Ịmụta Ụzọ Kasịnụ nke Ịhụnanya
Kosovo, Lebanọn, na Ireland. Ndị a bụ aha ndị gbaworo n’akụkọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ha na-echetara ndị mmadụ mwụfu ọbara, ịtụ bọmbụ, na igbu ọchụ. N’ezie, ọgba aghara nke ime ihe ike bụ́ ndị esemokwu okpukpe, agbụrụ, ma ọ bụ esemokwu ndị ọzọ kpataworo abụghị ihe ọhụrụ. N’ezie, ha jupụtara n’akụkọ ihe mere eme, ha ewetawokwara ihe a kpọrọ mmadụ nhụjuanya gabigara ókè.
N’ỊBỤ ndị hụrụ na e nwewo agha n’akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị eruwo ná nkwubi okwu bụ́ na agha bụ n’ezie ihe a ga-enwerịrị nakwa na ọ bụ ihe ụmụ mmadụ bu pụta ụwa bụ́ ịkpọ ibe ha asị. Otú ọ dị, echiche ndị dị otú ahụ megidere ozizi nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, kpam kpam. Akwụkwọ Nsọ kwupụtara n’ụzọ doro anya, sị: “Onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke; n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) O doro anya na Onye Okike chọrọ ka ụmụ mmadụ hụ ibe ha n’anya.
Bible na-ekpughekwa na e kere mmadụ n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26, 27) Nke a pụtara na e nyere ihe a kpọrọ mmadụ ikike igosipụta àgwà Chineke, bụ́ nke ịhụnanya kasị pụta ìhè n’ime ha. Ebe ọ dị otú a, n’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ jiworo dawaa nnọọ afọ n’igosipụta ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ n’akụkọ ihe mere eme nile? Ọzọkwa, Bible na-eme ka a ghọta ya. Ọ bụ n’ihi na mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, nupụụrụ Chineke isi ma daba ná mmehie. N’ihi ya, ụmụ ha nile ketara mmehie na ezughị okè. Ndị Rom 3:23 na-akọwa, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” Mmehie na ezughị okè anyị ketara eketa na-ebelata ikike Chineke nyere anyị ịhụ n’anya. Nke a ọ̀ pụtara na ụmụ mmadụ enweghị ike ịhụ ibe ha n’anya ọzọ? Olileanya dị aṅaa ka e nwere na ọ dị mgbe anyị ga-eso mmadụ ibe anyị na-enwe mmekọrịta ịhụnanya na udo?
Anyị Aghaghị Ịmụta Ịhụ Chineke n’Anya
Jehova Chineke maara na n’agbanyeghị ihe nile, ihe a kpọrọ mmadụ ka nwere ike igosipụta ịhụnanya. Ọ bụ ya mere o ji achọ ka ndị nile chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ gosipụta ịhụnanya ruo otú ha nwere ike. Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, mere ka ihe a a chọrọ n’aka ha doo anya n’oge a rịọrọ ya ka o kwuo nke kasịnụ n’ime ihe ndị e nyere n’iwu n’ime Iwu ahụ e nyere Israel. O kwuru, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu.” Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, sị: “Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Iwu dum, na ndị amụma Chineke, na-ekokwasị n’ihe abụọ ndị a e nyere n’iwu.”—Matiu 22:37-40.
Otú ọ dị, ọtụtụ mmadụ na-eche na o siri nnọọ ike inwe ịhụnanya n’ebe onye ha na-apụghị ịhụ anya nọ, anyị bụ́ mmadụ apụghịkwa ịhụ Jehova Chineke anya n’ihi na ọ bụ Mmụọ. (Jọn 4:24) Ma, ihe Chineke na-eme na-emetụta anyị kwa ụbọchị, ebe ọ bụ na anyị nile na-adabere n’ọtụtụ ezi ihe ndị o kere maka abamuru anyị. Pọl onyeozi gosipụtara eziokwu a mgbe ọ sịrị: “[Chineke ahapụghị] Onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe Ọ na-eme ezi ihe, na-enyekwa unu mmiri ozuzo na oge mkpụrụ site n’eluigwe, na-emeju obi unu n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.”—Ọrụ 14:17.
Ọ bụ ezie na, n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, onye ọ bụla na-erite uru site n’ihe ndị Onye Okike nyere, ọ bụ nnọọ ole na ole nwere ekele n’ebe Ọ nọ ma ọ bụ bụrụ ndị a na-akwali inye ya ekele. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịtụle ezi ihe nile ndị Chineke mewooro anyị na ịtụgharị uche n’àgwà ndị dị ebube nke na-ejupụta n’ihe nile ọ na-eme. Ime otú ahụ kwesịrị inyere anyị aka ịghọta amamihe na ike na-akpali egwu, nke Onye Okike Ukwu anyị, nwere. (Aịsaịa 45:18) Karịsịa, o kwesịrị inyere anyị aka ịhụ ụdị Chineke na-ahụ n’anya ọ bụ, ebe ọ bụ na ọ bụghị nanị na o nyere anyị ndụ kamakwa o mere ka o kwe anyị omume ịnụ ụtọ ọtụtụ ihe ndị na-eme ka ndụ dị ụtọ.
Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere imerime ọmarịcha okooko osisi ndị dịgasị iche bụ́ ndị Chineke kere n’elu ala. Lee ka o si bụrụ ihe magburu onwe ya nye anyị na o nyekwara anyị ikike nke ịhụ na ịnụ ụtọ ihe ndị a mara mma! N’otu aka ahụ, Chineke nyere ụdị nri dị iche iche na-edozi ahụ iji kwado anyị. Lee ka o si bụrụ onye na-echebara mmadụ echiche na o kenyekwara anyị ikike nke ịnụ ụtọ ihe ka anyị wee nwee ike inweta ihe ụtọ dị ukwuu site n’iri ihe! Ọ̀ bụ na ihe ndị a abụghị ihe nnwapụta pụtara ìhè na Chineke hụrụ anyị n’anya n’ezie, burukwa ọdịmma anyị kasịnụ n’uche?—Abụ Ọma 145:16, 17; Aịsaịa 42:5, 8.
E wezụga ikpughe onwe ya nye anyị site ‘n’akwụkwọ nke ihe okike,’ Onye Okike, site n’Okwu ya, bụ́ Bible, na-egosi anyị ụdị Chineke ọ bụ. Nke a bụ n’ihi na n’ime Bible ka e dekọrọ ọtụtụ n’ime ọrụ ịhụnanya ndị Jehova Chineke rụrụ n’oge gara aga na ọtụtụ ngọzi ọ na-ekwe nkwa inye ihe a kpọrọ mmadụ n’ọdịnihu dị nso. (Jenesis 22:17, 18; Ọpụpụ 3:17; Abụ Ọma 72:6-16; Mkpughe 21:4, 5) Karịsịa, Bible na-ekpughere anyị ngosipụta kasịnụ nke ịhụnanya Chineke n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ—inye Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ịbụ Onye Mgbapụta anyị ka anyị wee nwee ike inwere onwe anyị pụọ n’agbụ nke mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:8) N’ezie, ka anyị na-amụtakwu banyere Onye Okike anyị na-ahụ n’anya, otú ahụ ka a na-akpalikwu anyị ịhụ ya n’anya site n’obi anyị.
Ịmụta Ịhụ Ụmụ Mmadụ Ibe Anyị n’Anya
Dị ka Jisọs gosipụtara, tinyere iji obi, mkpụrụ obi, na uche anyị dum hụ Chineke n’anya, anyị kwesịrị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị. N’ezie, ịhụnanya Chineke na-enye anyị ibu ọrụ nke ịhụ ụmụ mmadụ ibe anyị n’anya. Jọn onyeozi kọwara, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú a, anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta onwe anyị n’anya.” O mesikwuru ya ike, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị, Ana m ahụ Chineke n’anya, ma ọ na-akpọ nwanne ya asị, ọ bụ onye ụgha: n’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, ọ pụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ Onye ọ na-ahụghị mgbe ọ bụla. Ihe a e nyere n’iwu ka anyị nwekwara site n’ebe Ọ nọ, ka onye na-ahụ Chineke n’anya, ka ọ hụkwa nwanna ya n’anya.”—1 Jọn 4:11, 20, 21.
Taa anyị na-ebi n’ụwa ebe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-egosipụta àgwà nke ibute ọdịmma nke ha ụzọ, na-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya,” dị nnọọ ka Bible buru n’amụma. (2 Timoti 3:2) Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụta ụzọ kasịnụ nke ịhụnanya, anyị aghaghị itinye mgbalị siri ike ime ka uche anyị bụrụ ihe ọhụrụ na iṅomi Onye Okike anyị na-ahụ n’anya, kama ịgbaso ụzọ ndụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ndị mmadụ n’ozuzu ha. (Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 5:1) Ọbụna Chineke nwere “ihu ọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị bụ ajọ mmadụ nọ,” ma “na-eme ka anyanwụ Ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, Ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” Ebe Nna anyị nke eluigwe na-esetịpụrụ anyị ihe nlereanya dị otú ahụ magburu onwe ya, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike inwe obiọma n’ebe mmadụ nile nọ ma na-enyere ha aka. Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ ịnwapụta onwe anyị dị ka ‘ụmụ nke Nna anyị na-ahụ n’anya Nke bi n’eluigwe.’—Luk 6:35; Matiu 5:45.
Mgbe ụfọdụ ihe na-esi n’omume ịhụnanya ndị dị otú ahụ apụta na-abụ inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-efe ezi Chineke ahụ. N’afọ ole na ole gara aga, otu odozi akụ̀ nke bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova gbalịrị isoro onye agbata obi ya kerịta ozi Bible, ma ọ nabataghị ya ma ọlị. Otú ọ dị, mmeghachi omume ahụ akụdaghị ya aka. Kama nke ahụ, ọ nọgidere na-egosi onye agbata obi ahụ obiọma ma gbalịa ịdị na-enyere ya aka. N’otu oge, o nyeere onye agbata obi ahụ aka ịkwaga n’ụlọ ọzọ. N’oge ọzọ o mere ndokwa ka mmadụ soro onye agbata obi ahụ gaa n’ọdụ ụgbọelu iji zute ndị ikwu nke onye agbata obi ahụ. Mgbe e mesịrị, onye agbata obi ahụ nakweere ọmụmụ Bible ma mesịa ghọọ onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi n’agbanyeghị mkpagbu kpụ nnọọ ọkụ n’ọnụ sitere n’aka di ya. Ee, ngosipụta nke ịhụnanya ndị ahụ tọrọ ntọala maka ngọzi ebighị ebi.
Ọ bụrụ na anyị na-ekwu eziokwu banyere ya, anyị ga-ekweta na ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ abụghị n’ihi na àgwà ọma anyị ebuka. Kama nke ahụ, ọ hụrụ anyị n’anya n’agbanyeghị na anyị na-emejọ ọtụtụ mgbe bụrụkwa ndị na-adịghị ike. Ebe ọ dị otú ahụ, anyị kwesịkwara ịmụta ịhụ ụmụ mmadụ ibe anyị n’anya n’agbanyeghị ọtụtụ mmejọ ha. Ọ bụrụ na anyị azụọ onwe anyị ịghọta na inwe ekele maka àgwà ọma ndị ọzọ karịa ịdị na-achọ ebe ndị ha mejọrọ, ọ ga-aka nnọọ adịrị anyị mfe ịhụ ha n’anya. Mmetụta anyị nwere n’ebe ha nọ pụrụ ọbụna ịkarị ịhụnanya ahụ ụkpụrụ na-achịkwa ma gụnye mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ na mmasị ndị na-adị n’etiti ezi ndị enyi.
Ikwe Ka Ịhụnanya Gị Na-eto Eto
Ọ dị mkpa ịzụlite ịhụnanya na ọbụbụenyi, ime ihe n’eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ so n’ime ihe ndị dị oké mkpa n’ime nke a. Ụfọdụ na-anwa izochi emezighị emezi ha iji mee ka ndị ha chọrọ ime enyi na-ele ha anya ọma. Otú ọ dị, omume dị otú ahụ na-enwekarị mmetụta dị iche n’ihe e bu n’uche, ebe ọ bụ na ndị ọzọ na-emesị chọpụta ihe ndị bụ́ eziokwu, ha na-abụkwa ndị emeghị ihe n’eziokwu dị otú ahụ na-achụ. Ya mere, anyị ekwesịghị ịdị na-atụ ụjọ ikwe ka ndị ọzọ mara anyị otú anyị dị n’ezie—ọ bụ ezie na anyị nwere adịghị ike ndị anyị na-agbalịsi ike imeri. Nke a pụrụ inye aka ime ka anyị na ha bụrụ enyi.
Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị bụ́ Onyeàmà meworo agadi nke nọ n’otu ọgbakọ dị n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa agụghị oké akwụkwọ. Ma, ọ dịghị anwa izochiri ya ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-anabata hoo haa na ya enweghị ike igosi ndị ọzọ otú e si eji amụma Bible na akụkọ ihe mere eme egosipụta na Oge Ndị Jentaịl gwụsịrị na 1914.a Otú ọ dị, ọ na-esetịpụ nnọọ ezi ihe nlereanya n’ịnụ ọkụ n’obi n’ozi, nakwa n’ịhụ ụmụnna n’anya na imesapụrụ ha aka, nke na a na-eji ịhụnanya akpọ ya ọla nke ọgbakọ ahụ.
N’ọdịbendị ụfọdụ, a dịghị ele igosipụta ịhụnanya n’ihu ọha anya ọma; a na-akụziri ndị mmadụ igosipụta omume ọma nkịtị ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ọ na-adị mma mgbe nile igosipụta nkwanye ùgwù na ichebara ndị ọzọ echiche, anyị ekwesịghị ikwe ka omume ọma nkịtị anyị gbochie anyị igosipụta mmetụta anyị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ihere emeghị Jehova ikwupụta ịhụnanya ya n’ebe ndị ya ọ họpụtara, bụ́ Israel oge ochie nọ, na-agwa ha, sị: “Ọ bụ ịhụnanya nke dị mgbe ebighị ebi ka M jiworo hụ gị n’anya.” (Jeremaịa 31:3) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Tesalọnaịka, sị: “Ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:8) Ya mere, ka anyị na-agbalị ịzụlite ezi ịhụnanya n’ebe ụmụ mmadụ ibe anyị nọ, ọ bụ ihe ka kwekọọ n’ozizi Bible bụ́ ikwe ka mmetụta dị otú ahụ na-apụtara onwe ya karịa ịbịachigide ya.
Ọ Chọrọ Ịnọgide Na-eme Mgbalị
Ịmụta inwe na igosipụta ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ bụ ihe omume na-aga n’ihu. Ime otú ahụ na-achọ mgbalị dị ukwuu n’aka anyị n’ihi na anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji merie ezughị okè anyị nakwa iji guzogide mmetụta dị ike nke ụwa a nke na-adịghị ahụ n’anya. Otú ọ dị, ụgwọ ọrụ bara ụba nke a na-eweta na-eme ka o kwesị mgbalị ahụ.—Matiu 24:12.
Ọbụna n’ụwa a na-ezughị nnọọ okè, anyị na ụmụ mmadụ ibe anyị pụrụ inwe mmekọrịta ka mma, na-arụpụtara anyị na ndị ọzọ ọṅụ, udo, na afọ ojuju dị ukwuu. Site n’itinye mgbalị dị otú ahụ, anyị pụrụ ịnwapụta na anyị ruru eru inwe olileanya ahụ dị ebube bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke. Karịsịa, site n’ịmụta ụzọ kasịnụ nke ịhụnanya, anyị pụrụ inweta ihu ọma na ngọzi nke Onye Okike anyị na-ahụ n’anya, ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta nkọwa zuru ezu, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 132-135.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
A pụrụ igosipụta ịhụnanya ndị Kraịst site n’omume obiọma
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 8]
UN PHOTO 186226/M. Grafman