Ọchịchọ Anyị Na-achọ Ndụ Ka Ogologo
“Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ. Dị ka okooko osisi ka ọ pụtaworo, e wee na-ebipụ ya: o wee na-agbalaga dị ka onyinyo, ọ dịghị eguzokwa.”—Job 14:1, 2.
ỌBỤNA taa, ọ bụ mmadụ ole na ole pụrụ ịgbagha ihe a e kwuru banyere ịdị mkpụmkpụ nke ndụ, n’agbanyeghị na e dere ya n’ihe dị ka afọ 3,500 gara aga. Ndị mmadụ ahụtawo ya mgbe nile dị ka ihe na-adịghị enye afọ ojuju bụ́ ịdị ndụ n’uju ya ruo nanị nwa oge na imesị kaa nká ma nwụọ. Ya mere, usoro ndị e ji eme ka ndụ ka ogologo amụbaala n’akụkọ ihe mere eme nile.
N’oge Job, ndị Ijipt na-ata mkpụrụ amụ anụmanụ ná mgbalị na-enweghị isi iji laghachi n’oge ntorobịa ha. Otu n’ime ebumnobi bụ́ isi nke nkà mmụta usoro ịgbatịkwu ndụ n’oge ụwa na-emepechabeghị anya bụ imepụta ọgwụ nke pụrụ iduga ná ndụ ka ogologo. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta usoro ịgbatịkwu ndụ kweere na ọlaedo e ji aka mee ga-enye ndụ anwụghị anwụ nakwa na iji efere ọlaedo rie ihe ga-agbatịkwu ndụ. Ndị Tao nke China oge ochie chere na ha pụrụ ịgbanwe ọdịdị nke ahụ site n’iji usoro ndị dị ka ntụgharị uche, mmega ahụ nke iku ume, na ihe oriri eme ihe ma si otú a nweta anwụghị anwụ.
A maara onye Spain na-eme nchọpụta bụ́ Juan Ponce de León maka ọchịchọ na-enweghị ọgwụgwụ nke ọ chọrọ ihe na-akpata ịnọgide na-abụ onye ntorobịa. Otu onye dọkịta nke narị afọ nke 18 kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Hermippus Redivivus, ka e debe ụmụntakịrị nwanyị na-amaghị nwoke n’ime obere ọnụ ụlọ n’oge opupu ihe ubi, ka e jirikwa karama wekọta ume ha kupụrụ ma jiri ha mee ihe dị ka mmiri ọgwụ e ji agbatị ndụ. Ọ baghị uru ikwu na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime usoro ndị a nwere ihe ịga nke ọma ọ bụla.
Taa, bụ́ ihe dị ka afọ 3,500 mgbe Mosis dekọsịrị okwu Job, ụmụ mmadụ agawo ije n’ọnwa, mepụta ụgbọala na kọmputa, chọpụtakwa atọm na mkpụrụ ndụ. Ma, n’agbanyeghị ọganihu ahụ nile e nwere na nkà na ụzụ, ‘ụbọchị ndụ anyị ka dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa anyị n’ahụhụ.’ Ọ bụ eziokwu na ná mba ndị mepere emepe, afọ ndụ mmadụ pụrụ iru arịwo elu nke ukwuu karịa ka ọ dị na narị afọ gara aga. Ma isi ihe kpatara nke a bụ nlekọta ahụ ike ka mma, usoro idebe ihe ọcha ndị dị irè karị, na ihe oriri ka mma. Dị ka ihe atụ, site n’etiti narị afọ nke 19 ruo ná mmalite afọ ndị 1990, nkezi afọ ndụ mmadụ na-adịru na Sweden rịrị elu site n’afọ 40 ruo afọ 75 maka ụmụ nwoke, sitekwa n’afọ 44 ruo afọ 80 maka ụmụ nwanyị. Ma nke a ọ̀ pụtara na e mejuola ọchịchọ mmadụ maka ịdị ndụ ka ogologo?
Ee e, n’ihi na ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ na-adị ndụ kaa nká ná mba ụfọdụ, okwu ndị ahụ Mosis dere ọtụtụ afọ gara aga ka dị irè: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri afọ asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri afọ asatọ] . . . , n’ihi na ọ gbapụwo ọsọ ọsọ, anyị wee felaa dị ka nnụnụ.” (Abụ Ọma 90:10) Ànyị ga-ahụ mgbanwe n’ọdịnihu dị nso? Mmadụ ọ̀ ga-enwe ike ịdị ndụ ka ogologo n’ụzọ dị ịrịba ama? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị dị otú ahụ.