Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 11/15 p. 27
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Olee ihe mere Setan ji jiri agwọ gwa Iv okwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Omume Anyị Nwere Ike Ịkpasu Chineke Iwe—Otú Anyị Nwere Ike Isi Mee Ka Obi Dị Ya Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ndị Ọzọ Dị Elu Karịa Anyị
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 11/15 p. 27

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ogige Iden, olee otú agwọ ahụ si nye Iv echiche imebi iwu Chineke banyere osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ?

Jenesis 3:1 na-asị: “Ma agwọ dị aghụghọ karịa anụ ọhịa ọ bụla nke Jehova, bụ́ Chineke, mererịị. O wee sị nwanyị ahụ, Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” A tụwo arọ dịgasị iche iche banyere otú ọ pụrụ ịbụ na agwọ ahụ si nye Iv ihe ọmụma. Otu echiche bụ na o mere otú ahụ site ná mmegharị ahụ. Dị ka ihe atụ, ụkọchukwu bụ́ onye England bụ́ Joseph Benson, kwuru, sị: “O yikarịrị ka o ji ụdị mmegharị ahụ ụfọdụ mee ihe. N’ezie, ụfọdụ ndị ekwerewo na ikike iche echiche na okwu ọnụ bụ ihe ndị e ji mara agwọ n’oge ahụ, . . . ma e nweghị ihe akaebe banyere nke a.”

Otú ọ dị, site n’iji mmegharị ahụ nkịtị mee ihe, olee otú agwọ ahụ pụrụ isi nye Iv echiche na site n’iri mkpụrụ ahụ a machibidoro iwu na ọ ga-adị ka Chineke, na-enwe ike ikpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ? Ọzọkwa, Iv keere òkè ná mkparịta ụka ahụ, na-aza ajụjụ agwọ ahụ jụrụ. (Jenesis 3:2-5) Echiche bụ́ na agwọ ahụ ji nanị mmegharị ahụ nye ihe ọmụma ga-eduga ná nkwubi okwu bụ́ na Iv ji mmegharị ahụ zaghachi, ebe Bible na-ekwu na Iv kwuru okwu.

N’izo aka n’ihe omume a, Pọl onyeozi dọrọ ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị, sị: “Ana m atụ egwu, ma ò nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu . . . dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.” Ihe ize ndụ Pọl kwuru okwu ya bịara site n’aka “ndị ozi ụgha, ndị ọrụ na-atụ ntụ.” Ihe iyi egwu “ndị ozi [ọkasị mma, NW]” dị otú ahụ kpatara abụghị nanị site ná mmegharị ahụ. Ọ gụnyere okwu ọnụ ha—okwu aghụghọ ha kwuru iji duhie ndị ọzọ.—2 Ndị Kọrint 11:3-5, 13.

Ọ bụ ezie na e ji okwu ọnụ duhie Iv n’ogige Iden, ọ dịghị ihe na-egosi na agwọ nkịtị nwere akwara ụda olu. Ha adịghị ya mkpa n’ezie. Mgbe mmụọ ozi Chineke si n’ọnụ nne ịnyịnya ibu gwa Belam okwu, akwara ụda olu dị mgbagwoju anya nke yiri nke mmadụ adịghị anụmanụ ahụ mkpa. (Ọnụ Ọgụgụ 22:26-31) N’ụzọ doro anya, mgbe ‘ịnyịnya ibu a nke dara ogbi weere olu mmadụ kwuo okwu,’ ikike o ji mee nke ahụ sitere n’ógbè ndị bụ́ mmụọ.—2 Pita 2:16.

N’ime Bible, e mere ka a mata mmụọ e kere eke nke nọ n’azụ agwọ ahụ gwara Iv okwu dị ka “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.” (Mkpughe 12:9) Ọ bụ Setan, bụ́ onye “na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè,” kpalitere okwu ahụ Iv nụrụ ma zaghachi.—2 Ndị Kọrint 11:14.

[Foto dị na peeji nke 27]

“Unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya