwu ọ bụla na ugwu nta ọ bụla dị ala: ebe dị mkputamkpu ga-aghọkwa ebe guzoziri eguzozi, nkume nile dị elu ga-aghọkwa ebe dị larịị.” (Aịsaịa 40:4) Jehova edoziwokwa ụzọ ma mee ka ọ dị larịị maka ọrụ ime nkwusa dị ukwuu ma na narị afọ mbụ ma na narị afọ nke 20.

3. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova nwere ike isi mezuo nzube ya?

3 Nke a apụtaghị na Jehova chịkwara ihe ọ bụla mere n’ụwa kpọmkwem iji mee ka nkwusa nke ozi ọma ahụ gaa n’ihu; ọ pụtaghịkwa na Jehova ji ikike o nwere ibu ụzọ ahụ ihe ndị ga-emenụ mee ihe iji marazuo ihe nile ga-emenụ. N’eziokwu, o nwere ikike nke ibu ụzọ ahụ nakwa ịkpụzi ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (Aịsaịa 46:9-11) Ma o nwekwara ikike nke imeghachi omume banyere ihe omume dị iche iche ka ha na-apụta ìhè. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ bụ́ onye maara ma otú ọ ga-esi duzie ma otú ọ ga-esi chebe ìgwè atụrụ ya, Jehova na-eduzi ndị ya. Ọ na-eduga ha ná nzọpụta, na-echebe ọnọdụ ime mmụọ ha, na-akwalikwa ha iji ọnọdụ na ihe omume ndị na-akwalite inwe ihe ịga nke ọma n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile mee ihe bara uru.—Abụ Ọma 23:1-4.

Ọrụ Tara Akpụ

4, 5. N’ihi gịnị ka ikwusa ozi ọma ahụ jiworo bụrụ ọrụ na-ama aka?

4 Dị ka ọ dị n’owuwu ụgbọ ahụ n’oge Noa, ọrụ nkwusa Alaeze ahụ abụwo ọrụ buru ibu—ma na narị afọ mbụ ma n’oge a. Iji ozi ọ bụla jekwuru ndị mmadụ bụ ọrụ tara nnọọ akpụ, ma ọrụ nke a na-ama aka karịsịa. Na narị afọ mbụ, ndị na-eso ụzọ dị nnọọ ole na ole. E gbuwo Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs, dị ka onye a sịrị na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru. Okpukpe ndị Juu gbagidesiri mkpọrọgwụ ike. Ụlọ nsọ dị ebube dị na Jerusalem. Okpukpe ndị na-abụghị nke ndị Juu bụ́ ndị dị n’ógbè Mediterranean gbagidesikwara mkpọrọgwụ ike, na-enwe ụlọ nsọ na òtù ndị nchụàjà. N’otu aka ahụ, ka “mgbe ọgwụgwụ” malitere na 1914, ndị Kraịst e tere mmadụ dị ole na ole, ndị na-ekpe okpukpe ndị ọzọ bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-ejere Chineke ozi dịkwa ọtụtụ.—Daniel 12:9.

5 Jisọs adọwo ụmụazụ ya aka ná ntị na a ga-akpagbu ha. O kwuru, sị: “Ha ga-arara unu nye ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu: mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) Tụkwasị ná nsogbu ndị dị otú ahụ, ndị Kraịst ga-achọta onwe ha n’ime “oge dị oké egwu,” karịsịa na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Otú ọrụ ahụ hà, ojiji e ji n’aka na a ga-enwe mkpagbu, na ihe isi ike nke oge ndị a emewo ka ọrụ nkwusa ahụ bụrụ nke na-ama aka na nke tara akpụ. A chọrọ okwukwe dị ukwuu.

6. Mmesi obi ike dị aṅaa banyere inwe ihe ịga nke ọma ka Jehova nyere ndị ya?

6 Ọ bụ ezie na Jehova maara na a ga-enwe ihe isi ike, ọ makwaara na ọ dịghị ihe ga-akwụsị ọrụ ahụ. E buru amụma banyere ihe ịga nke ọma a ga-enwe n’otu amụma a maara nke ọma nke nwere mmezu dị ịrịba ama ma na narị afọ mbụ ma na narị afọ nke 20: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Matiu 24:14, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

7. Ruo ókè hà aṅaa ka ọrụ nkwusa ahụ saruru mbara na narị afọ mbụ?

7 N’ịbụ ndị jupụtara n’okwukwe na mmụọ nsọ, ndị ohu Chineke na narị afọ mbụ gara n’ihu ịrụ ọrụ ha. Ebe ọ bụ na Jehova nọnyeere ha, ha nwere ihe ịga nke ọma karịrị nnọọ ihe ha pụrụ ịtụwo anya ya. Ka ọ na-erule n’oge Pọl degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ, ihe dị ka afọ 27 mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, ọ pụrụ ikwu banyere ozi ọma ahụ na “e kwusara [ya] n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) Ná ntụnyere, ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ nke 20, a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ala 233.

8. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ọtụtụ ndị nabataworo ozi ọma ahụ? Nye ihe atụ.

8 Ọtụtụ nde mmadụ anabatawo ozi ọma ahụ n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya. Ọtụtụ emewo otú ahụ n’okpuru ọnọdụ ndị dị njọ—n’oge agha, mmachibido iwu, na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa na narị afọ mbụ. N’otu oge e ji obi ọjọọ pịa Pọl na Saịlas ụtarị ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Lee ka nke a si bụrụ ọnọdụ na-eyighị ka a ga-eji ya mee ndị na-eso ụzọ! Ma, Jehova ji ọnọdụ ahụ mee nnọọ nke ahụ. A tọhapụrụ Pọl na Saịlas, onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ na ezinụlọ ya ghọkwara ndị kwere ekwe. (Ọrụ 16:19-33) Ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-egosi na ndị na-emegide ozi ọma ahụ apụghị ime ka ọ kwụsị. (Aịsaịa 54:17) Ma, akụkọ ihe mere eme nke Iso Ụzọ Kraịst abụbeghị nke ahụhụ na mkpagbu jupụtara mgbe nile. Ka anyị lekwasịzie anya n’ihe omume ụfọdụ ndị dị mma bụ́ ndị nyeworo aka ime ka ụzọ dị larịị maka ikwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ gara nke ọma ma na narị afọ mbụ ma na narị afọ nke 20.

Ọnọdụ Okpukpe

9, 10. Olee otú Jehova si mee ka e nwee atụmanya maka nkwusa nke ozi ọma ahụ na narị afọ mbụ nakwa na narị afọ nke 20?

9 Tụlee oge e yiri maka ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ. Banyere ihe ndị weere ọnọdụ na narị afọ mbụ, amụma nke izu 70 nke afọ, nke a na-achọta na Daniel 9:24-27, kapịrị ọnụ afọ Mesaịa ahụ ga-apụta—29 O.A. Ọ bụ ezie na ndị Juu nke narị afọ mbụ aghọtaghị oge ihe ndị ahụ ga-eme, ha nọ na-atụ anya, na-echere Mesaịa ahụ. (Luk 3:15) Akwụkwọ French bụ́ Manuel Biblique na-ekwu, sị: “Ndị mmadụ maara na izu iri asaa nke afọ nke Daniel kara aka nọ na-abịaru ọgwụgwụ ya; ọ dịghị onye o juru anya ịnụ ka Jọn Baptist mara ọkwa na alaeze Chineke adịwo nso.”

10 Gịnị banyere ihe ndị weere ọnọdụ n’oge a? Otu ihe omume dị ukwuu bụ ochichi e chiri Jisọs eze n’eluigwe, bụ́ nke kara akara mmalite nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze. Amụma Bible na-egosi na nke a weere ọnọdụ na 1914. (Daniel 4:13-17) Atụmanya maka ihe omume a mekwara ka ụfọdụ ndị na-ekpe okpukpe n’oge a nọrọ ná nchere. Atụmanya pụtakwara ìhè n’etiti Ndị Mmụta Bible nwere obi eziokwu bụ́ ndị malitere ibipụta magazin a na 1879 dị ka Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence (Ụlọ Nche Zaịọn na Ikwupụta Ọnụnọ Kraịst). Ya mere, ma na narị afọ mbụ ma n’oge a, atụmanya okpukpe doziri ọnọdụ maka nkwusa nke ozi ọma ahụ.a

11. Ntọala okpukpe ndị dị aṅaa ka a tọrọ iji nye aka ná nkwusa nke ozi ọma ahụ?

11 Ihe ọzọ nke nyere aka n’ọrụ ndị Kraịst ma na narị afọ mbụ ma n’oge a bụ na ọtụtụ mmadụ maara Akwụkwọ Nsọ. Na narị afọ mbụ, ógbè ndị Juu dịsasịrị n’akụkụ nile nke mba ndị Jentaịl gbara ha gburugburu. Ógbè ndị ahụ nwere ụlọ nzukọ ebe ndị mmadụ na-ezukọ mgbe mgbe iji nụrụ ka a na-agụ ma na-atụle Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, ndị Kraịst oge mbụ wukwasịrị ihe n’elu ihe ọmụma okpukpe nke ndị mmadụ nwewororịị. (Ọrụ 8:28-36; 17:1, 2) Ná mmalite nke oge anyị a, ndị Jehova nwere ọnọdụ yiri nke ahụ n’ọtụtụ ala. Bible dị adị n’ụzọ sara mbara n’ógbè nile nke Krisendọm, karịsịa n’ala ndị Protestant. A gụrụ ya n’ọtụtụ chọọchị; ọtụtụ nde mmadụ nwere ya. Bible adịlarị n’aka ndị mmadụ, ma enyemaka dị ha mkpa iji ghọta ihe ha nwere.

Uru Ndị Iwu Bara

12. Olee otú iwu Rom si bụrụ ihe nchebe mgbe mgbe na narị afọ mbụ?

12 Iwu ndị ọchịchị abaworo nkwusa ndị Kraịst uru mgbe mgbe. Alaeze Ukwu Rom nọ na-achị ụwa nke narị afọ mbụ, iwu ya ndị e dere ede nwekwara mmetụta miri emi ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Iwu ndị a nyere nchebe, ndị Kraịst oge mbụ ritekwara uru na ha. Dị ka ihe atụ, ọchịchọ Pọl chọrọ nkwado iwu ndị Rom dugara ná ntọhapụ a tọhapụrụ ya n’ụlọ mkpọrọ ma mee ka a ghara ịpịa ya ihe. (Ọrụ 16:37-39; 22:25, 29) Nhota e hotara ihe usoro iwu Rom kwuru nyere aka ime ka obi dajụọ ìgwè mmadụ iwe ji n’Efesọs. (Ọrụ 19:35-41) N’otu oge, a napụtara Pọl n’ịbụ onye e mesoro ihe ike na Jerusalem n’ihi na ọ bụ nwa amaala Rom. (Ọrụ 23:27) E mesịa, iwu Rom nyere ya ohere iji ụzọ iwu gọpụrụ okwukwe ya n’ihu Siza. (Ọrụ 25:11) Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ndị bụ́ Siza chịrị ọchịchị aka ike, iwu ndị dị na narị afọ mbụ nyere ohere mgbe mgbe maka ‘ịgọpụrụ ozi ọma na ime ka o guzosie ike n’ụzọ iwu.’—Ndị Filipaị 1:7.

13. Olee otú iwu siworo baara ọrụ nkwusa ahụ uru mgbe mgbe n’oge anyị?

13 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọtụtụ ala taa. Ọ bụ ezie na e nwewo ndị ga-eji “ụkpụrụ kpụzie mmegbu,” iwu e dere ede n’ọtụtụ mba na-ele nnwere onwe okpukpe anya dị ka ihe bụ́ isi ruuru mmadụ. (Abụ Ọma 94:20) N’ịghọta na Ndịàmà Jehova abụghị ihe iyi egwu nye ịdị n’usoro nke ọha na eze, ọtụtụ gọọmenti enyewo anyị nkwado iwu. Na United States, bụ́ ebe e biworo ihe dị ukwuu n’ime akwụkwọ Ndịàmà, iwu ndị dị ebe ahụ emewo ka o kwe mee ịnọgide na-ebipụta magazin Ụlọ Nche ruo afọ 120 ma bụrụ nke a ga-agụ gburugburu ụwa.

Oge Udo na nke Ikwe Ibe Nọrọ

14, 15. Olee otú ịdị jụụ a kpara ókè nke ọha na eze si baara ọrụ nkwusa ahụ uru na narị afọ mbụ?

14 Oge ndị e nwetụrụ udo abaworo ọrụ nkwusa ahụ uru. Ọ bụ ezie na Jisọs buru amụma n’ụzọ ziri ezi na n’oge a “mba ga-ebili imegide mba ọzọ,” e nwere oge ndị e nwere ịdị jụụ nke mere ka ime nkwusa Alaeze kpụ ọkụ n’ọnụ kwe omume. (Matiu 24:7) Ndị Kraịst narị afọ mbụ biri n’oge Pax Romana, ma ọ bụ Udo nke Rom. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme dere, sị: “Rom chịkwara ndị ógbè Mediterranean kpam kpam nke na ọ kwụsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ agha a lụworo ọtụtụ afọ n’esepụghị aka.” Ịdị jụụ a megheere ndị Kraịst oge mbụ ụzọ ime njem n’enwekarịghị ihe ize ndụ n’ógbè ndị Rom nile.

15 Alaeze Ukwu Rom gbalịrị ime ka ndị mmadụ dị n’otu n’okpuru ọchịchị ya dị ike. Ụkpụrụ a kwalitere ọ bụghị nanị ime njem, ikwe ibe nọrọ, na inyerịta echiche kamakwa ọ kwalitere echiche nke ime ka ndị nile nọ n’ụwa bụrụ ụmụnne. Akwụkwọ bụ́ On the Road to Civilization na-ekwu, sị: “Ịdị n’otu nke Alaeze Ukwu [Rom] mere ka ubi [maka ime nkwusa ndị Kraịst] bụrụ nke dị mma. E tidawo ihe mgbochi nke mba dị iche iche. Nwa amaala Rom bụ nwa amaala nke ụwa. . . . Ọzọkwa, a pụrụ ịghọta okpukpe nke kụziri mmadụ nile ịbụ ụmụnne n’obodo nke zuliteworo echiche nke ịbụ nwa amaala nke ụwa nile.”—Tụlee Ọrụ 10:34, 35; 1 Pita 2:17.

16, 17. Gịnị kwaliworo mgbalị ndị e mere iji nwee udo n’oge a, nkwubi okwu dịkwa aṅaa ka ọtụtụ ndị ruworo?

16 Gịnị banyere oge anyị? Narị afọ nke 20 ahụwo agha ndị kasị mebie ihe n’akụkọ ihe mere eme, agha ógbè ka na-akpọtụkwa n’ala ụfọdụ. (Mkpughe 6:4) Ma, e nwewokwa oge ndị e nwetụrụ udo. Ike ụwa ndị bụ́ isi alụrịtabeghị ọgụ n’ibu agha ruo ihe karịrị afọ 50. Ọnọdụ a enyewo aka n’ụzọ dị ukwuu ná nkwusa nke ozi ọma ahụ n’ala ndị ahụ.

17 Ụjọ nke agha nke narị afọ nke 20 edugawo ụfọdụ ndị ịghọta mkpa ọ dị inwe ọchịchị ụwa. Egwu nke agha ụwa dugara n’iguzobe Njikọ Mba Nile na Mba Ndị Dị n’Otu. (Mkpughe 13:14) Nzube a kpọsara akpọsa nke òtù abụọ ahụ abụwo ịkwalite mmekọrịta na udo nke mba nile. Mmadụ ndị chere na e nwere mkpa dị otú ahụ na-anabatakarị ozi ọma banyere ọchịchị ụwa nke ga-eweta ezi udo na-adịgide adịgide—Alaeze Chineke.

18. Omume dị aṅaa e nwere banyere okpukpe dịworo mma nye ọrụ nkwusa ahụ?

18 Ọ bụ ezie na a kpagbuwo ndị Kraịst n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ mgbe ụfọdụ, ọ dịwo oge ndị e nwere ọnọdụ nke okpukpe ikwe ibe nọrọ ma na narị afọ mbụ ma na narị afọ nke 20. (Jọn 15:20; Ọrụ 9:31) Ndị Rom nabatara ma kwekọọ n’ụzọ nke chi dị iche iche nke ndị ha meriri. Prọfesọ Rodney Stark dere, sị: “N’ọtụtụ ụzọ, Rom nyere ohere ka ukwuu nke nnwere onwe ikpe okpukpe karịa nke ọ bụla ọzọ e nwere ruo mgbe Mgbanwe Ọchịchị America gasịrị.” N’oge a, ndị mmadụ nọ n’ọtụtụ ala enwekwuola echiche sara mbara, ihe ọ rụpụtara bụ na ha enweela ọchịchọ ige ntị n’ozi Bible nke Ndịàmà Jehova na-eweta.

Òkè Nkà na Ụzụ Na-ekere

19. Olee otú ndị Kraịst oge mbụ si jiri codex mee ihe?

19 N’ikpeazụ, tụlee otú Jehova siworo mee ka ndị ya nwee ike irite uru site n’ọganihu nke nkà na ụzụ. Ọ bụ ezie na ndị Kraịst oge mbụ ebighị n’oge e nwere ọganihu dị ngwa nke nkà na ụzụ, otu ihe ha ji mee ihe bụ codex, ma ọ bụ akwụkwọ a na-asape asape. Codex nọchiri akwụkwọ mpịakọta na-anyị arọ. Akwụkwọ bụ́ The Birth of the Codex kwuru, sị: “N’ụzọ dị iche n’usoro nwayọọ nwayọọ na ntakịrị ntakịrị nke codex ji nọchie akwụkwọ mpịakọta n’akwụkwọ ọgụgụ ụwa, nnakwere ndị Kraịst nakweere codex yiri ka o weere ọnọdụ ngwa ngwa ma zuo ebe nile.” Akwụkwọ a kwukwara, sị: “Ndị Kraịst ji codex mee ihe n’ụzọ sara mbara na narị afọ nke abụọ nke na mwebata ya aghaghị ịmaliteworị tupu A.D. 100.” Ọ ka mfe iji codex mee ihe karịa akwụkwọ mpịakọta. A pụrụ ịchọta akụkụ akwụkwọ nsọ n’ụzọ dị ngwa karị. N’ezie nke a nyeere ndị Kraịst oge mbụ aka bụ́ ndị, dị ka Pọl, na-abụghị nanị na ha kọwara Akwụkwọ Nsọ kamakwa ha ‘ji ntụaka na-anwapụta’ ihe ndị ha na-akụzi.—Ọrụ 17:2, 3, NW.

20. Olee otú ndị Chineke siworo jiri nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ mee ihe n’ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ, n’ihi gịnịkwa?

20 Ọganihu nkà na ụzụ ndị e nwere na narị afọ anyị abụwo ndị dị ịtụnanya. Ígwè obibi akwụkwọ ndị na-agba oké ọsọ enyewo aka ime ka o kwe omume ibipụta akwụkwọ e ji amụ Bible n’ọtụtụ asụsụ n’otu mgbe. Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ enyewo aka ime ka nsụgharị Bible dị ngwa karị. Gwongworo, ụgbọ okporo ígwè, ụgbọ mmiri, na ụgbọelu na-eme ka o kwe omume ibuga akwụkwọ e ji amụ Bible n’akụkụ ụwa nile n’ụzọ dị ngwa. Telifon na ígwè ozi fax emewo ka nzirịta ozi n’otu ntabi anya bụrụ ihe kwere omume. Site ná mmụọ ya, Jehova akwaliwo ndị ohu ya iji nkà na ụzụ dị otú ahụ mee ihe bara uru iji kwalite mgbasa nke ozi ọma ahụ gburugburu ụwa. Ha adịghị eji ngwá ndị dị otú ahụ e mepụtara eme ihe n’ihi ọchịchọ nke ịmata na iji ihe ọ bụla kasị gbaa ọhụrụ n’ụwa a mee ihe. Kama nke ahụ, mmasị ha bụ́ isi dị n’ihe ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ nkwusa ha n’ụzọ kasị dị irè.

21. Ànyị pụrụ inwe obi ike banyere gịnị?

21 “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi,” ka Jisọs buru n’amụma. (Matiu 24:14) Dị nnọọ ka ndị Kraịst oge mbụ hụrụ mmezu nke amụma ahụ, anyị na-ahụ ya taa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ ukwuu. N’agbanyeghị ịdị ukwuu na ịta akpụ nke ọrụ ahụ, n’oge ndị dị mma na ndị na-adịghị mma, n’etiti iwu na omume ndị na-agbanwe agbanwe, n’oge agha nakwa n’oge udo, nakwa n’etiti ụdị ọganihu dị iche iche nke nkà na ụzụ, e kwusawo, a ka na-ekwusakwa ozi ọma ahụ. Nke a ọ́ dịghị eme ka i jupụta n’egwu banyere amamihe Jehova na ikike o nwere ibu ụzọ ahụ ihe ga-eme n’ọdịnihu? Anyị pụrụ ijide nnọọ n’aka na a ga-arụzu ọrụ nkwusa ahụ dị ka oge Jehova yiri si dị nakwa na a ga-emezu nzube ịhụnanya ya iji wetara ndị ezi omume ngọzi. Ha ga-enweta ala ma biri n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29; Habakuk 2:3) Ọ bụrụ na anyị emee ka ndụ anyị kwekọọ ná nzube Jehova, anyị ga-eso n’ime ha.—1 Timoti 4:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo nkọwa zuru ezu banyere amụma abụọ a banyere Mesaịa ahụ, lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, peji nke 36, 97, na 98-107, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Isi Ihe Maka Ntụleghachi

◻ N’ihi gịnị ka nkwusa nke ozi ọma ahụ jiworo bụrụ ọrụ na-ama aka?

◻ N’ụzọ ndị dịgasị aṅaa ka ndokwa ndị ọchịchị na ịdị jụụ a kpara ókè nke ọha mmadụ siworo baara ọrụ ndị Kraịst uru?

◻ Ngọzi Jehova n’ọrụ nkwusa ahụ na-emesi anyị obi ike banyere ihe ndị dị aṅaa ga-eme n’ọdịnihu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya