Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 5/15 p. 15-19
  • Nwee Okwukwe n’Okwu Amụma Chineke!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwee Okwukwe n’Okwu Amụma Chineke!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchọ Mkpụrụ Ahụ
  • Mesaịa ahụ Apụta!
  • Kelee Eze Mesaịa Ahụ!
  • Nọgide Na-enwe Okwukwe n’Okwu Amụma Chineke
  • E Buo Ọdịnihu Ihe A Kpọrọ Mmadụ n’Amụma n’Okwu Amụma Chineke
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke Maka Oge Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ịmata Ndị Na-efe Ezi Ofufe na Mgbe Ọgwụgwụ
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 5/15 p. 15-19

Nwee Okwukwe n’Okwu Amụma Chineke!

“E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị.”—2 PITA 1:19.

1, 2. Gịnị bụ amụma mbụ e detutụworo edetu, oleekwa otu n’ime ajụjụ ndị o welitere?

JEHOVA bụ Isi Iyi nke amụma mbụ e detutụworo edetu. Mgbe Adam na Iv mehiesịrị, Chineke gwara agwọ ahụ, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:1–7, 14, 15) Ọ ga-ewe ọtụtụ narị afọ tupu a ghọtazuo okwu amụma ndị ahụ.

2 Amụma mbụ ahụ mere ka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie nwee ezi olileanya. Akwụkwọ Nsọ mesịrị kọwaa Setan Ekwensu dị ka “agwọ ochie ahụ.” (Mkpughe 12:9) Ma ònye ga-abụ Mkpụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa?

Ịchọ Mkpụrụ Ahụ

3. Olee otú Ebel si gosipụta okwukwe n’amụma mbụ ahụ?

3 N’adịghị ka nna ya, Ebel bụ́ onye na-asọpụrụ Chineke gosipụtara okwukwe n’amụma mbụ ahụ. Ihe àmà na-egosi na Ebel ghọtara na ịwụsị ọbara ga-adị mkpa iji kpuchie mmehie. Ya mere, okwukwe kpaliri ya ịchụ àjà anụmanụ bụ́ nke Chineke nabatara. (Jenesis 4:2-4) Ma, Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nọgidere bụrụ ihe a na-amaghị ama.

4. Nkwa dị aṅaa ka Chineke kwere Abraham, gịnịkwa ka ọ na-egosi banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?

4 Ihe dị ka afọ 2,000 mgbe oge Ebel gasịrị, Jehova kwere nna ochie ahụ bụ́ Abraham nkwa a e buru n’amụma: “N’ịgọzi M ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba M ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe . . . ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:17, 18) Okwu ndị ahụ na-egosi na Abraham ga-ekere òkè ná mmezu nke amụma mbụ ahụ. Ha gosiri na Mkpụrụ ahụ bụ́ onye a ga-esi n’aka ya bibie ọrụ nile nke Setan ga-esite n’usoro ọmụmụ Abraham. (1 Jọn 3:8) “[Abraham ejighịkwa] ekweghị ekwe nwee obi abụọ n’ebe nkwa Chineke dị,” ndị àmà nke Jehova tupu oge ndị Kraịst bụ́ ndị ‘na-anataghị nkwa ahụ,’ emeghịkwa otú ahụ. (Ndị Rom 4:20, 21; Ndị Hibru 11:39) Kama nke ahụ, ha nọgidere na-enwe okwukwe n’okwu amụma Chineke.

5. Nkwa Chineke banyere Mkpụrụ ahụ mezuru n’ebe ònye nọ, gịnịkwa mere i ji zaa otú ahụ?

5 Pọl onyeozi kọwara Mkpụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa mgbe o dere, sị: “Ọ bụ Abraham ka e kwere nkwa ndị a, ya na Mkpụrụ ya. Ọ sịghị, Ná mkpụrụ, dị ka Ọ na-ekwu okwu banyere ọtụtụ, kama dị ka Ọ na-ekwu okwu banyere otu Onye, Ọ sị, Ná Mkpụrụ gị, Nke bụ́ Kraịst.” (Ndị Galetia 3:16) Mkpụrụ ahụ mba nile ga-esi n’aka ya gọzie onwe ha agụnyeghị ụmụ nile nke Abraham. E siteghị n’aka ụmụ ndị nwa ya bụ́ Ishmael mụtara na ụmụ ya ndị Ketura mụtara, gọzie ihe a kpọrọ mmadụ. Mkpụrụ ngọzi ahụ sitere n’eriri nwa ya bụ́ Aịsak na nwa nwa ya bụ́ Jekọb. (Jenesis 21:12; 25:23, 31-34; 27:18-29, 37; 28:14) Jekọb gosiri na “ndị dị iche iche” ga-aṅa Shaịlo nke ebo Juda ntị, ma Mkpụrụ ahụ mesịrị si n’usoro ọmụmụ Devid pụta. (Jenesis 49:10; 2 Samuel 7:12-16) Ndị Juu nke narị afọ mbụ tụrụ anya na otu onye ga-abịa dị ka Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst. (Jọn 7:41, 42) Amụma Chineke banyere Mkpụrụ ahụ mezukwara n’ebe Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ.

Mesaịa ahụ Apụta!

6. (a) Olee otú anyị ga-esi aghọta amụma nke izu 70 ahụ? (b) Olee mgbe Jisọs ‘mere ka mmehie gwụsịa,’ ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

6 Onye amụma bụ́ Daniel dekọrọ otu amụma dị mkpa banyere Mesaịa ahụ. N’afọ mbụ nke Daraịọs onye Midia, ọ ghọtara na afọ 70 nke ịtọgbọrọ n’efu Jerusalem eruwela ọgwụgwụ ya. (Jeremaịa 29:10; Daniel 9:1-4) Ka Daniel na-ekpe ekpere, mmụọ ozi Gebriel bịara ma kpughee na ‘e kpebiwo izu iri asaa ime ka mmehie gwụsịa.’ A ga-ebipụ Mesaịa ahụ n’etiti izu nke 70 ahụ. “Izu iri asaa nke afọ” malitere na 455 T.O.A. mgbe Eze Ataksakses nke Mbụ nke Peasia ‘zipụrụ ozi ka e wughachi Jerusalem.’ (Daniel 9:20-27; Moffatt; Nehemaịa 2:1-8) Mesaịa ahụ ga-abịa mgbe izu 7 nakwa izu 62 gasịrị. Afọ 483 a malitere site na 455 T.O.A. ruo 29 O.A., bụ́ mgbe e mere Jisọs baptism, Chineke eteekwa ya mmanụ dị ka Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst. (Luk 3:21, 22) Jisọs ‘mere ka mmehie gwụsịa’ site n’inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta na 33 O.A. (Mak 10:45) Lee ezi ihe mere anyị ga-eji nwee okwukwe n’okwu amụma Chineke nke ahụ bụ!a

7. N’iji Akwụkwọ Nsọ mee ihe, gosi otú Jisọs si mezuo amụma e buru banyere Mesaịa.

7 Inwe okwukwe n’okwu amụma Chineke na-eme ka o kwe anyị omume ịmata Mesaịa ahụ. N’ime ọtụtụ amụma ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaịa ahụ, ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ji ọtụtụ n’ime ha mee ihe n’ebe Jisọs nọ kpọmkwem. Iji maa atụ: Ọ bụ nwanyị na-amaghị nwoke mụrụ Jisọs na Betlehem. (Aịsaịa 7:14; Maịka 5:2; Matiu 1:18-23; Luk 2:4-11) E si n’Ijipt kpọpụta ya, e gbukwara ụmụntakịrị mgbe a mụsịrị ya. (Jeremaịa 31:15; Hosea 11:1; Matiu 2:13-18) Jisọs bupụrụ ọrịa anyị dị iche iche. (Aịsaịa 53:4; Matiu 8:16, 17) Dị ka e buru n’amụma, ọ nọkwasịrị n’elu nwa ịnyịnya ibu banye Jerusalem. (Zekaraịa 9:9; Jọn 12:12-15) Okwu ọbụ abụ ahụ mezuru mgbe a kpọgbusịrị Jisọs, mgbe ndị agha kerịtara uwe ya n’etiti onwe ha ma fee nza maka uwe ime ya. (Abụ Ọma 22:18; Jọn 19:23, 24) Eziokwu ahụ bụ́ na a gbajighị ọkpụkpụ Jisọs nakwa na a mapuru ya ahụ, mezukwara amụma. (Abụ Ọma 34:20; Zekaraịa 12:10; Jọn 19:33-37) Ndị a bụ nanị ihe atụ ole na ole nke amụma banyere Mesaịa ahụ bụ́ ndị ndị ji ike mmụọ nsọ Chineke dee Bible ji mee ihe n’ebe Jisọs nọ.b

Kelee Eze Mesaịa Ahụ!

8. Ònye bụ Onye Ochie ahụ, oleekwa otú e si mezuo amụma ahụ e dekọrọ na Daniel 7:9-14?

8 N’afọ mbụ nke Eze Belshaza nke Babilọn, Jehova mere ka onye amụma ya bụ́ Daniel rọọ nrọ ma hụ ọhụụ ndị dị ịrịba ama. Onye amụma ahụ bu ụzọ hụ anụ anọ dị ukwuu. Mmụọ ozi Chineke kọwara ha dị ka “eze anọ,” si otú ahụ na-egosi na ha nọchiri anya ike ụwa anọ ndị chịworonụ. (Daniel 7:1-8, 17) Mgbe nke a gasịrị, Daniel hụrụ Jehova, bụ́ “Onye ochie ahụ,” ka ọ nọkwasịrị n’ocheeze n’ụzọ dị ebube. N’ịma anụ ndị ahụ ikpe, ọ napụrụ ha ọchịchị ma bibie anụ nke anọ ahụ. E nyeziri “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” ịchịisi na-adịgide adịgide n’ebe “ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche” nọ. (Daniel 7:9-14) Lee amụma dị egwu nke a bụ nke metụtara nnọkwasị “Nwa nke mmadụ,” bụ́ Jisọs Kraịst, nọkwasịrị n’ocheeze n’eluigwe n’afọ 1914!—Matiu 16:13.

9, 10. (a) Gịnị ka akụkụ dị iche iche nke ihe oyiyi ahụ a rọrọ ná nrọ na-ezo aka na ha? (b) Olee otú ị ga-esi akọwa mmezu nke Daniel 2:44?

9 Daniel maara na Chineke “na-ewezụga ndị eze, na-emekwa ka ndị eze bilie.” (Daniel 2:21) Site n’inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ, bụ́ “[Onye] na-ekpughe ihe nzuzo nile,” onye amụma ahụ kpughere ihe nrọ Eze Nebukadneza nke Babilọn banyere nnukwu ihe oyiyi, pụtara. Akụkụ ya dị iche iche na-ezo aka ná mbili na ọdịda nke ike ọchịchị ụwa ndị dị ka Babilọn, Midia na Peasia, Gris, na Rom. Chineke jikwa Daniel mee ihe ikwupụta ihe omume ụwa rute n’oge anyị ma gabiga ya.—Daniel 2:24-30.

10 “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a,” ka amụma ahụ kwuru, “ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị na 1914, Chineke guzobere Alaeze eluigwe nke Kraịst na-achị. (Luk 21:24; Mkpughe 12:1-5) Mgbe ahụ, site n’ike Chineke, e si ‘n’oké ugwu’ nke ọbụbụeze eluigwe na ụwa nke Chineke wapụta “nkume” Alaeze Mesaịa ahụ. N’Amagedọn, nkume ahụ ga-adakwasị ihe oyiyi ahụ ma gwerie ya. Dị ka ugwu ọchịchị nke na-emetụta “ụwa nke a nile,” Alaeze Mesaịa ahụ ga-adịru ebighị ebi.—Daniel 2:35, 45; Mkpughe 16:14, 16.c

11. Gịnị ka nnwogha Jisọs mere ka a hụpere, mmetụta dịkwa aṅaa ka ọhụụ ahụ nwere n’ahụ Pita?

11 N’iburu ọchịchị Alaeze ya n’uche, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ụfọdụ dị n’etiti ndị guzoro n’ebe a, ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’alaeze Ya.” (Matiu 16:28) Ụbọchị isii mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, Jemes, na Jọn gaa n’ugwu dị elu bụ́ ebe a nọ nwoghaa ya n’ihu ha. Ka igwe ojii na-enwu enwu kpuchiri ndị ozi ahụ, Chineke kwupụtara, sị: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma, nụrụnụ okwu Ya.” (Matiu 17:1-9; Mak 9:1-9) Lee ka nke a si bụrụ ịhụpere ebube Alaeze Kraịst! Ka a sịkwa ihe mere Pita ji zoo aka n’ọhụụ ahụ na-akpali akpali ma sị: “E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị.”—2 Pita 1:16–19.d

12. N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ oge igosipụta okwukwe anyị n’okwu amụma Chineke karịsịa?

12 O doro anya na “okwu amụma” ahụ agụnyeghị nanị amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaịa ahụ kamakwa ọ gụnyere okwu Jisọs bụ́ na ya ga-abịa “n’ike na oké ebube.” (Matiu 24:30) Nnwogha ahụ kwadoro okwu amụma ahụ banyere ọbịbịa dị ebube nke Kraịst ga-abịa n’ike Alaeze. N’oge na-adịghị nnọọ anya, mkpughe a ga-ekpughe ya n’ebube ga-ewetara ndị na-enweghị okwukwe mbibi ma wetara ndị na-egosipụta okwukwe ngọzi. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10) Mmezu nke amụma Bible na-egosipụta na ugbu a bụ “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5, 16, 17; Matiu 24:3-14) Dị ka Onye Bụ́ Isi Na-emezu Ihe Jehova Kpere n’Ikpe, Maịkael, bụ́ Jisọs Kraịst, dị njikere iweta ajọ usoro ihe a ná njedebe n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ. (Matiu 24:21; Daniel 12:1) N’ezie, ugbu a bụzi oge igosipụta na anyị nwere okwukwe n’okwu amụma Chineke.

Nọgide Na-enwe Okwukwe n’Okwu Amụma Chineke

13. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-ahụ Chineke n’anya ma mee ka anyị nọgide na-enwe okwukwe n’okwu ya?

13 N’ezie anyị nwere mkpali mgbe mbụ anyị mụtara banyere mmezu nke okwu amụma Chineke. Ma okwukwe anyị ò belatawo kemgbe ahụ, ịhụnanya anyị ajụọkwa oyi? Ka anyị ghara ịdị ka ndị Kraịst nọ n’Efesọs ma ọlị bụ́ ndị ‘hapụrụ ịhụnanya ahụ ha nwere na mbụ.’ (Mkpughe 2:1-4) N’agbanyeghị otú oge anyị jewooro Jehova ozi haruru, anyị pụrụ inwe mfu dị otú ahụ ọ gwụla ma anyị ‘bu ụzọ na-achọ alaeze Chineke, na ezi omume Ya’ iji kpakọba akụ̀ n’eluigwe. (Matiu 6:19-21, 31-33) Ịdị uchu n’ịmụ Bible, ikerechi òkè anya ná nzukọ ndị Kraịst, na iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze, ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ahụ Jehova, Ọkpara ya, na Akwụkwọ Nsọ n’anya. (Abụ Ọma 119:105; Mak 13:10; Ndị Hibru 10:24, 25) N’aka nke ya, nke a ga-eme ka anyị nọgide na-enwe okwukwe n’okwu Chineke.—Abụ Ọma 106:12.

14. Olee otú e si akwụghachi ndị Kraịst e tere mmanụ ụgwọ ọrụ maka okwukwe ha nwere n’okwu amụma Jehova?

14 Dị nnọọ ka e si mezuo okwu amụma Chineke n’oge gara aga, otú ahụ ka anyị pụrụ isi nwee okwukwe n’ihe ọ na-ebu n’amụma banyere ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, Kraịst anọrọla ugbu a n’ebube Alaeze, ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ahụwokwa mmezu nke nkwa ahụ e buru n’amụma, bụ́: “Onye na-emeri emeri, ya ka M ga-ekwenye ka o rie mkpụrụ si n’osisi nke ndụ ahụ pụta, bụ́ nke dị na Paradaịs nke Chineke.” (Mkpughe 2:7, 10; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:14-17) Jisọs na-enye ndị a meriri emeri ihe ùgwù nke ‘iri mkpụrụ si n’osisi nke ndụ ahụ pụta’ na “paradaịs [eluigwe] nke Chineke.” Ná mbilite n’ọnwụ ha, sitekwa n’aka Jisọs Kraịst, ha na-eketa anwụghị anwụ na ereghị ure nke Jehova, bụ́ “Eze nke mgbe nile, Nke a na-apụghị imebi emebi, Nke a na-apụghị ịhụ anya, Onye nanị Ya bụ Chineke,” na-enye. (1 Timoti 1:17; 1 Ndị Kọrint 15:50-54; 2 Timoti 1:10) Lee ụgwọ ọrụ dị egwu nke a bụ maka ịhụnanya na-adịghị akwụsị akwụsị ha nwere n’ebe Chineke nọ na okwukwe na-adịghị ada ada ha nwere n’okwu amụma ya!

15. Ọ̀ bụ n’ime ole ndị ka a tọrọ ntọala “ụwa ọhụrụ” ahụ, ole ndị bụkwa ndị enyi ha?

15 N’oge na-adịghị anya mgbe a kpọlitesịrị ndị e tere mmanụ nwụrụ anwụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi gaa na “paradaịs [eluigwe] nke Chineke,” a tọhapụrụ ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ nọ n’ụwa site na “Babilọn ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 14:8; Ndị Galetia 6:16) Ọ bụ n’ime ha ka a tọrọ ntọala nke “ụwa ọhụrụ” ahụ. (Mkpughe 21:1) E si otú a weta “ala,” e wulitekwara ya ịghọ paradaịs ime mmụọ nke zuru ụwa nile taa. (Aịsaịa 66:8) Ìgwè mmadụ ndị yiri atụrụ bụ́ ndị enyi nke Israel ime mmụọ ahụ na-enuba n’ime ya ugbu a, “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.”—Aịsaịa 2:2-4; Zekaraịa 8:23; Jọn 10:16; Mkpughe 7:9.

E Buo Ọdịnihu Ihe A Kpọrọ Mmadụ n’Amụma n’Okwu Amụma Chineke

16. Gịnị bụ atụmanya nke ndị ji iguzosi ike n’ihe na-akwado ndị e tere mmanụ?

16 Gịnị bụ atụmanya nke ndị ji iguzosi ike n’ihe na-akwado ndị e tere mmanụ? Ha onwe ha kwa nwere okwukwe n’okwu amụma Chineke, ha nwekwara olileanya ịbanye na Paradaịs elu ala. (Luk 23:39-43) N’ebe ahụ, ha ga-aṅụ mmiri na-akwado ndụ sitere ‘n’osimiri nke mmiri nke ndụ,’ ha ga-enwetakwa ọgwụgwọ site ‘n’akwụkwọ osisi’ ndị a kụrụ n’akụkụ ya. (Mkpughe 22:1, 2) Ọ bụrụ na i nwere olileanya dị ebube otú ahụ, nọgide na-egosipụta ịhụnanya miri emi n’ebe Jehova nọ na okwukwe n’okwu amụma ya. Soro n’ime ndị ga-enwe ọṅụ a na-akparaghị ókè nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs elu ala.

17. Ndụ n’elu ala Paradaịs ga-agụnye ngọzi ndị dị aṅaa?

17 Mmadụ ndị na-ezughị okè enweghị ike ịkọwazu ndụ a ga-adị na Paradaịs elu ala na-abịanụ, ma okwu amụma Chineke na-eme ka anyị ghọta ngọzi ndị na-echere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi mgbe ahụ. Mgbe Alaeze Chineke ga-achị n’enweghị ihe ịma aka, e meekwa uche ya n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe, a gaghị enwe ụmụ mmadụ obi tara mmiri—ee e, a gaghị enwe ọbụna ụmụ anụmanụ—ndị ‘ga-eme ihe ọjọọ ma ọ bụ bibie ihe.’ (Aịsaịa 11:9; Matiu 6:9, 10) Ndị dị umeala n’obi ga-ebi n’elu ala, “ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) A gaghị enwe ìgwè mmadụ na-anọ agụụ, n’ihi na “ọtụtụ ọka [ga-adị] n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) A gaghịzi enwe anya mmiri nke iru újú. Ọrịa agaghị adịkwa, ọbụna ọnwụ agaghịzi adị. (Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:4) Chetụdị n’echiche—ndị dọkịta agaghị adị, ọgwụ agaghị adị, ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ebe a na-agwọ ọrịa uche agaghị adị, a gaghị enwe olili ozu. Lee atụmanya magburu onwe ha ha bụ!

18. (a) Gịnị ka e mesiri Daniel obi ike banyere ya? (b) Gịnị ga-abụ “ebe e keworo nye” Daniel?

18 Ọbụna ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-atọgbọrọ chakoo ka mbilite n’ọnwụ nọchiziri anya ọnwụ. Nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job nwere olileanya dị otú ahụ. (Job 14:14, 15) Otú ahụ ka onye amụma bụ́ Daniel nwere, n’ihi na mmụọ ozi Jehova nyere ya ihe mmesi obi ike, bụ́: “Gị onwe gị, laa, ruo ọgwụgwụ ihe ndị a: ị ga-ezukwa ike, guzo ọtọ n’ebe e keworo nye gị, n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a.” (Daniel 12:13) Daniel jeere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ ndụ ya. Ugbu a ọ na-ezu ike n’ọnwụ, ma ọ ‘ga-eguzo ọtọ’ ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume” n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst. (Luk 14:14) Gịnị ga-abụ “ebe e keworo nye” Daniel? Ná mmezu ya na Paradaịs, amụma Ezikiel na-enye echiche na ndị Jehova nile ga-enwe ọnọdụ, ọbụna a ga-eke ala n’eleghị mmadụ anya n’ihu nakwa n’ụzọ dị n’usoro. (Ezikiel 47:13–48:35) Ya mere Daniel ga-enwe ọnọdụ n’ime Paradaịs, ma ebe e keworo nye ya n’ebe ahụ ga-agụnye ihe karịrị ala. Ọ ga-agụnye ọnọdụ ya ná nzube Jehova.

19. Gịnị ka a chọrọ iji dịrị ndụ na Paradaịs elu ala?

19 Gịnị banyere gị na ebe e kenyere gị? Ọ bụrụ na i nwere okwukwe n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, o yikarịrị ka ị ga-achọsi ike ịdị ndụ na Paradaịs elu ala ahụ. Ọbụna ị pụrụ iji anya nke uche gị hụ onwe gị n’ebe ahụ, ka ị na-anụ ụtọ ọtụtụ ngọzi ya, na-elekọta elu ala, ma jiri ọṅụ na-anabataghachi ndị nwụrụ anwụ. E kwuwerị, Paradaịs bụ ebe kwesịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Chineke kere mmadụ abụọ mbụ ahụ ibi n’ụdị ebe ahụ. (Jenesis 2:7-9) Ọ chọkwara ka ụmụ mmadụ na-erube isi biri na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ị̀ ga-akpa àgwà n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ ka i wee nwee ike iso n’ime ọtụtụ ijeri mmadụ ndị ga-emesị biri n’ụwa Paradaịs? Ị pụrụ ịnọ n’ebe ahụ ma ọ bụrụhaala na i nwere ezi ịhụnanya n’ebe Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova nọ, nweekwa okwukwe na-adịgide adịgide n’okwu amụma Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! nakwa “Izu Iri Asaa” n’Insight on the Scriptures, ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Lee “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” peji nke 343-344, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

c Lee isi nke 4 na 9 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!

d Lee isiokwu bụ́ “Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke,” nke pụtara n’Ụlọ Nche nke April 1, 2000.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee amụma mbụ e buru, ònyekwa bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?

• Olee amụma ụfọdụ e buru banyere Mesaịa nke mezuru n’ebe Jisọs nọ?

• Olee otú a ga-esi emezu Daniel 2:44, 45?

• Ọdịnihu dị aṅaa maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ka okwu amụma Chineke na-ezo aka na ya?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ì nwere olileanya ịdị ndụ na Paradaịs elu ala?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya