Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/15 p. 21-26
  • Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Anyị Taa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Anyị Taa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jehova Na-achọ
  • Ịdị Mkpa nke Ịhụnanya
  • Otú Anyị Si Anwapụta Ịhụnanya Anyị
  • Ihe Mere Ọ Pụrụ Iji Yie Ka O Siri Ike
  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Iwu Ịhụnanya nke Dị n’Obi Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Otú Iwu nke Kraịst Si Gosi na Jehova Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ì So ná Ndị Chineke Hụrụ n’Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/15 p. 21-26

Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Anyị Taa?

“Olu si n’igwe ojii ahụ pụta, [sịrị], Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu Ya.”—MATIU 17:5.

1. Olee mgbe Iwu ahụ mezuru nzube ya?

JEHOVA nyere mba Israel Iwu ahụ, ya na ọtụtụ akụkụ ya. Pọl onyeozi dere banyere ha, sị: “Ha bụ . . . ihe dị iche iche nke anụ ahụ a gụrụ n’ihe ziri ezi, e nyere n’iwu ruo oge imezi ihe.” (Ndị Hibru 9:10) Mgbe Iwu ahụ dugara ihe fọdụrụ n’ụmụ Israel ịnabata Jisọs dị ka Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst ahụ, o mezuru nzube ya. N’ihi ya, Pọl kwupụtara, sị: “Kraịst bụ nsọtụ iwu.”—Ndị Rom 10:4; Ndị Galetia 3:19-25; 4:4, 5.

2. Ole ndị nọ n’okpuru Iwu ahụ, oleekwa mgbe e mere ka ha nwere onwe ha n’ebe ọ dị?

2 Nke a ọ̀ pụtara na Iwu ahụ adịghị achịkwa anyị taa? N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ adịghị mgbe ọ bụla ha nọ n’okpuru Iwu ahụ, dị ka ọbụ abụ ahụ kọwara: “[Jehova] na-egosi Jekọb okwu Ya, na-egosikwa Israel ụkpụrụ Ya nile na ikpe Ya nile. O mesoghị mba ọ bụla otú a: ma ikpe Ya nile, ha amaghị ha.” (Abụ Ọma 147:19, 20) Mgbe Chineke guzobere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ná ndabere nke àjà Jisọs, ọbụna iwu ejighịzi mba Israel irubere Iwu ahụ isi. (Ndị Galetia 3:13; Ndị Efesọs 2:15; Ndị Kọlọsi 2:13, 14, 16) Ọ bụrụ na Iwu ahụ adịghịzi irè, gịnị ka Jehova na-achọ n’aka ndị nwere ọchịchọ ijere ya ozi taa?

Ihe Jehova Na-achọ

3, 4. (a) Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị taa n’ụzọ bụ́ isi? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iso ijeụkwụ nile Jisọs?

3 N’afọ ikpeazụ nke ozi Jisọs, ndị ozi ya bụ́ Pita, Jemes, na Jọn so ya gaa n’otu ugwu dị elu, ikekwe n’otu akụkụ nke elu Ugwu Heamọn. N’ebe ahụ, ha hụrụ ọhụụ amụma banyere Jisọs ka ọ nọ n’oké ebube ma nụ olu Chineke ka ọ na-ekwupụta, sị: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu Ya.” (Matiu 17:1-5) N’ụzọ bụ́ isi, nke ahụ bụ ihe Jehova na-achọ n’aka anyị—ige Ọkpara ya ntị ma gbasoo ihe nlereanya na ozizi ya. (Matiu 16:24) N’ihi ya, Pita onyeozi dere, sị: “Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilere anya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.”—1 Pita 2:21.

4 N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji soo ijeụkwụ nile Jisọs? N’ihi na site n’iṅomi ya, anyị na-eṅomi Jehova Chineke. Jisọs maara Nna ya nke ọma, ebe ọ bụ na ya na ya anọwo ijeri kwuru ijeri afọ n’eluigwe tupu ọ bịa n’ụwa. (Ilu 8:22-31; Jọn 8:23; 17:5; Ndị Kọlọsi 1:15-17) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs ji iguzosi ike n’ihe nọchite anya Nna ya. Ọ kọwara, sị: “Dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” N’eziokwu, Jisọs ṅomiri nnọọ Jehova kpọmkwem nke na ọ pụrụ ikwu sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.”—Jọn 8:28; 14:9.

5. Iwu dị aṅaa ka ndị Kraịst nọ n’okpuru ya, oleekwa mgbe iwu ahụ malitere ọrụ?

5 Gịnị ka ige Jisọs ntị na iṅomi ya gụnyere? Ọ̀ pụtara ịnọ n’okpuru otu iwu? Pọl dere, sị: “Ọ bụghị na mụ onwe m nọ n’okpuru iwu.” Ọ nọ na-ezo aka ‘n’ọgbụgba ndụ ochie’ ahụ, bụ́ ọgbụgba ndụ Iwu ahụ e so Israel gbaa. Pọl kwetara na ya nọ “n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ.” (1 Ndị Kọrint 9:20, 21; 2 Ndị Kọrint 3:14) Ná njedebe nke ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ, “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” malitere ọrụ bụ́ nke nwere “iwu Kraịst” nke iwu ji ndị ohu Jehova nile taa irubere isi.—Luk 22:20; Ndị Galetia 6:2; Ndị Hibru 8:7-13.

6. Olee otú a pụrụ isi kọwaa “iwu Kraịst,” oleekwa otú anyị si erubere ya isi?

6 Jehova emeghị ka e detuo “iwu Kraịst” edetu n’usoro, na-ahazi ya gaa ná nkebi dị iche iche, dị ka e mere n’ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ. Iwu ọhụrụ a e nyere ụmụazụ Kraịst adịghị agụnye ndepụta sara mbara nke mee nke a emela nke a. Otú ọ dị, n’Okwu ya, Jehova chekwara ihe ndekọ sara mbara nke ndụ na ozizi nke Ọkpara ya. Ọzọkwa, Chineke nyere ụfọdụ ụmụazụ Jisọs nke oge mbụ ike mmụọ nsọ idetu ntụziaka dị iche iche banyere akparamàgwà onwe onye, ihe omume ọgbakọ, àgwà a na-akpa n’ime ezinụlọ, na ihe ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrint 6:18; 14:26-35; Ndị Efesọs 5:21-33; Ndị Hibru 10:24, 25) Mgbe anyị mere ka ndụ anyị kwekọọ n’ihe nlereanya na ozizi Jisọs Kraịst, ṅaakwa ntị na ndụmọdụ nke ndị e nyere ike mmụọ nsọ so dee Bible na narị afọ mbụ, anyị na-erubere “iwu Kraịst” isi. Jehova na-achọ nke a n’aka ndị na-ejere ya ozi taa.

Ịdị Mkpa nke Ịhụnanya

7. Olee otú Jisọs si mesie nzube nke iwu ya ike n’oge Ememe Ngabiga o so ndị ozi ya mee?

7 Ọ bụ ezie na ịhụnanya dị mkpa n’okpuru Iwu ahụ, ọ bụ nnọọ ihe bụ́ isi, ma ọ bụ akụkụ kasị mkpa, nke iwu Kraịst. Jisọs mesiri eziokwu a ike mgbe ya na ndị ozi ya zukọtara ime ememe Ngabiga nke 33 O.A. Dị ka Jọn onyeozi si chịkọta ihe mere n’abalị ahụ, okwu ndị si n’obi Jisọs kwuru gụnyere ozuzo aka 28 ndị o zoro n’ịhụnanya. Nke a mere ka isi ihe, ma ọ bụ nzube, nke iwu ya pụta ìhè nye ndị ozi ya. N’ụzọ dị ịrịba ama, Jọn malitere ihe ndekọ ya banyere ihe ndị mere n’anyasị ahụ dị mkpa site n’ikwu, sị: “Mgbe ememe ngabiga aka-erughị, ebe Jisọs matara na oge awa Ya abịawo ka O si n’ụwa nke a lakwuru Nna Ya, ebe Ọ hụrụ ndị nke aka Ya nọ n’ụwa n’anya, Ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ ihe.”—Jọn 13:1.

8. (a) Gịnị gosiri na e nwere arụmụka na-aga n’ihu n’etiti ndị ozi? (b) Olee otú Jisọs si kụziere ndị ozi ya ihe n’ịdị umeala n’obi?

8 Jisọs hụrụ ndị ozi ya n’anya, ọ bụ ezie na ọ gbalịwo n’enweghị ihe ịga nke ọma pụtara ìhè inyere ha aka imeri ọchịchọ gabigara ókè ha nwere maka ikike na ọkwá. Ọnwa ole na ole tupu ha abịarute Jerusalem, ‘ha arụrịtawo ụka onye ka ibe ya n’etiti ha.’ Kpọmkwem tupu ha abatakwa n’obodo ahụ maka Ememe Ngabiga ahụ, ha malitekwara ịrụrịta ụka ọzọ maka ọkwá. (Mak 9:33-37; 10:35-45) Ihe mere n’oge na-adịghị anya mgbe ndị ozi ahụ banyesịrị n’ụlọ elu ahụ iji kere òkè n’ihe gaje ịbụ Ememe Ngabiga ikpeazụ ha ga-emekọ ọnụ, gosiri na nke a bụ nsogbu na-aga n’ihu. N’oge ahụ, ọ dịghị onye ji ohere ahụ mee ihe ije ozi omenala ile ọbịa nke ịsa ụkwụ ndị ọzọ. Iji kụziere ha otu ihe mmụta n’ịdị umeala n’obi, Jisọs n’onwe ya sara ụkwụ ha.—Jọn 13:2-15; 1 Timoti 5:9, 10.

9. Olee otú Jisọs si mee ihe banyere ọnọdụ ahụ dapụtaranụ mgbe Ememe Ngabiga ikpeazụ ahụ gasịrị?

9 N’agbanyeghị ihe mmụta ahụ, mgbe e mesịrị Ememe Ngabiga ahụ, Jisọs eguzobesịakwa Ememe Ncheta nke ọnwụ ya na-abịaru nso, rịba ama ihe wekwaara ọnọdụ ọzọ. Ihe ndekọ nke Oziọma Luk na-ekwu, sị: “Esemokwu wee daakwa n’etiti ha, onye n’ime ha ka a na-agụ na ọ ka ibe ya ukwuu.” Kama iweso ndị ozi ya iwe na ịgwakasị ha ahụ, Jisọs ji obiọma nye ha ndụmọdụ banyere mkpa ọ dị ha ịdị iche n’ebe ndị ọchịchị ụwa bụ́ ndị ọ na-agụ agụụ ịnọ n’ọkwá nọ. (Luk 22:24-27) O nyeziri ha ihe a pụrụ ịkpọ ntọala nke iwu Kraịst, na-asị: “Iwu ọhụrụ ka M na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya.”—Jọn 13:34.

10. Iwu dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, gịnịkwa ka ọ gụnyere?

10 Mgbe e mesịrị n’anyasị ahụ, Jisọs gosiri otú ịhụnanya yiri nke Kraịst kwesịrị ịsaru mbara. O kwuru, sị: “Nke a bụ ihe M nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka M hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịrị nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:12, 13) Jisọs ọ̀ na-ekwu na ụmụazụ ya kwesịrị ịdị njikere ịnwụchitere ndị kwere ekwe ibe ha ọnwụ ma ọ bụrụ na ọnọdụ achọọ nke a? Nke ahụ bụ nghọta Jọn nwere, bụ́ onye ji anya ya hụ ihe merenụ n’oge a, n’ihi na o mesịrị dee, sị: “N’ime nke a ka anyị mawooro ịhụnanya, n’ihi na Ya onwe ya [Jisọs Kraịst] tọgbọrọ ndụ Ya n’ihi anyị: anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ ndụ anyị n’ihi ụmụnna anyị.”—1 Jọn 3:16.

11. (a) Olee otú anyị si emezu iwu Kraịst? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs nyere?

11 Ya mere, mgbe ahụ, anyị adịghị emezu iwu Kraịst nanị site n’ịkụziri ndị ọzọ banyere Jisọs. Anyị aghaghịkwa ịdị ndụ ma na-akpa àgwà dị ka Jisọs. N’eziokwu, Jisọs ji okwu ndị dị mma, ndị a họọrọ nke ọma mee ihe n’okwu ndị o kwuru. Ma, o zikwara ihe site n’ihe nlereanya. Ọ bụ ezie na Jisọs abụworị mmụọ e kere eke dị ike n’eluigwe, ọ nakweere ohere nke ije ozi maka ọdịmma nke Nna ya n’elu ala nakwa igosi anyị otú anyị kwesịrị isi adị ndụ. Ọ dị umeala n’obi, obiọma, na-echebakwara ndị mmadụ echiche, na-enyere ndị e boro ibu dị arọ na ndị a na-emegbu emegbu aka. (Matiu 11:28-30; 20:28; Ndị Filipaị 2:5-8; 1 Jọn 3:8) Jisọs gbakwara ụmụazụ ya ume ịhụ ibe ha n’anya, dị nnọọ ka ọ hụrụ ha.

12. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na iwu Kraịst adịghị ebelata mkpa ọ dị ịhụ Jehova n’anya?

12 Ọnọdụ dị aṅaa ka ịhụnanya n’ebe Jehova nọ—iwu kasị ukwuu n’Iwu ahụ—nwere n’iwu Kraịst? (Matiu 22:37, 38; Ndị Galetia 6:2) Ọ̀ bụ ọnọdụ nke abụọ? Ọ dịghị ma ọlị! E jikọtasiri ịhụnanya n’ebe Jehova nọ na ịhụnanya n’ebe ndị Kraịst ibe anyị nọ ike. Mmadụ apụghị ịhụ Jehova n’anya n’ezie n’ahụghịkwa nwanna ya n’anya, n’ihi na Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị, Ana m ahụ Chineke n’anya, ma ọ na-akpọ nwanne ya asị, ọ bụ onye ụgha: n’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, ọ pụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ Onye ọ na-ahụghị mgbe ọ bụla.”—1 Jọn 4:20; tụlee 1 Jọn 3:17, 18.

13. Mmetụta dị aṅaa ka nrubeisi ndị na-eso ụzọ Jisọs rubeere iwu ọhụrụ ya nwere?

13 Mgbe Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ọhụrụ ahụ bụ́ ịhụ ibe ha n’anya dị nnọọ ka ọ hụrụ ha, ọ kọwara mmetụta nke a ga-enwe. “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m,” ka ọ sịrị, “ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Dị ka Tertullian, bụ́ onye dịrị ndụ ihe karịrị otu narị afọ mgbe Jisọs nwụsịrị, si kwuo, ịhụnanya ụmụnna nke ndị Kraịst oge mbụ nwere mmetụta ahụ kpọmkwem. Tertullian hotara ndị na-abụghị ndị Kraịst dị ka ndị na-ekwu banyere ụmụazụ Kraịst, sị: ‘Lee otú ha si hụ ibe ha n’anya na otú ha si ọbụna dị njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ.’ Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Àna m egosipụta ịhụnanya dị otú ahụ n’ebe ndị Kraịst ibe m nọ nke na ọ na-egosipụta na m bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs?’

Otú Anyị Si Anwapụta Ịhụnanya Anyị

14, 15. Gịnị pụrụ ime ka o sie ike irubere iwu Kraịst isi, ma gịnị pụrụ inyere anyị aka ime otú ahụ?

14 Ọ dị mkpa ka ndị ohu Jehova gosipụta ịhụnanya yiri nke Kraịst. Ma ọ̀ na-esiri gị ike ịhụ ndị Kraịst ibe gị bụ́ ndị na-egosipụta àgwà nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’anya? Dị ka anyị hụworo, ọbụna ndị ozi rụrịtara ụka ma nwaa ịkwalite ọdịmma nke onwe ha. (Matiu 20:20-24) Ndị Galetia serịtakwara okwu n’etiti onwe ha. Mgbe o kwusịrị na ịhụ onye agbata obi n’anya mezuru Iwu ahụ, Pọl dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ma ọ bụrụ na unu atarịta ibe unu arụ, ripịakwa ibe unu, lezienụ anya ka unu ghara ikpochapụrịta onwe unu.” Mgbe o gosichara ọdịiche dị n’etiti ọrụ nile nke anụ ahụ na mkpụrụ nke mmụọ Chineke, Pọl gbakwụnyere ndụmọdụ bụ́: “Ka anyị ghara ịghọ ndị na-achọ otuto efu, na-achọrịta ibe anyị okwu, na-akpọrịta ibe anyị asị.” Mgbe ahụ, onyeozi ahụ gbara ume, sị: “Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu, na-edebezukwanụ iwu Kraịst n’ụzọ dị otú a.”—Ndị Galetia 5:14–6:2.

15 Jehova ọ̀ na-achọ ihe dị ukwuu n’aka anyị site n’ịchọ ka anyị rubere iwu Kraịst isi? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ isi ike imeso ndị, dị ka o si dị, gwakasịworo anyị okwu ahụ ma dọkasịa anyị n’ụzọ mmetụta uche ihe n’obiọma, iwu ji anyị ‘ịbụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwa n’ịhụnanya.’ (Ndị Efesọs 5:1, 2) Ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-elekwasị anya n’ihe nlereanya Chineke, bụ́ onye “na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Site n’ibute ụzọ n’inyere ndị ọzọ aka, gụnyere ndị mesoworo anyị ihe n’ụzọ na-adịghị mma, anyị pụrụ inwe afọ ojuju nke ịmara na anyị na-eṅomi Chineke, na-erubekwara iwu Kraịst isi.

16. Olee otú anyị si anwapụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na Kraịst nọ?

16 Anyị kwesịrị icheta na anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị site n’ihe anyị na-eme, ọ bụghị nanị site n’ihe anyị na-ekwu. Ọbụna n’otu oge Jisọs hụrụ otu akụkụ nke uche Chineke dị ka nke siri ike ịnakwere n’ihi ihe nile ọ gụnyere. “Nna, ọ bụrụ na ọ dị Gị mma, nara m iko a,” ka Jisọs kpere n’ekpere. Ma ọ gbakwụnyere ngwa ngwa: “Otú ọ dị, ka e mee ihe Gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe Mụ onwe m na-achọ.” (Luk 22:42) N’agbanyeghị ahụhụ nile Jisọs tara, o mere uche Chineke. (Ndị Hibru 5:7, 8) Nrubeisi bụ ihe na-anwapụta ịhụnanya anyị, na-egosikwa na anyị maara na ọ bụ ụzọ Chineke kasị mma. “Nke a bụ ịhụnanya Chineke,” ka Bible na-ekwu, “ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3) Jisọs gwakwara ndị ozi ya, sị: “Ọ bụrụ na unu na-ahụ m n’anya, unu ga-edebe ihe nile M nyere n’iwu.”—Jọn 14:15.

17. Iwu dị aṅaa pụrụ iche ka Jisọs nyere ụmụazụ ya, oleekwa otú anyị si mara na ọ dịkwaara anyị taa?

17 E wezụga inye ụmụazụ ya iwu ịhụ ibe ha n’anya, olee iwu pụrụ iche Kraịst nyere ha? O nyere iwu ka ha rụọ ọrụ nkwusa ahụ nke o ji maka ya nye ha ọzụzụ. Pita kwuru, sị: “O [nyere] anyị iwu ka anyị kwusaara ndị Juu, ka anyị kwusiekwa ike.” (Ọrụ 10:42) Jisọs enyewo iwu kpọmkwem, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Jisọs kpughere na ntụziaka ndị dị otú ahụ ga-adịkwara ụmụazụ ya nke oge a na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” n’ihi na o kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Daniel 12:4; Matiu 24:14) N’ezie, ọ bụ uche Chineke na anyị ga-eme nkwusa. Ma, ụfọdụ ndị pụrụ iche na ọ bụ ịchọ ihe gabigara ókè n’aka anyị bụ́ Chineke ịchọ ka anyị rụọ ọrụ a. Ma ọ̀ bụ ya n’ezie?

Ihe Mere Ọ Pụrụ Iji Yie Ka O Siri Ike

18. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta mgbe anyị na-ata ahụhụ n’ihi ime ihe Jehova na-achọ?

18 Dị ka anyị hụworo, n’akụkọ ihe mere eme nile Jehova achọwo ka ndị mmadụ rube isi n’ihe dị iche iche ọ chọrọ n’aka ha. Dịkwa nnọọ ka ihe ndị ọ gwara ha mee dịgasị iche, otú ahụ ka ule ndị ha nweworo dịgasị iche. Ọkpara Chineke hụrụ n’anya gabigara ule ndị kasị sie ike, bụrụ onye e mesịrị gbuo n’ụzọ obi ọjọọ kasịnụ n’ihi ime ihe Chineke chọrọ. Ma mgbe anyị na-ata ahụhụ n’ihi ime ihe Jehova na-achọ n’aka anyị, anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị ya na-eweta ule ndị ahụ anyị na-enwe. (Jọn 15:18-20; Jemes 1:13-15) Nnupụisi Setan wetara mmehie, nhụjuanya, na ọnwụ, ọ bụkwa ya wetara ọnọdụ ndị meworo ka o sie ike mgbe mgbe ime ihe Jehova na-achọ n’aka ndị ohu ya.—Job 1:6-19; 2:1-8.

19. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù ime ihe Chineke sitere n’aka Ọkpara ya na-achọ n’aka anyị?

19 Site n’aka Ọkpara ya, Jehova enyewo ntụziaka ka ndị ohu Ya mee mkpọsa zuru ụwa ọnụ na mgbe ọgwụgwụ a, na ọ bụ nanị ọchịchị Alaeze bụ ihe ngwọta e nwere maka nhụjuanya nke mmadụ. Ọchịchị a nke Chineke ga-ewepụ nsogbu nile n’ụwa—agha, mpụ, ịda ogbenye, ịka nkà, ọrịa, ọnwụ. Alaeze ahụ ga-ewetakwa paradaịs elu ala dị ebube, bụ́ nke a ga-akpọlite ọbụna ndị nwụrụ anwụ n’ime ya. (Matiu 6:9, 10; Luk 23:43; Ọrụ 24:15; Mkpughe 21:3, 4) Lee ihe ùgwù ọ bụ ịkpọsa ozi ọma banyere ihe ndị dị otú ahụ! Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, e nweghị nsogbu ọ bụla dị n’ihe Jehova na-achọ ka anyị mee. Anyị na-ezute mmegide, ma ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na ụwa ya na-akpata nke a.

20. Olee otú anyị pụrụ isi merie ihe ịma aka ọ bụla Ekwensu na-eweta?

20 Olee otú anyị pụrụ isi jiri ụzọ na-aga nke ọma merie ihe ịma aka ọ bụla Setan na-eweta? Ọ bụ site n’iburu okwu ndị a n’uche: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Jisọs nyere Jehova ihe ọ ga-azaghachi Setan maka ịta ụta ya site n’ịhapụ ndụ eluigwe dị nchebe iji mee uche Nna ya n’ụwa. (Aịsaịa 53:12; Ndị Hibru 10:7) Dị ka mmadụ, Jisọs diri ule ọ bụla bịaara ya, ọbụna ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. Ọ bụrụ na anyị agbasoo ya dị ka Onye Nlereanya anyị, anyị onwe anyị ga-edilikwa nhụjuanya ma mee ihe Jehova na-achọ n’aka anyị.—Ndị Hibru 12:1-3.

21. Olee mmetụta i nwere banyere ịhụnanya Jehova na Ọkpara ya gosipụtara?

21 Lee ịhụnanya Chineke na Ọkpara ya gosipụtaworo n’ebe anyị nọ! N’ihi àjà Jisọs, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. Ya mere ka anyị ghara ikwe ka ihe ọ bụla kpuchie olileanya anyị. Kama nke ahụ, ka anyị buru ihe Jisọs mere ka o kwe omume n’obi, dị ka Pọl mere, bụ́ onye kwuru, sị: ‘Ọkpara Chineke, hụrụ m n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi m.’ (Ndị Galetia 2:20) Ka anyị gosikwa Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ekele si n’obi, bụ́ onye na-adịghị achọ ihe gabigara ókè n’aka anyị ma ọlị.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị taa?

◻ N’anyasị ikpeazụ o so ndị ozi ya nọkọọ, ole otú Kraịst si mesie mkpa ịhụnanya dị ike?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi nwapụta na anyị hụrụ Chineke n’anya?

◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù ime ihe Jehova na-achọ n’aka anyị?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe mmụta dị aṅaa ka Jisọs kụziri site n’ịsa ụkwụ ndị ozi ya?

[Foto dị na peeji nke 25]

N’agbanyeghị mmegide, ikwusa ozi ọma ahụ bụ ihe ùgwù na-enye obi ụtọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya