Ị̀ Maara Otú E Si Echere Ihe?
Ị̀ PỤRỤ ichetụ n’echiche aha oge ndị mmadụ na-etinye kwa afọ nanị n’ichere ihe? Ha na-akwụ n’ahịrị na-echere n’ụlọ ahịa ma ọ bụ n’ọdụ mmanụ ụgbọala. Ha na-echere ka e nye ha ihe oriri n’ụlọ nri. Ha na-echere iji hụ dọkịta. Ha na-echere bọs na ụgbọ okporo ígwè. Ee, mmadụ na-etinye aha oge dị ịtụnanya nke ndụ ya n’iche ka ihe mee. Dị ka otu atụmatụ e mere si dị, ndị Germany nanị na-etufu ijeri awa 4.7 kwa afọ nanị n’ichere n’ebe e nwere ọnọdụ agaghị ihu agaghị azụ nke ụgbọala! Otu onye gụkọtara na nke a hà ka ngụkọta nke afọ ndụ mmadụ 7,000 ga-adịru.
Ichere ihe pụrụ nnọọ ịdị na-eweta nkụda mmụọ. N’oge ndị a, ọ dịghị eyitụdị ka è nwere oge zuru ezu ime ihe nile, iche echiche banyere ihe ndị ahụ anyị kwesịrị ịdị na-eme pụkwara ime ka ichere ihe ghọọ nnọọ ule. Onye edemede bụ́ Alexander Rose kwuru n’otu oge, sị: “Ọkara nke oké ihe mgbu mmadụ na-enwe ná ndụ bụ ichere ihe.”
Onye America ọnụ na-eru n’okwu bụ́ Benjamin Franklin ghọtara na ichere ihe pụkwara ịdị na-efu ihe. Ihe karịrị afọ 250 gara aga, o kwuru, sị: “Oge bụ ego.” Ọ bụ ya mere ụlọ ọrụ achụmnta ego dị iche iche ji achọ ụzọ ndị ha ga-esi zere igbu oge na-enweghị isi n’oge ọrụ. Ngwá ahịa ka ukwuu e mepụtara n’oge ka nta pụrụ iweta uru ka ukwuu. Ụlọ ọrụ achụmnta ego ndị na-ejere ọha na eze ozi na-agbalị imere ha ihe ngwa ngwa—nri onye ọ dị ngwa, ụlọ akụ̀ ndị ọ dị ngwa, na ihe ndị yiri ha—n’ihi na ha maara na ime ka onye ahịa nwee obi ụtọ na-agụnye ibelata oge o ji na-echere.
Imefusị Oge Ndụ Anyị
Onye America na-ede uri nke narị afọ nke 19 bụ́ Ralph Waldo Emerson mere mkpesa n’otu oge, sị: “Lee akụkụ dị ukwuu nke ndụ mmadụ a na-etufu n’ichere ihe!” N’oge na-adịbeghị nnọọ anya, onye na-ede akwụkwọ bụ́ Lance Morrow mere mkpesa banyere ike ọgwụgwụ na ntakasị ahụ nke ichere ihe. Ma mgbe ahụ, o kwuru banyere “nhụsianya na-apụtachaghị ìhè nke ichere ihe.” Gịnị ka nke ahụ bụ? “Ịmara na a na-ezuru akụ̀ kasị oké ọnụ ahịa nke mmadụ, bụ́ oge, nke bụkwa akụkụ nke ndụ mmadụ, na ọ na-efu mie ala.” Ọ dị mwute, ma ọ bụ eziokwu. Oge e tufuru n’ichere ihe efunyụọla anya.
N’ezie, ọ bụrụ na ndụ adịghị nnọọ nkenke, ichere ihe agachaghị abụ ihe na-akpata nchegbu. Ma ndụ dị nkenke. Ọtụtụ puku afọ gara aga, ọbụ abụ nke Bible kwuru, sị: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri afọ asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri afọ asatọ], otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe; n’ihi na ọ gbapụwo ọsọ ọsọ, anyị wee felaa dị ka nnụnụ.” (Abụ Ọma 90:10) Ebe ọ sọrọ anyị biri, onye ọ sọkwara anyị bụrụ, ndụ anyị—ụbọchị, awa, minit ndị dị n’ihu anyị mgbe a mụrụ anyị—bụ́ nke a kpaara ókè. Ma, anyị apụghị izere ọnọdụ ndị a na-amanye anyị igbu ụfọdụ n’ime oge ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa n’ichere ihe ma ọ bụ ndị mmadụ na ha.
Ịmụta Otú E Si Echere Ihe
Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị anọtụwo n’ụgbọala nke onye na-akwọ ya nọgidere na-anwa ịgafe ụgbọala nọ ya n’ihu. Mgbe mgbe, a dịghị enwe mkpa chọrọ ka e gboo ya ngwa ngwa—ọkwọ ụgbọala ahụ adịghị enwe onye ya na ya yiri oge nke ọ chọrọ ịhụ ngwa ngwa. Ma, ọ pụghị ịnagide ịbụ onye ọkwọ ụgbọala ọzọ na-achịkwa otú ọ ga-esi na-agba ọsọ. Enweghị ndidi ya na-egosipụta na ọ mụtabeghị otú e si echere ihe. À na-amụta ya amụta? Ee, ịmara otú e si echere ihe bụ ihe a na-aghaghị ịmụta amụta. Ọ dịghị onye bu ya pụta ụwa. Ụmụ ọhụrụ na-achọ ka e lebara ha anya ozugbo mgbe agụụ na-agụ ha ma ọ bụ mgbe ha na-enwe ntakasị ahụ. Ọ bụ nanị mgbe ha na-etolite ka ha na-aghọta na mgbe ụfọdụ ha aghaghị ichere iji nweta ihe ha chọrọ. N’ezie, ebe ọ bụ na ichere ihe bụ akụkụ a na-apụghị izere ezere nke ndụ, ịmara otú e si eji ndidi echere ihe mgbe ọ dị mkpa bụ ihe e ji ama onye tozuru okè.
N’ezie, e nwere ọnọdụ ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa bụ́ mgbe ihe mere mmadụ na-ejighị nwee ndidi na-ekwe nghọta. Di na-akatabeghị ahụ nke na-akwọga nwunye ya n’ụlọ ọgwụ n’ihi na ime na-eme ya, ga-ezi ezi ma ọ bụrụ na o nweghị ndidi banyere igbu oge. Ndị mmụọ ozi ahụ na-agba Lọt ume ịhapụ Sọdọm adịghị njikere ichere mgbe Lọt na-egbu oge. Mbibi na-achọ ịbịa, ndụ Lọt na ezinụlọ ya dịkwa n’ihe ize ndụ. (Jenesis 19:15, 16) Otú ọ dị, n’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ, ndụ adịghị adị n’ihe ize ndụ mgbe a na-amanye ndị mmadụ ichere. N’ọnọdụ ndị ahụ, ihe pụrụ ịka nnọọ mma ma ọ bụrụ na mmadụ nile amụta inwe ndidi—ọbụna ma a sị na ọ bụ enweghị nkà ma ọ bụ enweghị mmasị nke onye ọzọ kpatara nchere ahụ. Ọzọkwa, inwe ndidi ga-aka mfe ma ọ bụrụ na onye ọ bụla amụta otú e si eji oge e ji na-echere ihe eme ihe n’ụzọ bara uru. Igbe dị na peeji nke 5 nwere aro ụfọdụ banyere ime ka ichere ihe bụrụ ọ bụghị nanị ihe a ga-anagideli kama ọbụna ihe ga-aba uru.
A pụghị ileghara ya anya na àgwà nke enweghị ndidi pụrụ igosipụta omume nganga, inwe mmetụta na mmadụ dịbigara mkpa ókè ịbụ onye a ga-eme ka o chere. O kwesịrị ekwesị ka onye ọ bụla nwere àgwà dị otú ahụ tụlee okwu ndị na-esonụ bụ́ ndị sitere na Bible: “Ọ dị mma, bụ́ onye mmụọ ya nwere ogologo ntachi obi, karịa onye mmụọ ya dị elu.” (Eklisiastis 7:8) Mpako, ma ọ bụ nganga, bụ ntụpọ jọgburu onwe ha n’àgwà mmadụ, ilu Bible na-ekwukwa, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu.” (Ilu 16:5) Ya mere, ịmụta inwe ndidi—ịmụta otú e si echere ihe—pụrụ ịchọ ka anyị nyochaa onwe anyị nakwa mmekọrịta anyị na ndị nọ anyị gburugburu, nke ọma.
A Ga-akwụghachi Inwe Ndidi Ụgwọ
Anyị na-ahụkarị na ọ na-aka adịrị anyị mfe ichere ihe ma ọ bụrụ na anyị ekwenyesie ike na ihe anyị na-echere kwesịrị oge ndị anyị na-egbu nakwa na ọ ga-emesị bịa. Banyere nke a, ọ dị mma ịtụgharị uche n’eziokwu ahụ bụ́ na ndị nile ji ezi obi efe Chineke na-echere mmezu nke nkwa ya ndị dị ebube bụ́ ndị a na-achọta na Bible. Dị ka ihe atụ, a na-agwa anyị n’abụ ọma a bụrụ n’ike mmụọ nsọ Chineke, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Jọn onyeozi kwughachiri nkwa a mgbe o kwuru, sị: “Onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29; 1 Jọn 2:17) N’ụzọ doro anya, ọ bụrụ na anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi, ichere ihe agaghị abụ oké nsogbu. Ma anyị anaghị adị ndụ ebighị ebi kpọmkwem ugbu a. Ọ̀ bụdị ihe ezi uche dị na ya ikwu banyere ndụ ebighị ebi?
Tupu anyị azaa ajụjụ ahụ, cheta na Chineke kere nne na nna anyị mbụ inwe atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ bụ nanị n’ihi na ha mehiere mere atụmanya ahụ ji funahụ ma ha ma ụmụ ha—gụnyere anyị onwe anyị. Otú ọ dị, ozugbo ha mehiesịrị, Chineke kwupụtara nzube ya iwepụ ihe nnupụisi ha kpatara. O kwere nkwa maka ọbịbịa nke “mkpụrụ,” bụ́ onye mesịrị bụrụ Jisọs Kraịst.—Jenesis 3:15; Ndị Rom 5:18.
Ọ bụ anyị n’otu n’otu ka ọ dịịrị ikpebi ma ànyị ga-erite uru site ná mmezu nke nkwa ya. Ọ ga-achọ inwe ndidi iji mee nke ahụ. Iji nyere anyị aka ịmụta inwe ụdị ndidi a, Bible na-agba anyị ume ịtụgharị uche n’ihe atụ nke onye ọrụ ugbo. Ọ na-akụ mkpụrụ ya, o nweghịkwa ihe ọzọ ọ ga-eme karịa iji ndidi chere—na-eme ihe o nwere ike ime iji chekwaa ihe ọ kụrụ—ruo mgbe oge iwe ihe ubi ga-eru. Mgbe ahụ, a na-akwụghachi ndidi o nwere ụgwọ, ọ na-ahụkwa ihe si n’ọrụ ya pụta. (Jemes 5:7) Pọl onyeozi na-ehota ihe atụ ọzọ banyere ndidi. Ọ na-echetara anyị banyere ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie. Ha nọ na-elepụ anya ịhụ mmezu nke nzube Chineke, ma ha aghaghị ichere maka oge Chineke kara aka. Pọl na-agba anyị ume iṅomi ndị a, bụ́ “ndị ji okwukwe na ogologo ntachi obi na-eketa nkwa ahụ.”—Ndị Hibru 6:11, 12.
Ee, ichere ihe bụ ihe a na-apụghị izere ezere ná ndụ. Ma o kwesịghị ịnọgide na-abụ ihe na-ewetara anyị obi erughị ala. Ọ ga-abụrụ ndị na-echere mmezu nke nkwa Chineke ihe na-enye ọṅụ. Ha pụrụ iji oge ndị ahụ ha na-echere mee ihe site n’ịzụlite mmekọrịta chiri anya n’etiti ha na Chineke na n’ịrụ ọrụ ndị na-egosipụta na ha nwere okwukwe. Sitekwa n’ekpere, ọmụmụ ihe, na ntụgharị uche, ha pụrụ ịzụlite obi ike na-adịghị ada ada na ihe ọ bụla Chineke kweworo ná nkwa ga-emezu n’oge ọ kara aka.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 5]
BELATA OKÉ IHE MGBU NKE ICHERE IHE!
Buru ụzọ mee atụmatụ! Ọ bụrụ na ị maara na ị ghaghị ichere, dị njikere ịgụ ihe, ide ihe, ịkpa ihe, ịdụ ihe, ma ọ bụ ime ụfọdụ ihe ndị ọzọ bara uru.
Jiri oge ahụ tụgharịa uche, bụ́ ihe na-esiwanye nnọọ ike omume n’ụwa anyị a nke ndụ gbalụ gbalụ.
Debe akwụkwọ ọgụgụ ụfọdụ nso n’akụkụ telifon ma ọ bụrụ na a sịri gị jide fon ma cheretụ; ị pụrụ iji minit ise ma ọ bụ iri gụọ ọtụtụ peeji.
Mgbe unu dị ọtụtụ na-echere, jiri ohere ahụ mee ihe, ma ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, n’iso ndị ọzọ kwurịta okwu na isoro ha kerịta echiche ndị na-ewuli elu.
Debe akwụkwọ ndekọ ihe ma ọ bụ akwụkwo ọgụgụ n’ime ụgbọala gị maka oge ị ga-echere ihe ndị ị na-atụghị anya iche.
Mechie anya gị, tụsara ahụ, ma ọ bụ kpee ekpere.
N’ỤZỌ BỤ́ ISI, ICHERE IHE N’ỤZỌ GARA NKE ỌMA NA-ADABERE N’OMUME NA N’ICHEPỤ ECHICHE N’IHU.