Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/15 p. 4-7
  • N’ezie Ọ Dị Onye Na-eche Banyere Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ezie Ọ Dị Onye Na-eche Banyere Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ịda Ogbenye na Mmegbu Ji Dịrị?
  • Nsogbu Mmadụ Na-apụghị Idozili
  • “Ka E Mee Ihe Ị Na-achọ . . . n’Ụwa”
  • Njedebe nke Ịda Ogbenye Dị Nso
    Teta!—1998
  • Ọ̀ Dị Onye Pụrụ n’Ezie Ịgbanwe Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Nkasi Obi Maka Ndị A Na-emegbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/15 p. 4-7

N’ezie Ọ Dị Onye Na-eche Banyere Anyị

ỌTỤTỤ puku mmadụ na-egosipụta na ha na-eche banyere ndị ọzọ n’ezie. Ha adịghị enwe echiche obi ịta mmiri na nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ́ na nsogbu nke ndị ọzọ agbasaghị ha. Kama nke ahụ, ha na-eme ihe nile ha pụrụ ime—ọbụna na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ mgbe ụfọdụ—iji belata nhụjuanya. Nke a bụ ọrụ buru ibu, nke ikike ndị karịrị nke ha na-eme ka o sie ike.

Ihe ndị dị ka anyaukwu, aghụghọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agha, na ọdachi ndị na-emere onwe ha pụrụ imebi ọbụna “mgbalị ndị a kasị jiri nghọta na mkpebisi ike mee iji kpochapụ agụụ,” ka otu onye ọrụ enyemaka na-ekwu. Ịkwụsị agụụ bụ nanị otu n’ime ọtụtụ nsogbu nke ndị na-eche banyere ndị ọzọ na-eche ihu. Ha na-alụsokwa ihe ndị dị ka ọrịa, ịda ogbenye, ikpe na-ezighị ezi, na oké nhụjuanya nke agha na-akpata, ọgụ. Ma hà na-emerinụ?

Onyeisi nke otu ụlọ ọrụ enyemaka kwuru na ndị na-eme ‘mgbalị ndị dị otú ahụ e ji nghọta na mkpebisi ike eme’ iji kpochapụ agụụ na ihe mgbu yiri onye Sameria ahụ nwere ọmịiko nke a kọwara n’ilu Jisọs Kraịst. (Luk 10:29-37) Ma n’agbanyeghị ihe ha na-eme, ka ọ na-ekwu, ọnụ ọgụgụ ndị ọ na-emetụta na-anọgide nnọọ na-amụba. Ya mere ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka ezi onye Sameria ahụ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o si n’otu ụzọ ahụ na-agafe kwa ụbọchị ruo ọtụtụ afọ ma na-ahụ onye ọzọ ndị ohi wakporo kwa izu n’akụkụ ụzọ ahụ?”

Ọ ga-adị mfe ịdaba n’ihe a kọwaworo dị ka ‘ọrịa na-egbu egbu nke ike ọgwụgwụ onye nlekọta’ ma kwụsịzie n’obi nkoropụ. N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ndị na-eche banyere ndị ọzọ n’ezie adịghị ada mbà. (Ndị Galetia 6:9, 10) Dị ka ihe atụ, otu nwoke nke degaara Jewish Telegraph nke Britain akwụkwọ jara Ndịàmà Jehova mma, bụ́ ndị “nyeere ọtụtụ puku ndị Juu aka ịlanarị nhụsianya nke Auschwitz” n’oge Nazi Germany. “Mgbe nri kọrọ,” ka onye edemede ahụ kwuru, “ha sooro ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị [bụ́ ndị Juu] kerịta bred ha!” Ndịàmà ahụ nọgidere jiri ihe ndị ha nwere na-eme ihe ruo otú ha nwere ike.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị otú e kerịtaruru bred ka ọ kwụsị nhụjuanya nke mmadụ kpam kpam. Nke a abụtụghị ileda ihe ndị nwere ọmịiko meworo anya. Omume ọ bụla nke na-ebelata nhụjuanya n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụ ihe bara uru. Ndịàmà ahụ mere ka ihe mgbu nke ndị mkpọrọ ibe ha kwụsịtụ, e mesịkwara bibie ọchịchị ndị Nazi. Otú ọ dị, usoro ihe ụwa nke na-akpata mmegbu dị otú ahụ ka nọgidere, ndị na-adịghị eche banyere ndị ọzọ ka jupụtakwara ebe nile. N’ezie, “ọgbọ dị, mma agha ka ezé nile ha bụ, ọ bụkwa mma ka ikiri ezé ha bụ, irichapụ ndị e wedara n’ala n’ụwa, na irichapụ ndị ogbenye n’etiti mmadụ.” (Ilu 30:14) Ma eleghị anya, ị na-eche ihe mere o ji dị otú a.

Gịnị Mere Ịda Ogbenye na Mmegbu Ji Dịrị?

Jisọs Kraịst kwuru n’otu mgbe, sị: “Unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile, mgbe ọ bụla unu chọrọ unu pụrụ imekwa ha ihe ọma.” (Mak 14:7) Jisọs ọ̀ na-ekwu na ịda ogbenye na mmegbu agaghị akwụsị ma ọlị? Dị ka ụfọdụ ndị, ò kweere na nhụjuanya dị otú ahụ bụ akụkụ nke ndokwa Chineke mere iji nye ndị nwere ọmịiko ohere igosipụta otú ha na-echeru banyere ndị ọzọ? Ee e! Jisọs ekweghị na nke ahụ. Nanị ihe ọ nọ na-ekwu bụ na ịda ogbenye ga-abụ akụkụ nke ndụ ruo ogologo oge usoro ihe a ga-adịru. Ma Jisọs makwaara nke a: Nzube mbụ nke Nna ya nke eluigwe abụghị inwe ọnọdụ ndị dị otú ahụ n’ụwa.

Jehova Chineke kere ụwa ịbụ paradaịs, ọ bụghị ebe ịda ogbenye, ikpe na-ezighị ezi, na mmegbu jupụtara. O gosipụtara ókè ọ na-echeru banyere ezinụlọ mmadụ site n’ime ndokwa ndị dị ebube bụ́ ndị ga-eme ka ndụ dị ụtọ karị. Leenụ, tụlee kpọmkwem aha ubi ahụ nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, chọtara onwe ha na ya! A kpọrọ ya Iden, nke pụtara “Ihe Ụtọ.” (Jenesis 2:8, 9) Jehova akpaghịrị ụmụ mmadụ ókè inwe nanị ihe ndị dị mkpa maka ịdịgide ndụ na gburugburu ebe na-adịghị akpali mmasị, nke mmegbu jupụtara. Mgbe ọrụ okike ya gwụrụ, Jehova nyochara ihe o mere ma kwupụta na ọ “dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:31.

Oleezi ihe mere ịda ogbenye, mmegbu, na ihe ndị ọzọ na-akpata nhụjuanya ji jupụta n’ụwa nile taa? Ihe mere ajọ usoro ihe dị ugbu a ji dịrị bụ n’ihi na nne na nna anyị mbụ họọrọ inupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:1-5) Nke a welitere ajụjụ ma ò ziri ezi ka Chineke chọọ ka ihe ndị o kere eke rubere ya isi. Ya mere, Jehova enyewo ụmụ Adam nnwere onwe ruo oge a kpaara ókè. Ihe mere ezinụlọ mmadụ ka gbasara Chineke. O mere ndokwa maka idozigharị ihe ọjọọ nile nke inupụrụ ya isi ga-eweta. N’oge na-adịghịkwa anya, Jehova ga-eme ka ịda ogbenye na mmegbu—n’ezie, nhụjuanya nile—kwụsị.—Ndị Efesọs 1:8-10.

Nsogbu Mmadụ Na-apụghị Idozili

Eri ọtụtụ narị afọ kemgbe e kere mmadụ, ihe a kpọrọ mmadụ anọwo na-ahapụwanye ụkpụrụ Jehova. (Deuterọnọmi 32:4, 5) Ná nnọgide ha nọgidere na-ajụ iwu na ụkpụrụ Chineke, ụmụ mmadụ alụsowo ibe ha ọgụ, “mmadụ [enwewokwa] ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ndị na-achọ ime ihe n’ụzọ nke ha kama ido onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Chineke, emebiela mgbalị nile e mere iji mee ka e nwee usoro ọha mmadụ na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi n’ezie, nke ihe nile na-eti ọha mmadụ na-ahụju anya ihe otiti na-adịghị na ya.

E nwere nsogbu ọzọ—nke ọtụtụ ndị pụrụ iwere dị ka nkwenkwe ụgha na-enweghị isi. Onye ahụ kpalitere nnupụisi megide Chineke ka na-akpali ụmụ mmadụ ime ihe ọjọọ na ịchọ ọdịmma onwe ha nanị. Ọ bụ Setan Ekwensu, Jisọs Kraịst kpọkwara ya “onyeisi ụwa nke a.” (Jọn 12:31; 14:30; 2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19) Ná mkpughe ahụ e nyere Jọn onyeozi, a kọwara Setan dị ka onye bụ́ isi na-akpata ahụhụ—onye bụ́ isi “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9-12.

N’agbanyeghị ókè ụfọdụ ndị na-echeru banyere mmadụ ibe ha, ha agaghị enwe ike iwepụ Setan bụ́ Ekwensu ma ọlị ma ọ bụ ịgbanwe usoro ihe a nke na-eme ka a na-enwe ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-ahụju anya. Gịnịzi ka a chọrọ iji dozie nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ? Ihe ngwọta ya abụghị nanị inwe onye na-eche banyere anyị. E nwere mkpa maka onye nwere ọchịchọ na ike iwepụ Setan na usoro ihe ya dum nke na-ezighị ezi.

“Ka E Mee Ihe Ị Na-achọ . . . n’Ụwa”

Chineke na-ekwe nkwa ibibi ajọ usoro ihe a. O nwere ma ọchịchọ ma ike a chọrọ iji mee otú ahụ. (Abụ Ọma 147:5, 6; Aịsaịa 40:25-31) N’akwụkwọ amụma Bible bụ́ Daniel, e buru amụma, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Jisọs Kraịst bu ọchịchị eluigwe a na-adịgide adịgide nke ga-eme ihe ọma n’uche mgbe ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ịrịọ Chineke n’ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.

Jehova ga-aza ekpere dị otú ahụ n’ihi na ọ na-eche banyere ezinụlọ mmadụ n’ezie. Dị ka okwu amụma nke Abụ Ọma nke 72 si kwuo, Chineke ga-enye Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ikike iwetara ndị ogbenye, ndị e wedara n’ala, na ndị a na-emegbu emegbu bụ́ ndị na-akwado ịchịisi Jisọs, ahụ efe na-adịgide adịgide. N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ bụrụ, sị: “Ọ [Eze Mesaịa nke Chineke] ga-ekpe ndị e wedara n’ala n’etiti ndị Gị ikpe, ọ ga-enye ụmụ nke ogbenye nzọpụta, zọpịakwa onye mmegbu. . . . Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:4, 12-14.

N’otu ọhụụ metụtara oge anyị, Jọn onyeozi hụrụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” bụ́ usoro ihe dị nnọọ ọhụrụ nke Chineke guzobere. Lee ngọzi nke ahụ bụụrụ ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụju anya! N’ibu amụma ihe Jehova ga-eme, Jọn dere, sị: “M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:1-5.

Ee, anyị pụrụ ikwere okwu ndị a, n’ihi na ha kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Jehova ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya iji wepụ ịda ogbenye, agụụ, mmegbu, ọrịa, na ikpe na-ezighị ezi nile n’ụwa. Dị ka magazin a meworo ka ọ pụta ìhè mgbe mgbe site n’Akwụkwọ Nsọ, ọtụtụ ihe àmà na-egosi na anyị na-ebi n’oge mgbe a ga-emezu nkwa ndị a. Ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa dị nso! (2 Pita 3:13) N’oge na-adịghị anya, Jehova ‘ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi,’ ọ “ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:8.

Ruo mgbe nke ahụ ga-eme, anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ na ọbụna ugbu a e nwere ndị na-eche banyere ndị ọzọ n’ezie. Ihe ka enye ọṅụ bụ na Jehova Chineke n’onwe ya na-eche banyere anyị n’ezie. Ọ ga-eme ka mmegbu na nhụjuanya nile kwụsị n’oge na-adịghị anya.

Ị pụrụ inwe ntụkwasị obi zuru ezu ná nkwa Jehova. N’ezie, ohu ya bụ́ Joshua nwere. O ji obi ike zuru ezu gwa ndị Chineke nke oge ochie, sị: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.” (Joshua 23:14) Ya mere, ka usoro ihe dị ugbu a nọgidere na-adị, ekwela ka ọnwụnwa ndị ị pụrụ iche ihu merie gị. Tụkwasị Jehova nchegbu gị nile, n’ihi na ọ na-eche banyere anyị n’ezie.—1 Pita 5:7.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

N’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa, ịda ogbenye, mmegbu, ọrịa, na ikpe na-ezighị ezi agaghị adị n’ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya