“Gaa Saa Ya n’Ọdọ Mmiri Silom”
MGBE Jizọs jisịrị ụrọ ọ gwakọtara ya na ọnụ mmiri ya tee nwoke kpuru ìsì n’anya, ọ gwara ya, sị: “Gaa saa ya n’ọdọ mmiri Silom.” Nwoke ahụ mere ihe a gwara ya ma “lọghachi na-ahụ ụzọ.” (Jọn 9:6, 7) Olee ebe Ọdọ Mmiri Silom ahụ dị? Ihe ndị e gwupụtara n’ala na nso nso a emeela ka a ghọtakwuo ebe ọ dị.
Ọtụtụ ndị na-eme njem nleta agawo n’otu ebe dị na Jeruselem bụ́ ebe a maara dị ka Ọdọ Mmiri Silom, ha kweere na ọ bụ ọdọ mmiri ahụ e kwuru banyere ya na Jọn 9:7. Ọdọ mmiri ahụ dị ná ngwụsị ọwa mmiri Hezekaịa—nke dị narị mita ise na iri atọ n’ogologo, bụ́ nke a wara na narị afọ nke asatọ T.O.A. Otú ọ dị, ọdọ mmiri a dịwara kemgbe narị afọ nke anọ O.A. Ọ bụ ndị Byzantium kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst, bụ́ ndị chere na ọdọ mmiri ahụ a kpọrọ aha n’Oziọma Jọn ga-adị ná ngwụsị nke ọwara mmiri a, gwuru ya.
Otú ọ dị, n’afọ 2004, ndị ọkà mmụta ihe ochie chọtara ihe ha kwubiri na ọ bụ Ọdọ Mmiri Silom nke e nwere n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Ọ dị n’ebe dị ihe dị ka otu narị mita n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke ebe mbụ e chere bụ́ Ọdọ Mmiri Silom. Olee otú ha si chọta ya? Ndị ọchịchị obodo ahụ chọrọ ịrụzi paịpụ mmiri dị n’okpuru ala n’ebe ahụ, n’ihi ya, ha zigara ndị ọrụ ji ngwá ọrụ buru ibu n’ebe ahụ. Onye ọkà mmụta ihe ochie na-arụ ọrụ n’ebe na-adịghị anya site n’ebe ahụ nọ na-ele ka a na-egwu ihe ahụ ma hụ steepụ abụọ. A kwụsịrị ọrụ ahụ, Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ochie n’Izrel nyekwara ikike ka e gwuo gburugburu ebe ahụ. E burula ụzọ gwuo otu akụkụ nke ọdọ mmiri ahụ, nke dị ihe dị ka mita iri asaa n’ogologo, na isi abụọ nke ọdọ mmiri ahụ.
Ụfọdụ mkpụrụ ego ndị e gwupụtara mgbe a na-egwu ihe ahụ bụ ego ndị e ji mee ihe n’afọ nke abụọ, nke atọ, na nke anọ nke nnupụisi ndị Juu megide ndị Rom. Nnupụisi a weere ọnọdụ n’agbata afọ 66 na 70 O.A. Mkpụrụ ego ahụ gosiri na e jiri ọdọ mmiri ahụ mee ihe ruo n’afọ 70 O.A. bụ́ mgbe ndị Rom bibiri Jeruselem. Akwụkwọ bụ́ Biblical Archaeology Review kwubiri, sị: “N’ihi ya, e jiri olulu mmiri ahụ mee ihe ruo n’ọgwụgwụ nke nnupụisi ahụ, mgbe nnupụisi ahụ gasịkwara, a gbahapụrụ ya. E bighị ebe a ọzọ, nke bụ́ ebe kasị ala na Jeruselem, ruo n’oge ọchịchị ndị Byzantium. Kwa afọ, idei mmiri a na-enwe n’oge oyi jiri apịtị sọchie olulu mmiri ahụ. Mgbe ndị Rom bibisịkwara obodo ahụ, ọ dịghịzi onye kpochara olulu mmiri ahụ. Ka ọtụtụ narị afọ gasịrị, ọtụtụ apịtị sọbara n’ime ya, ka oge na-agakwa, a kwụsịrị ịhụ olulu mmiri ahụ anya. Mgbe ndị ọkà mmụta ihe ochie chọpụtara ya, apịtị dị n’akụkụ ya ụfọdụ dị mita atọ n’omimi.”
Gịnị mere ndị ji obi eziokwu na-amụ Bible ji nwee mmasị n’ịmara ebe Ọdọ Mmiri Silom dị? Ọ bụ n’ihi na nke a na-enyere ha aka ịghọtakwu otú Jeruselem nke narị afọ mbụ dị, bụ́ ebe a kpọrọ aha ọtụtụ ugboro n’Oziọma ndị kọrọ akụkọ ndụ na ozi Jizọs.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọdọ Mmiri Silom a chọpụtara ọhụrụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
© 2003 BiblePlaces.com