Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 3/1 p. 3-4
  • Mkpagbu Okpukpe—N’ihi Gịnị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpagbu Okpukpe—N’ihi Gịnị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ha Abụghị Akụkụ nke Ụwa”
  • Ị Ga-atachili Obi Mgbe A Na-akpagbu Gị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ndị A Kpagburu n’Ihi Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ntachi Obi N’ọnwụnwa Na-ewetara Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 3/1 p. 3-4

Mkpagbu Okpukpe—N’ihi Gịnị?

Ì KWEERE na e kwesịrị ịkpagbu ndị mmadụ n’ihi okpukpe ha? Eleghị anya i kweghị—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ma ọ bụrụhaala na ha adịghị anapụ ndị ọzọ ihe ndị ruuru ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịwo anya a nọworo na-akpagbu ndị mmadụ n’ihi okpukpe ha, a ka na-emekwa otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ugboro ugboro, a napụrụ ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova ihe ndị ruuru ha na Europe nakwa n’ebe ndị ọzọ n’ụwa ma jiri obi ọjọọ megbuo ha n’ime narị afọ nke 20 dum.

N’oge ahụ, Ndịàmà Jehova nwetara mkpagbu e ji obi ọjọọ na nlezianya mee, nke dịrukwara ogologo oge, site n’aka ọchịchị aka ike abụọ a ma ama na Europe. Gịnị ka ahụmahụ ha na-akụziri anyị banyere mkpagbu okpukpe? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ ha si meghachi omume ná nhụjuanya ha?

“Ha Abụghị Akụkụ nke Ụwa”

Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịbụ ndị na-edebe iwu, ndị na-eme udo na ndị na-eme omume ziri ezi. Ha adịghị emegide ndị ọchịchị ma ọ bụ na-achọ ịma ha aka, ha adịghịkwa eme ihe a ga-eji na-akpagbu ha n’ihi na ha chọrọ ịbụ ndị e gburu n’ihi okwukwe ha. Ndị Kraịst a na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nke a kwekọrọ n’okwu Jizọs bụ́: “[Ụmụazụ m] abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16) Ọtụtụ ọchịchị maara na Ndịàmà na-anọpụ iche. Ma ndị ọchịchị aka ike enwechaghị nkwanye ùgwù maka ihe Bible chọrọ nke bụ́ na Ndị Kraịst agaghị abụ akụkụ nke ụwa.

A kọwara ihe kpatara nke a ná nnọkọ nkwurịta okwu e nwere na Mahadum Heidelberg, Germany, na November 2000. Isiokwu nke nnọkọ ahụ bụ “Mmegbu na Nkwuwa Okwu: Ndịàmà Jehova n’Okpuru Ọchịchị Aka Ike nke Nazi na nke Kọmụnist.” Dr. Clemens Vollnhals nke Ụlọ Ọrụ Hannah-Arendt Maka Inyocha Ọchịchị Aka Ike kwuru, sị: “Ikike ndị ọchịchị aka ike na-akpa abụghị nanị n’ihe banyere ọchịchị. Ha na-achọ ka onye ọ bụla doo onwe ya kpam kpam n’okpuru ha.”

Ezi Ndị Kraịst apụghị ido onwe ha “kpam kpam” n’okpuru ọchịchị mmadụ, ebe ọ bụ na ha ekwewo nkwa irubere nanị Jehova Chineke isi n’ụzọ a na-akparaghị ókè. Ndịàmà bi n’ebe ndị ọchịchị aka ike na-achị achọpụtawo na ihe ọchịchị na-achọ na ihe ndị okwukwe ha na-achọ na-emegiderịta onwe ha mgbe ụfọdụ. Gịnị ka ha meworo n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? N’oge ndị gara aga, Ndịàmà Jehova etinyewo ụkpụrụ ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kwupụtara n’ọrụ ná ndụ ha, nke bụ́: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

Ọtụtụ puku Ndịàmà nọgidesiri ike n’okwukwe ha ma nọgide na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọbụna n’agbanyeghị mkpagbu ndị kasị njọ a kpagburu ha. Olee otú ha si nwee ike ịtachi obi? Ebee ka ha si nweta ike ime otú ahụ? Ka ha jiri ọnụ ha zaa. Ka anyị hụkwa ihe mmadụ nile, ma Ndịàmà ma ndị na-abụghị Ndịàmà, pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

A kpagburu Ndịàmà Jehova nọ na Germany n’ụzọ obi ọjọọ ruo ogologo oge n’okpuru ọchịchị aka ike abụọ e nwere na narị afọ nke 20

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

“Ikike ndị ọchịchị aka ike na-akpa abụghị nanị n’ihe banyere ọchịchị. Ha na-achọ ka onye ọ bụla doo onwe ya kpam kpam n’okpuru ha.”—Dr. Clemens Vollnhals

[Foto dị na peeji nke 4]

A napụrụ ezinụlọ Kusserow nnwere onwe ha n’ihi na ha jụrụ ime ihe megidere okwukwe ha

[Foto dị na peeji nke 4]

E gburu Johannes Harms n’ụlọ mkpọrọ ndị Nazi n’ihi nkwenkwe ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya