Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 5/1 p. 19
  • E Wepụ Aha Chineke n’Ụta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Wepụ Aha Chineke n’Ụta
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Mụ na Onye Nkụzi Anyị Ga-esi Na-adị ná Mma?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ọ Rụzuru Ihe Karịrị Ihe Ọ Tụrụ Anya Ya
    Teta!—2003
  • A Gọzie Ụmụ Akwụkwọ Nigeria Maka Ikwesị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ndị Nkụzi—Gịnị Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa?
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 5/1 p. 19

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

E Wepụ Aha Chineke n’Ụta

OKWU Chineke, bụ́ Bible, na-ekwu, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.” (1 Pita 2:12) Ya mere, ezi ndị Kraịst na-agbalịsi ike ibi obi nke ọma iji zere iwetara aha Jehova nkọcha.

N’otu ógbè Zambia dịpụrụ adịpụ a na-akpọ Senanga, e zuuru redio otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ n’ụlọ ya. Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova anọwo na-eme nkwusa n’ógbè ahụ, nwoke ahụ boro ha ohi ahụ. Ọ kọọrọ ndị uwe ojii banyere ya, na-ekwu na ọ bụ Ndịàmà zuuru redio ya. Dị ka ihe akaebe iji gosi na Ndịàmà bịara n’ụlọ ya, o wepụtara otu traktị ọ hụrụ n’ala ụlọ. Otú ọ dị, ndị uwe ojii ekwenyeghịrị ya. Ha dụrụ ya ọdụ ịga mekwuo nchọpụta nke ọma.

Òtù ndị okenye gbara Ndịàmà rụrụ ọrụ n’ógbè onye nkụzi ahụ n’ụbọchị ahụ ume ịgakwuru ya iji kwụrịta banyere ya. Ụfọdụ n’ime ụmụnna ahụ jere gwa ya okwu, na-akọwa na ha chọrọ iwepụ aha Jehova n’ụta. N’oge ha na-ekwurịta okwu, ha gwara ya na ha zutere otu nwa okorobịa n’ụlọ ya ma nye ya otu traktị. Site ná nkọwa ha nyere, onye nkụzi ahụ ghọtara onye nwoke ahụ bụ. N’ezie, ha abụọ nọ n’otu chọọchị. Onye nkụzi ahụ gwara nwa okorobịa ahụ banyere ya, ma ọ gọnahụrụ ebubo ahụ. Mgbe ahụ, onye nkụzi ahụ sooro ndị mụrụ nwa okorobịa ahụ kwụrịta ya ma laghachi n’ebe obibi ya. N’ime otu awa, nne nwa okorobịa ahụ bughachitere redio ahụ e zuru ezu.

Onye nkụzi ahụ ji ịkwa ụta gakwuru òtù ndị okenye ma rịọ mgbaghara maka ebubo ụgha o boro ha. Ndị okenye ahụ nabatara arịrịọ ya ma gwa ya ka e mee ka ọha na eze mara banyere nchọpụta ndị ahụ e mere ka onye ọ bụla wee mara na aka Ndịàmà dị ọcha. A mara ọkwà banyere ya n’ụlọ akwụkwọ ahụ, si otú ahụ wepụ aha Jehova n’ụta. Ndịàmà Jehova pụrụ ịnọgide na-eme nkwusa n’ógbè ahụ n’enweghị ihe mgbochi.

[Maps/Picture on peeji 19]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

AFRICA

Zambia

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya