Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 11/15 p. 8-9
  • Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eweta Ngọzi Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eweta Ngọzi Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Nwere Ezi Ihe Na-akpali Ha
  • Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Eje Ozi
  • Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye N’àjà Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achụ Onwe Onye n’Àjà?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Nọgide Na-eso Jisọs
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 11/15 p. 8-9

“Inyeaka M Na-esi N’aka Jehova Bịa”

Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eweta Ngọzi Jehova

OTU nwoke ji ịnyịnya ígwè na-eme njem n’ime oké ọhịa dị na Cameroon. O ji ọtụtụ awa gbara ígwè ya na-agafe okporo ụzọ ndị idei mmiri juru na ha, gbarakwa ya gafee apịtị, chee ọtụtụ ihe ize ndụ ihu iji wusie ndị ọzọ ike. Ụfọdụ ndị na Zimbabwe na-eji ụkwụ eru mmiri ndị na-ekwo ekwo ruo kilomita 15 iji gaa kụziere ìgwè dịpụrụ adịpụ ihe, buru ákwà ha na akpụkpọ ụkwụ ha n’isi ka mmiri ghara ime ha. N’ebe ọzọ, otu nwanyị na-eteta n’elekere anọ nke ụtụtụ iji gaa kụziere otu nọọsụ ihe, bụ́ onye ihe ọ ga-enwe ohere iji mụọ ihe bụ nanị otu awa n’isi ụtụtụ.

Olee ihe jikọrọ ndị na-eme mgbalị ndị ahụ? Ha nile bụ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova bụ́ ndị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu Bible. Ha gụnyere ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị nke pụrụ iche, ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ọtụtụ puku ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo n’ebe obibi Betel ndị e nwere gburugburu ụwa. Ihe e jikwa mara ha bụ ịchụ onwe onye n’àjà.a

E Nwere Ezi Ihe Na-akpali Ha

Ndịàmà Jehova na-eme ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Timoti, nke bụ́: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Timoti 2:15) Ma olee ihe na-akpali ọtụtụ narị puku Ndịàmà ije ozi oge nile?

Mgbe a jụrụ ndị ozi oge nile ihe mere ha ji adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ozi Jehova, azịza ha na-agụnye ịhụnanya ha nwere maka Chineke na ụmụ mmadụ ibe ha. (Matiu 22:37-39) Nke a kwesịrị nnọọ ekwesị, n’ihi na ma ọ́ bụghị ịhụnanya na-akpali ha, mgbalị ọ bụla ha tinyere ga-abụ n’efu.—1 Ndị Kọrint 13:1-3.

Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Eje Ozi

Ndị Kraịst nile raara onwe ha nye azala òkù Jizọs bụ́: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24) Ịjụ onwe anyị pụtara anyị iji obi anyị nile kwere ka Jehova Chineke na Jizọs Kraịst nwere anyị ma na-eduzi anyị. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị jiri mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà na-eje ozi oge nile.

Ọtụtụ Ndịàmà na-eme mgbalị dị ukwuu iji mụbaa ozi ha na-ejere Jehova. Tụlee ihe banyere Júlia dị afọ 56, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile bi na São Paulo, Brazil. O chetara, sị: “Otu nwanna nwoke onye China kpọrọ m na fon ma jụọ m ma m̀ chọrọ ịmụ asụsụ Chinese. N’ihi afọ ndụ m, ọ dịbeghị mgbe m chere echiche ịmụ asụsụ ọhụrụ. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, anabatara m ihe ịma aka ahụ. Taa, enwere m ike iji asụsụ Chinese zie ozi ọma.”

Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Peru na-akọ, sị: “N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ narị ndị ọsụ ụzọ oge nile akwagawo n’ókèala ndị a na-eketaghị ọrụ, jiri obi ike na-egosipụta mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ha na-akwaga n’obodo ndị dị anya bụ́ ebe ndị a na-enweghị ihe ndị bụ́ isi e ji ebi ndụ na ebe ọrụ na-esi ike nchọta. Ụmụnna ndị a na-adị njikere ime ihe nile dị mkpa iji nọgide n’ebe ndị e kenyere ha ọrụ. Ma nke kasị mkpa bụ na ozi ha na-arụpụta ihe ndị bara uru n’ọtụtụ ebe. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-akọ na ndị ọsụ ụzọ ndị a na-achụ onwe ha n’àjà enyewo aka n’iguzobe ìgwè ndị ọhụrụ.”

Ụfọdụ Ndị Kraịst etinyela ndụ ha n’ihe ize ndụ iji nyere ndị kwere ekwe ibe ha aka. (Ndị Rom 16:3, 4) Otu onye nlekọta sekit nke na-eje ozi n’otu ebe agha tisasịrị n’Africa na-akọ, sị: “Tupu anyị eruo ebe ikpeazụ ndị agha nnupụisi na-eche nche nke dị n’agbata ógbè ha bichiri na ógbè ka dị n’aka gọọmenti, ndị ọchịagha anọ nke ndị agha nnupụisi na ndị na-eche ha nche gbara mụ na nwunye m gburugburu, ha jụkwara anyị ndị anyị bụ. Ka ha na-ele kaadị na-akọwa ndị anyị bụ, ha hụrụ na anyị si n’ógbè gọọmenti na-achịkwa, n’ihi ya, obi erughịzi ha ala. Ha boro m ebubo na m bụ onye nledo. N’ihi ya, ha kpebiri ịtụba m n’olulu. Akọwaara m ha ndị anyị bụ, ha mesịkwara hapụ anyị.” Ọgbakọ ndị dị ebe ahụ nwere nnọọ obi ụtọ na di na nwunye a na-achụ onwe ha n’àjà mesịrị nwee ike ileta ha!

N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ozi oge nile dị otú ahụ na-enwe, ọnụ ọgụgụ ha nọgidere na-amụba amụba n’akụkụ nile nke ụwa. (Aịsaịa 6:8) Ndị ọrụ a dị uchu ji ihe ùgwù ha nwere ijere Jehova ozi kpọrọ ihe. Ọtụtụ nde ndị ọzọ ji mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà dị otú ahụ na-eto Jehova ugbu a. Jehova na-agọzikwanụ ha n’ụba. (Ilu 10:22) Ebe ha nwere obi ike na Jehova ga-anọgide na-agọzi ha ma na-akwado ha, ndị ọrụ dị otú ahụ na-arụsi ọrụ ike na-egosipụta ụdị àgwà ọbụ abụ ahụ nwere, bụ́ onye bụrụ, sị: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.”—Abụ Ọma 121:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee 2005 Calendar of Jehovah’s Witnesses, November/December.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị usuu ndị agha gị.”—ABỤ ỌMA 110:3

[Igbe dị na peeji nke 8]

JEHOVA NA-EJI NDỊ OHU YA JI OBI HA NILE NA-EJERE YA OZI AKPỌRỌ IHE

“Bụrụnụ ndị na-eguzosi ike, ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ, ndị nwere ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu n’ihe metụtara Onyenwe anyị.” —1 Ndị Kọrint 15:58.

“Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”—Ndị Hibru 6:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya