Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 8/1 p. 18
  • Chineke Ehichapụwo Ya Anya Mmiri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ehichapụwo Ya Anya Mmiri
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-ejere Jehova Ozi Ka Ị Na-elekọta Onye Gị Ahụ́ Na-adịghị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Jehova Nyeere M Aka Imeri Ihe Ịma Aka Ndị Bịaara M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ihe Ga-akwụsị Mkpesa Ndị A Na-emekarị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ihe Isi Ike
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 8/1 p. 18

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Chineke Ehichapụwo Ya Anya Mmiri

A NA-AGỌZI ndị mere ka ndụ ha kwekọọ n’iwu na ụkpụrụ Jehova, n’ụzọ dị ukwuu. Ọ bụ ezie na ime mgbanwe ndị dị mkpa anaghị adị mfe mgbe nile, a na-enweta enyemaka na agbamume ngwa ngwa. (Abụ Ọma 84:11) Ahụmahụ na-esonụ nke si Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia na-akọwa nke a.

Mgbe otu Onyeàmà si France gara ezumike, ọ gwara otu onye nwere ụlọ ahịa nke aha ya bụ́ Kima banyere Jehova na nzube ya maka ụwa. Ọ hapụkwaara Kim otu akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ka Kim na-enyocha akwụkwọ ahụ, ọ hụrụ okwu bụ́, “ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 21:4) “Amaokwu a metụrụ m n’ahụ n’ezie,” ka Kim na-echeta. “Onye hụrụ ka m nọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-akparịta ụka n’ụlọ ahịa n’ụbọchị ahụ nile agaghị ama na ozugbo m ruru ụlọ n’uhuruchi, aga m ebegide ákwá ruo mgbe m hiiri ụra.” N’ikwu ihe na-akpatara ya mwute, ọ na-ekwu, sị: “Mụ na otu nwoke anọwo na-ebi ruo afọ 18, obi adịtụghịkwa m mma n’ihi na ọ jụrụ ịlụ m. Achọrọ m ịkwụsị ụdị ndụ a, ma ebe mụ na ya biworo ogologo oge, obi esighị m ike ime otú ahụ.”

N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, Kim kwetara iso otu n’ime Ndịàmà Jehova aha ya bụ Linh, na-amụ Bible. “Achọsiri m ike itinye ozizi Bible n’ọrụ” ka Kim na-ekwu. “Dị ka ihe atụ, akwụsịrị m ife ndị nna nna m ofufe, ọ bụ ezie na nke a kpatara mmegide site n’aka ezinụlọ m. Ọzọkwa, anwara m ime ka mụ na enyi m nwoke dejupụta akwụkwọ n’ụzọ iwu dị ka di na nwunye, ma ọ jụrụ ime otú ahụ. N’oge a ihe siiri m ike, Onyeàmà ahụ si France nọgidere na-ezitere m mbipụta ndị dabeere na Bible, Linh na-agbakwa m ume nke ukwuu. Ndidi na nkwado ịhụnanya nke ụmụnna nwanyị a, nyeere m aka ịnọgidesi ike ruo mgbe m chọpụtara onye enyi m nwoke bụ n’ezie. Achọpụtara m na ọ lụọlarị ‘nwunye’ 5 mụtakwa ụmụ 25! Nke a mere ka obi sie m ike ịhapụ ya.

“Ịhapụ nnukwu ụlọ dị ntụsara ahụ gaa biri ná ntakịrị ụlọ adịghịrị m mfe. Tụkwasị na nke ahụ, enyi m nwoke mbụ rụgidere m ịbịaghachi ka mụ na ya biri, ọbụna na-eyi m egwu iji acid kwarụọ m ahụ ma ọ bụrụ na mụ ajụ. Site n’enyemaka Jehova, emere m ihe ziri ezi.” Kim nọgidere na-enwe ọganihu, e mesịakwa mee ya baptism n’April 1998. Tụkwasị na nke ahụ, abụọ n’ime ụmụnne ya ndị nwanyị na nwa ya nwoke nọ n’afọ iri na ụma malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible.

“Ana m echebu na ndụ m ga-anọgide bụrụ nke olileanya na-adịghị na ya,” ka Kim na-ekwu. “Otú ọ dị, ana m enwe obi ụtọ taa, anaghịzikwa m ebe ákwá n’abalị. Jehova ehichapụla m rịị anya mmiri n’anya.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ndị ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya