Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee otú Ndịàmà Jehova si ele ntụli aka anya?
E nwere ụkpụrụ ndị doro anya e depụtara na Bible bụ́ ndị na-enyere ndị ohu Chineke aka ile okwu a anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, o yiri ka e nweghị ụkpụrụ megidere ntụli aka n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị ihe mere bọọdụ nduzi na-agaghị eji tụlie aka iji mee mkpebi ndị metụtara ụlọ ọrụ ha. Ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-eme mkpebi mgbe mgbe banyere oge a ga na-enwe nzukọ na otú a ga-esi jiri ego ọgbakọ mee ihe site n’ịtụli aka nke iweli aka elu.
Ma, gịnị banyere ikere òkè ná ntụli aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị? N’ezie, n’ala ụfọdụ ebe e nwere ọchịchị onye kwuo uche ya, ihe ruru nnọọ pasent 50 nke ndị bi na ya adịghị apụta iji tụlie aka n’ụbọchị ntụli aka. Banyere Ndịàmà Jehova, ha adịghị egbochiri ndị ọzọ ihe ruuru ha bụ́ ịtụli aka; ha adịghịkwa eme mkpọsa megide ntụli aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụdị ọ bụla. Ha na-akwanyere ndị ọchịchị ndị a họpụtara ná ntụli aka dị otú ahụ ùgwù ma na-ekwenyere ha. (Ndị Rom 13:1-7) Banyere ma ha onwe ha n’otu n’otu hà ga-atụliri onye na-azọ ọkwá ọchịchị aka, onye nke ọ bụla n’ime Ndịàmà Jehova na-eme mkpebi na-adabere n’akọ na uche ya e ji Bible zụọ nakwa ná nghọta o nwere banyere ibu ọrụ ya n’ebe Chineke na Ọchịchị nọ. (Matiu 22:21; 1 Pita 3:16) N’ime mkpebi onwe onye a, Ndịàmà na-atụle ọtụtụ ihe.
Nke mbụ, Jisọs Kraịst kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Ndịàmà Jehova ji ụkpụrụ a kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ịbụ ndị ‘na-esiteghị n’ụwa,’ ha na-anọpụ iche n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa.—Jọn 18:36.
Nke abụọ, Pọl onyeozi zoro aka n’ebe ya onwe ya nọ dị ka “ụkọ” na-anọchite anya Kraịst nye ndị mmadụ nọ n’oge ya. (Ndị Efesọs 6:20; 2 Ndị Kọrint 5:20) Ndịàmà Jehova kweere na e chiwo Kraịst Jisọs Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, ha onwe ha kwa, dị ka ndị ụkọ, aghaghị ikwupụta nke a nye ndị mba nile. (Matiu 24:14; Mkpughe 11:15) A na-atụ anya ka ndị ụkọ nọpụ iche, gharakwa inyoba anya n’ihe ndị dịịrị obodo ahụ e zigara ha. Dị ka ndị nnọchianya nke Alaeze eluigwe Chineke, Ndịàmà Jehova nwekwara ibu ọrụ yiri nke ahụ ịghara inyoba anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba ebe ha bi.
Ihe nke atọ a ga-atụle bụ na ndị na-ekere òkè n’ịtụliri mmadụ aka ịba n’ọkwá ọchịchị pụrụ ịza ajụjụ maka ihe ndị ọ ga-eme. (Tụlee 1 Timoti 5:22, The New English Bible.) Ndị Kraịst kwesịrị iji nlezianya tụlee ma hà chọrọ ịza ajụjụ dị otú ahụ.
Nke anọ, Ndịàmà Jehova ji ịdị n’otu nke ndị Kraịst ha kpọrọ ihe nke ukwuu. (Ndị Kọlọsi 3:14) Mgbe okpukpe tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe na-esikarị na ya apụta bụ nkewa n’etiti ndị òtù ha. N’iṅomi Jisọs Kraịst, Ndịàmà Jehova na-ezere itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma si otú ahụ nọgide na-enwe ịdị n’otu nke ndị Kraịst ha.—Matiu 12:25; Jọn 6:15; 18:36, 37.
Nke ise na nke ikpeazụ, ha ịnọpụ iche n’ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị na-eme ka Ndịàmà Jehova nwee nkwuwa okwu iji ozi Alaeze ahụ dị mkpa jekwuru ndị nọ n’ụdị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile.—Ndị Hibru 10:35.
N’ihi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’elu, n’ọtụtụ ala, Ndịàmà Jehova na-eme mkpebi onwe onye ịghara ikere òkè ná ntụli aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, iwu obodo ha na-akwadokwa nnwere onwe ha nwere ime mkpebi ahụ. Ma, gịnị ma ọ bụrụ iwu na ụmụ amaala ga-atụli aka? N’ọnọdụ dị otú ahụ, Onyeàmà nke ọ bụla nweere onwe ya iji akọ na uche ya mee mkpebi dabeere na Bible banyere otú ọ ga-esi mee ihe maka ọnọdụ ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ ekpebie ije n’ebe a na-atụ vootu, nke ahụ bụ mkpebi dịịrị ya. Ihe o mere n’ebe a na-atụ vootu dịịrị ya na Onye Okike ya.
Mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke November 15, 1950, peji nke 445 na 446 kwuru, sị: “N’ebe Siza mere ka ọ bụrụ iwu na ụmụ amaala ga-atụli aka . . . [Ndịàmà] pụrụ ịga n’ebe a na-atụ vootu ma banye n’ebe ntụnye vootu. Ọ bụ n’ebe a ka a na-achọ ka ha kanye ihe n’akwụkwọ vootu ma ọ bụ denye ebe ha kwụ na ya. Ndị na-atụli aka na-eji akwụkwọ vootu ha eme ihe masịrị ha. Ya mere ọ bụ n’ebe a, n’ihu Chineke, ka ndịàmà ya na-aghaghị ime ihe kwekọrọ n’iwu ya na okwukwe ha. Ọ bụghị ibu ọrụ anyị ịtụziri ha ihe ha ga-eji akwụkwọ vootu ahụ mee.”
Gịnị ma ọ bụrụ na di na-ekweghị ekwe nke nwanyị bụ́ onye Kraịst esie ọnwụ ka ọ bịa tụọ vootu? Ọ nọ n’okpuru di ya, dị nnọọ ka ndị Kraịst nọ n’okpuru ndị na-achị isi. (Ndị Efesọs 5:22; 1 Pita 2:13-17) Ọ bụrụ na o rubere di ya isi ma gaa n’ebe a na-atụ vootu, nke ahụ bụ mkpebi dịịrị ya. Ọ dịghị onye kwesịrị ịkatọ ya.—Tụlee Ndị Rom 14:4.
Gịnị banyere mba ebe iwu na-ejighị mmadụ ịtụli aka ma a na-eweso ndị na-ejeghị n’ebe a na-atụ vootu iwe—ikekwe a na-emerụ ha ahụ? Ma ọ bụ, gịnị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ n’otu n’otu, ọ bụ ezie na iwu ejighị ha ịtụli aka, abụrụ ndị a na-ata ahụhụ n’ụzọ ụfọdụ ma ọ bụrụ na ha ejeghị n’ebe a na-atụ vootu? N’ọnọdụ ndị a na ndị yiri ha, onye Kraịst aghaghị ime mkpebi nke aka ya. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.”—Ndị Galetia 6:5.
E nwere ndị a pụrụ ime ka ha sụọ ngọngọ mgbe ha hụrụ na n’oge ntụli aka ná mba ha, na ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-aga n’ebe a na-atụ vootu ma ndị ọzọ adịghị aga. Ha pụrụ ịsị, ‘Ndịàmà Jehova enweghị nkwekọ.’ Ma, ndị mmadụ kwesịrị ịghọta na n’okwu ndị dabeere n’akọ na uche onwe onye dị ka nke a, onye Kraịst nke ọ bụla aghaghị ime mkpebi nke onwe ya n’ihu Jehova Chineke.—Ndị Rom 14:12.
Mkpebi onwe onye ọ bụla Ndịàmà Jehova na-eme n’oge e nwere nsogbu dịgasị iche, ha na-elezi anya ichekwa nnọpụiche ndị Kraịst na nkwuwa okwu ha. N’ihe nile, ha na-adabere n’ebe Jehova Chineke nọ iwusi ha ike, inye ha amamihe, na inyere ha aka izere imebi okwukwe ha n’ụzọ ọ bụla. Ha si otú a egosipụta obi ike n’okwu ọbụ abụ ahụ: “Nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike ka Ị bụ; ọzọ, n’ihi aha Gị Ị ga-edu m, duokwa m nwayọọ.”—Abụ Ọma 31:3.