Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 3/15 p. 3
  • Ememe nke Metụtara Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ememe nke Metụtara Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • “Na-emenụ Nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Olee Otú E Si Echeta Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 3/15 p. 3

Ememe nke Metụtara Gị

MGBE Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, o guzobere otu ememe nke na-ewetara Chineke nsọpụrụ. Nke a bụ nanị ememe okpukpe o nyere ụmụazụ ya iwu kpọmkwem ka ha na-eme. Ọ bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, bụ́ nke a makwaara dị ka Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ.

Were ya na ị nọ na nzuzo na-ekiri ihe omume ndị dugara n’ememe ahụ. Jizọs na ndịozi ya gbakọtara n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jeruselem ime Ememe Ngabiga nke ndị Juu. Ha erichaala nri ọdịnala Ememe Ngabiga, bụ́ nke gụnyere nwa atụrụ a hụrụ n’ọkụ, ihe ndị dị iche iche na-elu ilu, achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara. A chụpụla onyeozi ahụ na-eguzosighị ike n’ihe bụ́ Judas Iskarịọt, ọ na-agakwa ịrara Onyenwe ya nye n’oge na-adịghị anya. (Matiu 26:17-25; Jọn 13:21, 26-30) Nanị Jizọs na ndịozi 11 ya kwesịrị ntụkwasị obi nọzi. Matiu bụ otu n’ime ha.

Dị ka ihe ndekọ Matiu, bụ́ onye ji anya ya hụ ihe merenụ, na-akọ, nke a bụ otú Jizọs si guzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ahụ: “Jizọs weere otu ogbe achịcha [na-ekoghị eko], mgbe ọ gọzisịworo ya, ọ nyawara ya, ka ọ na-enye ya ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịkwara: ‘Naranụ, rie. Nke a pụtara ahụ́ m.’ Ọzọ, o buuru iko [nke mmanya], mgbe o nyesịworo ekele, o bunyekwara ha ya, na-asị: ‘Ṅụọnụ, unu nile; n’ihi na nke a pụtara “ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’”—Matiu 26:26-28.

N’ihi gịnị ka Jizọs ji guzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị? Mgbe ọ na-eme otú ahụ, gịnị mere o ji jiri achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara mee ihe? Ụmụazụ Kraịst nile hà ga-eri ihe nnọchianya ndị a? Ugboro ole ka a ga na-eri nri a? Ò nwekwara ihe ọ pụtara nye gị n’ezie?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya