O Nyere Aka Gbasaa Ìhè “Ruo Nsọtụ Ụwa”
E JI Pọl onyeozi gbasaa ìhè ime mmụọ “ruo nsọtụ ụwa.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi [kweere na Jisọs].”—Ọrụ 13:47, 48; Aịsaịa 49:6.
Ọchịchọ siri ike nke ịgbasa ìhè ime mmụọ pụtakwara ìhè ná ndụ a raara nye na mgbalị siri ike nke onye Kraịst nke William Lloyd Barry, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Nwanna Barry nwụrụ na July 2, 1999, ka ọ na-eme ihe omume n’otu mgbakọ distrikti na Hawaii.
A mụrụ Lloyd Barry na New Zealand na December 20, 1916. Nne ya na nna ya adịlarị mbụ nwee oké mmasị n’eziokwu Bible ndị dị n’akwụkwọ ndị C. T. Russell dere, bụ́ ndị Watch Tower Bible and Tract Society kesara. N’ihi ya, Nwanna Barry tolitere n’ezinụlọ ndị Kraịst raara onwe ha nye.
Ọ bụ ezie na o nwere mmasị n’egwuregwu nakwa n’agụmakwụkwọ, ọbụna nwee akara ugo mmụta n’ihe ọmụmụ sayensị, Nwanna Barry nọgidere na-elekwasị anya nke ọma n’ihe ime mmụọ. N’ihi ya, na January 1, 1939, ọ malitere ozi oge nile, ghọọ onye òtù ezinụlọ Betel n’ụlọ ọrụ Society dị n’Australia. Mgbe ndị ọchịchị machibidosịrị Society iwu na 1941, Nwanna Barry nọgidere na-arụ ọrụ ọfịs, mgbe ụfọdụ a na-enye ya ọrụ ide ihe odide a ga-eji agba ndị kwere ekwe ibe ya ume. O gosipụtakwara ezi ihe nlereanya n’ibute ụzọ n’ozi ihu ọha.
Na February 1942, Nwanna Barry lụrụ onye na-ejekwa ozi oge nile. Nwunye ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Melba, ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi soro ya rụọ ọrụ n’afọ ndị a nile n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ha weere nzọụkwụ bụ́ isi n’ebe ije ozi n’ubi ala ọzọ dị site n’ịga klas nke 11 nke Watchtower Bible School of Gilead na United States. Ebe e kenyere ha ọrụ bụ ebe ọtụtụ ndị ga-ewere dị ka “nsọtụ ụwa”—Japan. Mgbe ha rutesịrị na November 1949, ha malitere ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ Kobe. N’oge ahụ, ọ bụ nanị mmadụ 12 na-ekwusa ozi ọma na Japan. Nwanna Barry mụtara asụsụ na ụzọ ndụ nke ebe obibi ọhụrụ ya ma wulite ịhụnanya miri emi n’ebe ndị Japan nọ, bụ́ ndị o so jee ozi ruo afọ 25 sochirinụ. Ịhụnanya o nwere n’ebe ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi” nọ pụtara ìhè nye òtù ụmụnna ndị Kraịst ahụ na-abawanye ụba na Japan, na-eme ka o nwee ike ilekọta alaka ahụ ruo iri afọ ole na ole.
E zigara Nwanna Barry na nwunye ya Brooklyn, New York n’etiti afọ 1975, bụ́ mgbe e nwere ihe dị ka Ndịàmà 30,000 na Japan. Dị ka onye Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, a kpọrọ Nwanna Barry òkù ije ozi dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. (Ndị Rom 8:16, 17) Ahụmahụ o nwere n’ide ihe bara nnọọ uru n’ọrụ ọhụrụ ya ná Ngalaba Ide Ihe. Ahụmahụ sara mbara o nwere n’alaka nakwa ná mba ndị ọzọ mekwara ka o nwee ike ịtụnye ụtụ bara uru dị ka onye so na Kọmitii Mbipụta nke Òtù Na-achị Isi.
Eri ọtụtụ afọ, Nwanna Barry jigidere ịhụnanya o nwere maka Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na ndị bi na ya. Ụmụ akwụkwọ nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead nakwa ndị òtù ezinụlọ Betel adịghị enwe obi abụọ na okwu na azịza ya ga-agụnye akụkọ ndị na-enye obi ụtọ banyere ọtụtụ ndị jeworo ozi n’ọrụ ozi ala ọzọ. E mere ka ọrụ nkwusa Alaeze ná “nsọtụ ụwa” pụta nnọọ ìhè ka Nwanna Barry ji ịnụ ọkụ n’obi kọọ ahụmahụ ndị o nwere. E hotara ụfọdụ n’ime ha n’akụkọ ọ kọrọ banyere onwe ya bụ́ nke e bipụtara n’Ụlọ Nche (Bekee) nke September 15, 1960.
Anyị nwere obi ike na dị ka ‘onye ya na Kraịst na-ekekọ,’ mmasị Nwanna Barry nwere n’ebe ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi” nọ ga-adịgide. N’ezie, agụụ ya ga-agụ nnọọ ndị nile maara ya ma hụ ya n’anya dị ka nwoke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, nke raara onwe ya kpam kpam nye Jehova ma nwee ịhụnanya miri emi n’ebe ndị Chineke nọ. Ma, anyị na-aṅụrị ọṅụ na Nwanna Barry ji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi ruo ọgwụgwụ nke ozi elu ala ya.—Mkpughe 2:10.
[Foto dị na peeji nke 16]
Lloyd Barry na John Barr mgbe e wepụtara “Insight on the Scriptures” na 1988
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị gụsịrị akwụkwọ na klas nke 11 nke Gilead, ka ha zutere na Japan mgbe afọ 40 gasịrị