Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/1 p. 30-31
  • Onyinye Afọ Ofufo Iji Kwalite Ofufe Dị Ọcha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onyinye Afọ Ofufo Iji Kwalite Ofufe Dị Ọcha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onyinye nke Ngwá Ọrụ na Nkà
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • ‘Meenụ Ndị Enyi Site n’Akụ̀ nke Ajọ Omume’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịmata Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ijikọta Aka Na-ewu Ihe Owuwu Iji Wetara Chineke Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọpụpụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/1 p. 30-31

Ha Mere Uche Jehova

Onyinye Afọ Ofufo Iji Kwalite Ofufe Dị Ọcha

ỤMỤ Israel jiri anya ha hụ ikike nzọpụta Jehova. Ha hụrụ ka mmiri nke Osimiri Uhie kewara abụọ n’ụzọ ọrụ ebube, na-eme ka ha nwee ike isi n’ala akọrọ gafere ma gbanahụ usuu ndị agha Ijipt. N’ofe nke ọzọ, ha nọ n’ebe na-adịghị ize ndụ hụ ka otu mmiri ahụ lọghachiri rikpuo ndị ahụ na-achụso ha. Jehova azọpụtawo ndụ ha!—Ọpụpụ 14:21-31.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ụmụ Israel ejighị ihe Chineke ha meere ha kpọrọ ihe. Mgbe Mosis nọ n’Ugwu Saịnaị, ha nyere Erọn ọla ha ma gwa ya ka ọ kpụọrọ ha chi ka ha fee ya ofufe. Mgbe Mosis lọghachiri, ọ hụrụ ígwè ndị nnupụisi a ka ha na-eri nri, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ete egwú, ma na-akpọ isiala nye nwa ehi ọlaedo! Ná ntụziaka Jehova, e gburu ihe dị ka mmadụ 3,000—ndị ma eleghị anya kpalitere nnupụisi ahụ n’ụzọ bụ́ isi. N’ụbọchị ahụ, ndị Chineke mụtara ihe dị mkpa banyere mkpa ọ dị inye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa.—Ọpụpụ 32:1-6, 19-29.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke a mesịrị, Mosis jikeere imezu iwu Jehova nyere ka e wuo ụlọikwuu, ụlọikwuu ofufe nke a pụrụ ibugharị ebugharị. Ọrụ ihe owuwu a ga-achọ ngwá ọrụ ndị dị oké ọnụ ahịa na ndị ọrụ nwere nkà. Olee ebe a ga-esi nweta ha? Oleekwa ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ Bible a?

Onyinye nke Ngwá Ọrụ na Nkà

Jehova sitere n’aka Mosis nye ụmụ Israel iwu, sị: “[Wetere] Jehova [onyinye, NW]: onye ọ bụla nke obi ya nwere afọ ofufo, ya weta ya, bụ́ [onyinye, NW] nke Jehova.” Ọ̀ bụ onyinye dị aṅaa? Ihe ndị so n’ihe Mosis depụtara bụ ọlaedo, ọlaọcha, ọla, eriri e ji ekwe ákwà, ákwà, akpụkpọ anụ, osisi, na nkume dị oké ọnụ ahịa.—Ọpụpụ 35:5-9.

Ụmụ Israel nwere ihe zuru nnọọ ezu isi na ya nye onyinye mmesapụ aka ndị dị otú ahụ. Cheta na mgbe ha hapụrụ Ijipt, ha weere ihe ọlaedo na nke ọlaọcha, tinyere ọtụtụ uwe. N’ezie, “ha [napụrụ] ndị Ijipt ihe ha.”a (Ọpụpụ 12:35, 36) Na mbụ, ụmụ Israel ejiwo ọchịchọ obi ha nyefusịa ọla ha iji kpụọ arụsị maka ofufe ụgha. Hà ga-egosi otu ụdị ọchịchọ ahụ n’inye onyinye iji kwalite ezi ofufe?

Rịba ama na Mosis esetịpụghị ihe ole onye nke ọ bụla ga-enye, o jighịkwa amamikpe ma ọ bụ imenye ihere kpalie ha inye onyinye ahụ. Kama nke ahụ, ọ bụ nanị arịrịọ ka ọ rịọrọ “onye ọ bụla nke obi ya nwere afọ ofufo.” Ihe ama na-egosi na Mosis ahụghị uru ọ bụla ọ bara ịmanye ndị Chineke amanye. O nwere obi ike na onye nke ọ bụla ga-enye ihe nile o nwere ike inye.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 8:10-12.

Otú ọ dị, ọrụ ihe owuwu ahụ agaghị achọ nanị onyinye nke ngwá ọrụ. Jehova gwakwara ụmụ Israel, sị: “Onye ọ bụla n’etiti unu nke nwere obi amamihe, ha ga-abịakwa, mee ihe nile nke Jehova nyere n’iwu.” Ee, ọrụ ihe owuwu a chọrọ ọrụ nkà. N’ezie, ọ ga-achọ “ije ozi ọ bụla”—nke gụnyere ọrụ ịkwa nkà, iji ígwè akpụ ihe, iji ọla achọ ihe mma—iji wuzuo ihe owuwu a. N’ezie, Jehova ga-eduzi nkà ndị ọrụ ahụ, ọ bụkwa ya ka a ga-enye otuto n’ụzọ ziri ezi n’ihi ihe ịga nke ọma nke ọrụ ahụ.—Ọpụpụ 35:10, 30-35; 36:1, 2.

Ụmụ Israel jiri mmasị zaa ọkpụkpọ òkù ahụ bụ́ inye ma ihe onwunwe ha ma nkà ha. Ihe ndekọ Bible ahụ na-ekwu, sị: “Ha wee bịa, onye ọ bụla nke obi ya kwaliri ya, na onye ọ bụla nke mmụọ ya mere ka o nwee afọ ofufo, ha wee weta [onyinye, NW] Jehova, iji jee ozi ụlọikwuu nzute ahụ, na iji fee ofufe ya nile, na iji mee uwe nsọ ahụ. Ha wee bịa, ma ndị ikom ma ndị inyom, onye ọ bụla nke obi ya nwere afọ ofufo.”—Ọpụpụ 35:21, 22.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Taa a na-arụzu ọrụ ahụ dị nnọọ ukwuu nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke site n’onyinye afọ ofufo. Ọtụtụ mgbe, ụtụ ndị a na-abụ ego. N’ọnọdụ ndị ọzọ, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-eji ahụmahụ ha bara ụba nye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ. E nwekwara ọrụ a na-arụ n’ihe karịrị otu narị ebe obibi Betel gburugburu ụwa, bụ́ ọrụ chọrọ ọtụtụ nkà dịgasị iche. Ndị nile nwere obi afọ ofufo bụ́ ndị nyeworo onyinye ndị dị otú ahụ pụrụ ijide n’aka na Jehova agaghị echefu ịrụsi ọrụ ike ha!—Ndị Hibru 6:10.

Otu ihe ahụ metụtakwara òkè onye nke ọ bụla n’ime anyị na-ekere n’ozi ndị Kraịst. A na-agba anyị nile ume ịzụchapụta oge iji jiri ịnụ okụ n’obi kere òkè n’ime nkwusa. (Matiu 24:14; Ndị Efesọs 5:15-17) Ụfọdụ ndị na-eme nke a site n’ije ozi dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ. N’ihi ọnọdụ ndị dịgasị iche, ndị ọzọ enweghị ike itinye oge dị ukwuu n’ozi dị ka onye ọsụ ụzọ. Ka o sina dị, ha onwe ha kwa na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ. Dị ka ọ dị n’onyinye ụlọikwuu ahụ, Jehova adịghị ekwu kpọmkwem ihe ole onye nke ọ bụla kwesịrị inye. Otú ọ dị, ihe ọ chọrọ bụ ka onye nke ọ bụla n’ime anyị were obi, mkpụrụ obi, uche, na ume ya dum na-ejere ya ozi. (Mak 12:30) Ọ bụrụ na anyị na-eme nke ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-akwụghachi anyị ụgwọ n’ihi onyinye afọ ofufo ndị anyị na-enye iji kwalite ezi ofufe.—Ndị Hibru 11:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Nke a abụghị izu ohi. Ụmụ Israel rịọrọ ndị Ijipt maka onyinye, ha jikwara obi ha nye ha ya. E wezụga nke ahụ, ebe ọ bụ na ndị Ijipt ekwesịghịdị ime ụmụ Israel ohu ha, ha ji ndị Chineke ụgwọ maka afọ nile ha jiri rụọrọ ha ọrụ ike.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya