Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/15 p. 28-31
  • Gịnị Ka A Pụrụ Ime Banyere Nkụda Mmụọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka A Pụrụ Ime Banyere Nkụda Mmụọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkụda Mmụọ n’Ọrụ Nkwusa Ozi Ọma Anyị
  • Ịrụpụta Ihe Ndị Ka Mma
  • Ịnọgide Na-enwe Àgwà Ziri Ezi
  • Nkụda Mmụọ na Mmekọrịta
  • Echiche Onwe Onye Ndị Na-akụda Mmụọ
  • Abụọ n’Ime Ihe Ngwọta Ndị Kasị Mma
  • Imeri Nkụda Mmụọ
  • Otú Ị Ga-esi Emeri Ịda Mbà n’Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume ka Ụbọchị Ahụ Na-abịaru Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Mmụọ Nsọ Na-enye Anyị Ike Idi Ọnwụnwa, Na-emekwa Ka Anyị Ghara Ịda Mbà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndị Ike Gwụrụ Ma Ha Adaghị Mbà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/15 p. 28-31

Gịnị Ka A Pụrụ Ime Banyere Nkụda Mmụọ?

OLEE otú mmadụ pụrụ isi lụsoo nkụda mmụọ ọgụ? Nke a bụ ajụjụ a jụrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ụfọdụ, bụ́ ndị na-eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova mgbe nile. Azịza ha pụrụ inyere anyị aka ịtụle ihe ndị na-akpata nkụda mmụọ na ihe ngwọta nke ọnọdụ a bụ́ nke pụrụ imetụta onye Kraịst ọ bụla.

A chọrọ ihe karịrị ntụle iji lụsoo nkụda mmụọ ọgụ, ma ihe mgbaàmà ya pụrụ ịgụnye enweghị mmasị n’ekpere ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe onwe onye, agachighịzi nzukọ anya, enweghị ịnụ ọkụ n’obi, ọbụnakwa enweghị mmasị n’ebe mkpakọrịta ndị enyi bụ́ ndị Kraịst nọ. Otú ọ dị, otu n’ime ihe àmà kasị apụta ìhè bụ ibelata ịnụ ọkụ n’obi e nwere maka ikwusa ozi ọma. Ka anyị nyochaa ihe mgbaàmà ya ma tụlee ihe ngwọta ụfọdụ.

Nkụda Mmụọ n’Ọrụ Nkwusa Ozi Ọma Anyị

Jisọs Kraịst maara ihe isi ike ndị ya na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na-agakọ. (Matiu 28:19, 20) O zipụrụ ụmụazụ ya dị ka “atụrụ n’etiti agụ,” na-amara na ọrụ nkwusa ha ga-ewetara ha mkpagbu. (Matiu 10:16-23) Ma, nke a abụghị ihe mere ha ga-eji nwee nkụda mmụọ. N’ezie, mkpagbu emewo mgbe mgbe ka ndị ohu Chineke bụ́ ndị ji ekpere dabere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike.—Ọrụ 4:29-31; 5:41, 42.

Ọbụna mgbe ndị na-eso ụzọ Kraịst na-enwetaghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, a nabataghị ha nke ọma mgbe nile. (Matiu 10:11-15) N’otu aka ahụ, ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova abụghị nke e ji ahụ iru ala arụ mgbe nile taa.a Nye ọtụtụ ndị, nkwenye na Chineke bụ okwu dịịrị onwe onye nke ha na-adịghị enwe mmasị isoro mmadụ kwurịta. Ndị ọzọ achọghị ihe ọ bụla ijikọ ha na òtù okpukpe bụ́ nke ha nwere ajọ mbunobi ụfọdụ megide. Obi abụọ adịghị ya na enweghị mmasị, arụpụtaghị ihe, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ dị iche iche pụrụ ịbụ ihe ndị siri ike na-akpata nkụda mmụọ. Olee otú a pụrụ isi merie ihe mgbochi ndị a?

Ịrụpụta Ihe Ndị Ka Mma

Ọṅụ anyị na-enweta site n’ozi anyị na-esite n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ n’ihe ndị anyị rụpụtara. Oleezi otú anyị pụrụ isi jee ozi na-arụpụta ihe karị? Anyị bụ “ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” (Mak 1:16-18) Ndị ọ́kụ̀ azụ̀ n’Israel oge ochie na-aga ịkụ azụ̀ n’abalị bụ́ mgbe ha pụrụ igbute ọtụtụ azụ karịsịa. Ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa ịtụle ókèala anyị ka anyị wee gaa “ịkụ azụ̀” mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ga-anọ n’ụlọ ma ṅaa ntị n’ozi anyị karị. Nke a pụrụ ịbụ n’uhuruchi, ná ngwụsị izu, ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ. Dị ka otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị si kwuo, nke a dị irè n’ógbè ebe ndị mmadụ na-arụ ọrụ n’oge ehihie dum. Ọ na-ekwu na ịgba àmà uhuruchi na-arụpụtakarị ihe ndị magburu onwe ha. Ịgba àmà telifon ma ọ bụ nke mberede na-emekwa ka anyị nwee ike iru ndị mmadụ karị.

Nnọgidesi ike n’ozi na-arụpụta ezi ihe. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe nakwa ná mba Africa ụfọdụ, ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-enwe ọganihu dị mma, nke a ewetawokwa mmụba ndị dị mma. N’otu aka ahụ, e guzobewo ọtụtụ ọgbakọ n’ógbè ndị e leworo anya eri oge dị ka nke na-adịghị amị mkpụrụ ma ọ bụ ọbụna n’ókèala ndị a rụzuworo ọrụ na ha ugboro ugboro. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nke gị adịghị arụpụta ihe ndị dị otú ahụ?

Ịnọgide Na-enwe Àgwà Ziri Ezi

Iburu ihe mgbaru ọsọ Jisọs setịpụrụ n’uche nke ọma ga-enyere anyị aka ịghara inwe nkụda mmụọ n’agbanyeghị enweghị mmasị a na-egosi n’ozi ahụ. Kraịst chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya chọpụta ndị kwesịrịnụ, ọ bụghị ime ntọghata n’ìgwè. N’ọtụtụ oge, ọ rụtụrụ aka na ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu agaghị anabata ozi ọma ahụ, dị nnọọ ka ihe ka ọtụtụ ná ndị Israel na-egeghị ndị amụma oge ochie ntị.—Ezikiel 9:4; Matiu 10:11-15; Mak 4:14-20.

Ndị “maara mkpa ime mmụọ ha” na-eji ekele anabata ‘ozi ọma alaeze’ ahụ. (Matiu 5:3, NW; 24:14) Ha na-achọ ijere Chineke ozi otú o si chọọ. N’ihi ya, ihe na-esi n’ọrụ anyị apụta na-aka adabere n’ọnọdụ obi nke ndị mmadụ karịa na nkà anyị nwere maka izi ozi ahụ. N’ezie, ọ dị anyị mkpa ime ike anyị nile iji mee ka ozi ọma ahụ na-adọrọ mmasị. Ma, ihe a ga-arụpụta na-adabere n’ebe Chineke nọ, n’ihi na Jisọs sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.”—Jọn 6:44.

Ọrụ nkwusa ozi ọma anyị na-eme ka a mara aha Jehova. Ma ndị mmadụ hà na-ege ntị ma ọ bụ na ha adịghị ege, ọrụ nkwusa anyị na-atụnye ụtụ n’ido aha nsọ Jehova nsọ. Ọzọkwa, site n’ọrụ nkwusa ozi ọma anyị, anyị na-egosipụta na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị nwekwara ihe ùgwù nke ikere òkè n’ozi kasị mkpa a na-eje n’oge anyị.—Matiu 6:9; Jọn 15:8.

Nkụda Mmụọ na Mmekọrịta

Mmekọrịta ụfọdụ nke mmadụ na ibe ya, ma ọ̀ bụ n’ime ezinụlọ ma ọ bụ n’ime ọgbakọ, pụrụ ịkpata nkụda mmụọ. Dị ka ihe atụ, e nwere mmetụta nke ịbụ onye a na-adịghị aghọta. Ezughị okè nke ndị kwere ekwe ibe anyị pụkwara ịkụda anyị mmụọ. Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịbụrụ anyị ihe inyeaka dị ukwuu.

“Òtù ndị bụ́ ụmụnna” gburugburu ụwa na-emejupụta ezinụlọ ime mmụọ buru ibu. (1 Pita 2:17) Ma mmetụta nke ịbụ onye so ná ndị dị n’otu pụrụ ịpụ n’anya mgbe ihe isi ike bilitere n’ihi ndịrịta iche n’ọdịdị mmadụ. Ihe àmà na-egosi na ndị Kraịst narị afọ mbụ nwere nsogbu ndị dị otú ahụ, ebe ọ bụ na Pọl onyeozi aghaghị ichetara ha ugboro ugboro ibikọ ọnụ n’ịdị n’otu. Dị ka ihe atụ, ọ gbara ndị inyom abụọ bụ́ ndị Kraịst—Yuodia na Sintiki—ume idozi esemokwu ha.—1 Ndị Kọrint 1:10; Ndị Efesọs 4:1-3; Ndị Filipaị 4:2, 3.

Ọ bụrụ na nke a bụ nsogbu, olee otú anyị pụrụ isi nweghachi ezi ịhụnanya n’ebe ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ? Site n’ichetara onwe anyị na Kraịst nwụrụ n’ihi ha nakwa na ha onwe ha, dị ka anyị onwe anyị, egosipụtawo okwukwe n’àjà mgbapụta ya. Anyị pụkwara iburu n’uche na ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị dị njikere iṅomi Jisọs Kraịst site n’itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi anyị.

Ụfọdụ afọ gara aga, na Paris, France, otu Onyeàmà na-eto eto egbughị oge n’ịdọkpụrụ otu akpati nke bọmbụ dị na ya bụ́ nke e debeworo n’èzí Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ gbadara ọtụtụ stepụ tupu ọ tụba ya n’ime otu isi mmiri, bụ́ ebe ọ nọ gbawaa. Mgbe a jụrụ ya ihe kwaliri ya itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ụzọ dị otú a, ọ zara, sị: “Achọpụtara m na ndụ anyị dị n’ihe ize ndụ. Ya mere, echere m na ọ ka mma ka m nwụọ nanị m karịa anyị nile ịnwụ.”b Lee ngọzi ọ bụ inwe ndị enyi dị otú ahụ bụ́ ndị dị njikere ịgbasochi ihe nlereanya Jisọs anya!

Ọzọkwa, anyị pụrụ ịtụgharị uche ná mmụọ nke imekọ ihe ọnụ nke dị n’etiti Ndịàmà Jehova bụ́ ndị nọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.c Na nso nso a, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Malawi jikwa otu ikwesị ntụkwasị obi ahụ nọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe dị ka ezi ndị Kraịst. Icheta na ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ anyị ga-eme omume n’otu ụzọ ahụ n’okpuru ọnọdụ ndị dị njọ ọ̀ dịghị akpali anyị ileghara ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ile mmejọ na nghọtahie a na-enwe kwa ụbọchị anya dị ka obere ihe? Ọ bụrụ na anyị azụlite obi nke Kraịst, mmekọrịta anyị na ndị ofufe ibe anyị na-enwe kwa ụbọchị ga-abụ ebe anyị si enweta ume ọhụrụ, ọ bụghị nkụda mmụọ.

Echiche Onwe Onye Ndị Na-akụda Mmụọ

“Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa: ma osisi nke na-enye ndụ ka ihe a na-achọsi ike bụ, mgbe ọ bịaruworo.” (Ilu 13:12) N’anya ụfọdụ ndị ohu Jehova, ọgwụgwụ nke usoro ihe a anaghị abịa ngwa ngwa otú o kwesịrị. Ndị Kraịst na-ahụ oge a anyị bi na ya dị ka nke “dị oké egwu,” dị nnọọ ka ọtụtụ ndị na-ekweghị ekwe si ahụ ya.—2 Timoti 3:1-5.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị iche n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, ndị Kraịst kwesịrị ịṅụrị ọṅụ ịhụ n’ọnọdụ ndị a na-ele ule “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ Jisọs, bụ́ nke na-egosi na Alaeze Chineke ga-eweta ajọ usoro ihe a ná njedebe n’oge na-adịghị anya. (Matiu 24:3-14) Ọbụna mgbe ọnọdụ ahụ ga-aka njọ—dị ka ọ ga-adị n’ezie n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ—ihe omume ndị a bụ ihe na-enye anyị ọṅụ n’ihi na ha na-ama ọkwa ụwa ọhụrụ Chineke na-abịanụ.—Matiu 24:21; 2 Pita 3:13.

Onye Kraịst ịdị na-eyigharị n’uche ya oge Alaeze ahụ ga-etinye aka n’ihe ndị na-eme ugbu a pụrụ ime ka ọ na-etinyekwu oge ka ukwuu ná nchụso ihe onwunwe. Ọ bụrụ na ọ hapụ ka ihe ndị dị ka ọrụ ego na ntụrụndụ wekọrọ oge na ume ya nile, ọ ga-esiri ya ike ịrụzu ibu ọrụ ya dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke ọma. (Matiu 6:24, 33, 34) Omume dị otú ahụ na-akwalite obi nkoropụ ma si otú ahụ na-eweta nkụda mmụọ. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịnwa ịdị ụdị ndụ a ga-adị n’ụwa ọhụrụ ahụ n’usoro ihe a.”

Abụọ n’Ime Ihe Ngwọta Ndị Kasị Mma

Ozugbo a chọpụtasịrị ihe bụ́ nsogbu, olee otú mmadụ pụrụ isi chọta ezi ihe ngwọta? Ọmụmụ ihe onwe onye bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma dịnụ. N’ihi gịnị? “Ọ na-echetara anyị ihe mere anyị na-aghaghị iji mee ihe anyị na-eme,” ka otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru. Ọzọ kọwakwara, sị: “Ime nkwusa nanị n’ihi na ọ bụ ibu ọrụ dịịrị mmadụ na-aghọ ibu dị arọ ka oge na-aga.” Ma ọmụmụ ihe onwe onye dị mma na-enyere anyị aka inwetaghachi echiche doro anya banyere ọrụ anyị ka anyị na-abịaru ọgwụgwụ nso. N’otu echiche ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-echetara anyị ugboro ugboro mkpa ọ dị iriju afọ n’ụzọ ime mmụọ iji nwee ezi obi ụtọ n’ime uche Chineke.—Abụ Ọma 1:1-3; 19:7-10; 119:1, 2.

Ndị okenye pụrụ inyere ndị ọzọ aka imeri nkụda mmụọ site n’ijere ha nleta ọzụzụ atụrụ ndị na-agba ume. N’oge nleta ihu na ihu ndị a, ndị okenye pụrụ igosipụta na e ji onye ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe nke ukwuu nakwa na onye ọ bụla n’ime anyị nwere ọnọdụ dị mkpa n’etiti ndị Jehova. (1 Ndị Kọrint 12:20-26) N’izo aka n’ebe ndị Kraịst ibe ya nọ, otu onye okenye kwuru, sị: “Iji mee ka abamuru ha pụta ìhè, ana m echetara ha ihe ha rụzuworo n’oge gara aga. Ana m eme ka ha mata na ha dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova nakwa na e nyewo ọbara nke Ọkpara ya maka ha. A na-anabata echiche a nke ọma mgbe nile. Ozugbo e jiworo izo aka rijuru afọ n’akụkụ Bible dị iche iche kwadoo nke a, ndị nwere nkụda mmụọ na-anọ n’ọnọdụ nke isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ọhụrụ, ndị dị ka ekpere na ọmụmụ ihe na ọgụgụ Bible ezinụlọ.”—Ndị Hibru 6:10.

N’oge nleta ọzụzụ atụrụ, ọ dị ndị okenye mkpa ịkpachara anya ịghara ime ka o yie ka a ga-asị na ọ dịghị ekwe omume imenye Chineke obi ụtọ. Kama nke ahụ, ndị okenye pụrụ inyere ndị ofufe ibe ha nwere nkụda mmụọ aka ịhụ na ibu ụmụazụ Jisọs bu dị mfe. N’ihi ya, ozi anyị na-eje dị ka ndị Kraịst bụ isi iyi nke ọṅụ.—Matiu 11:28-30.

Imeri Nkụda Mmụọ

Ihe ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ ha na-akpata ya, nkụda mmụọ bụ ihe otiti a na-aghaghị ịlụso ọgụ. Otú ọ dị, cheta na ọ bụghị nanị anyị na-alụ ọgụ a. Ọ bụrụ na anyị enwee nkụda mmụọ, ka anyị nakwere enyemaka nke ndị enyi anyị bụ́ ndị Kraịst, karịsịa ndị okenye. Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ ibelata mmetụta nke nkụda mmụọ.

Karịsịa, ọ dị anyị mkpa ichigharịkwuru Chineke maka enyemaka n’imeri nkụda mmụọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri ekpere dabere n’ebe Jehova nọ, ọ pụrụ inyere anyị aka imeri nkụda mmụọ kpam kpam. (Abụ Ọma 55:22; Ndị Filipaị 4:6, 7) Otú o sina dị, dị ka ndị ya, anyị pụrụ inwe mmetụta nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ nke maara olu iti mkpu ahụ: Jehova, n’ìhè nke ihu Gị ka ha na-eje ije. N’aha Gị ka ha na-etegharị egwú ọṅụ ogologo ụbọchị nile: ọ bụkwa n’ezi omume Gị ka ha na-adị elu. N’ihi na ịma mma nke ike ha ka Ị bụ: ọ bụkwa n’ụtọ ihe anyị na-atọ Gị ka mpi anyị na-adị elu.”—Abụ Ọma 89:15-17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu bụ́ “Ihe-ima-aka nke Iga n’Ulo n’Ulo” dị n’Ulo-Nche, November 15, 1981.

b Lee peji nke 12 na 13 na Teta! (Bekee) nke February 22, 1985, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.

c Lee isiokwu ndị bụ́ “Alanaririm ‘Ije Ọnwu’ Ahu” n’Ulo-Nche nke February 15, 1981, na “Ikwesị Ntụkwasị Obi n’ime Nazi Germany” na Teta! nke November 8, 1986.

[Foto dị na peeji nke 31]

Nleta ọzụzụ atụrụ ndị na-ewuli elu nke ndị okenye na-ahụ n’anya na-eme pụrụ inyere ndị Kraịst aka imeri nkụda mmụọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya