Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 3/1 p. 26-29
  • “Ọ Na-edu M n’Ụzọ Ezi Omume”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Na-edu M n’Ụzọ Ezi Omume”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • M Hapụrụ Ụlọ
  • M Kwagara n’Obodo Ọzọ
  • Asị Ndị Okpukpe Kpọrọ Ndịàmà Jehova na Quebec
  • Ozi Na-enye Obi Ụtọ
  • M Lụrụ Di, Mụ na Ya Amalite Ijekọ Ozi
  • Ntọala M Maka Ndụ Nwere Nzube
    Teta!—2003
  • “Ọ Bụghị Unu Nwe Agha nke A, Kama Ọ Bụ Chineke”
    Teta!—2000
  • Ịmụta Ihe n’Aka Ndị Na-eme nke Ọma Mere Ka Jehova Gọzie M
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Nhọrọ Ndị Ziri Ezi M Mere Ewetara m Ngọzi Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 3/1 p. 26-29

“Ọ Na-edu M n’Ụzọ Ezi Omume”

Dị ka Olga Campbell si kọọ

Nwanne m nwaanyị bụ́ Emily gwara m, sị: “Ezi ihe nlereanya dị ka mgbịrịgba e ji akpọkọta ndị mmadụ. Ị kụrụ mgbịrịgba, mụ esoro gị.” O kwuru nke a n’akwụkwọ ozi o ji kelee m mgbe m ruru afọ iri isii n’ọrụ ikwusa ozi ọma oge niile. Ka m kọọrọ gị otú ndụ m dị mgbe m dị ntakịrị na otú m si malite ozi a m nọ na-eje kemgbe.

A MỤRỤ m na January 19, 1927, n’ebe dị nso na Wakaw, Saskatchewan, nke dị n’etiti ebe ọdịda anyanwụ Canada. Nne na nna m bụ ndị Ukraine, ndị na-arụ ọrụ ugbo. Anyị dị ụmụ asatọ, mụ na ejima m, bụ́ Bill, tọrọ nke ikpeazụ. Anyị bụ́ ụmụaka na-enyere papa anyị, bụ́ onye na-arụsi ọrụ ike, aka n’ubi. Mama anyị na-elekọta anyị anya nke ọma n’obere ụlọ anyị, n’agbanyeghị na ọrịa ogbu na nkwonkwo ji ya aka ọjọọ. Ọrịa ahụ mechara gbuo ya mgbe ọ dị naanị afọ iri atọ na asaa. Adị m naanị afọ anọ mgbe ahụ.

Ọnwa isii mama anyị nwụrụ, papa anyị lụrụ nwaanyị ọzọ. Ọ dịghị anya, anyị malitere nwewe esemokwu n’ụlọ. Papa anyị mechara mụta ụmụ nwaanyị ise ọzọ! M gbalịrị ka m na-asọpụrụ nwunye nna m, ma, ọ dịrịghị nwanne m nke tọrọ m, bụ́ John, mfe ime otú ahụ.

Tupu afọ 1940, mụ na Bill banyere ụlọ akwụkwọ sekọndrị, nke mere ka anyị zere nsogbu dị n’ụlọ anyị. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ na-achọ ịda, mmụọ ịhụ mba n’anya juru ebe niile. Onye nkụzi ọhụrụ anyị kwuru na nwa akwụkwọ ọ bụla ga-ekelerịrị ọkọlọtọ. Ma, otu nwatakịrị nwaanyị jụrụ ime otú ahụ. Ụmụ akwụkwọ kparịrị ya nke ukwuu. Ma, obi ike o nwere masịrị m, m wee jụọ ya ihe mere na o keleghị ọkọlọtọ. Ya agwa m na ya bụ Onye Mmụta Baịbụl, bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ụfọdụ, kwuokwa na ọ bụ naanị Chineke ka ya na-efe.—Ọpụpụ 20:2, 3; Ọrụ 5:29.

M Hapụrụ Ụlọ

Na 1943, m malitere ịrụ ọrụ na Prince Albert. M na-eburu mmanya ọtọ bịrịbịrị n’ụgbọala gaa bugara ndị na-azụ ha. Ebe m chọrọ nduzi Chineke, azụrụ m otu Baịbụl. Ma, o siiri m ike nghọta nke na m na-ebe ákwá. Naanị ihe m maara na Baịbụl bụ ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.—Matiu 6:9-13.

Otu ụbọchị Sunday, nwaanyị nwe ụlọ m bi, bụ́ onye na-agachi chọọchị anya, bịara na-eturu m ọnụ otú ya si kwapụ otu “nwaanyị Baịbụl” n’ọnụ ụzọ ụlọ ya. N’ime obi m, m sịrị, ‘Olee ihe mere o ji mesoo ya ụdị omume ọjọọ a?’ Mgbe ụbọchị Sunday ole na ole gafere, ahụ́ nyere m nsogbu, m wee ghara ịga chọọchị. N’ụbọchị ahụ, “nwaanyị Baịbụl” ahụ bịara ọzọ.

Ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ na-ekpe ekpere?”

M zara ya, sị, “M na-ekpe ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.”

M gere ntị nke ọma mgbe ọ nọ na-akọwara m ihe ekpere ahụ Jizọs kụziri pụtara. O kwere m nkwa na ya ga-abịaghachi na Wednesday.

Mgbe nwaanyị nwe ụlọ m bi lọtara, m ji obi ụtọ kọọrọ ya banyere “nwaanyị Baịbụl” ahụ, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O wutere m mgbe nwaanyị ahụ nwe ụlọ m bi bara mba, sị: “Ọ bụrụ na ọ bịaghachi na Wednesday, m ga-achụpụ gị na ya n’ụlọ a!”

M chọrọ Onyeàmà ahụ n’ụlọ ndị agbata obi anyị niile, bụ́ onye m nụrụ na aha ya bụ Oriakụ Rampel. Mgbe m hụrụ ya, m kọọrọ ya nsogbu m nọ na ya wee rịọ ya ka ọ kọọrọ m ihe niile o nwere ike ịkọrọ m banyere Baịbụl. O yiri ka à ga-asị na anyị kwuru ihe niile dị na Baịbụl, malite na Jenesis ruo Mkpughe! O ji oge a tụnyere ụbọchị Noa, mgbe Chineke bibiri ụwa ajọ omume ma zọpụta Noa na ezinụlọ ya, ha wee malite ibi n’ụwa dị ọcha.—Matiu 24:37-39; 2 Pita 2:5; 3:5-7, 12.

Mgbe mụ na Oriakụ Rampel kparịtachara ụka ogologo oge, ọ sịrị: “Ahụla m na i kwerela na ihe ndị a Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu. A ga-enwe mgbakọ Ndịàmà Jehova n’izu abụọ na-abịa abịa, a ga-eme gị baptizim.” Ụra atụghị m n’abalị ahụ, ebe m nọ na-eche ihe niile m mụtara. Baptizim yiri ihe a na-ekwesịghị iji gwurie egwu. Ma, achọrọ m ife Chineke! Ọ bụ ezie na amaghị m ọtụtụ ihe na Baịbụl, e mere m baptizim mgbe m dị afọ iri na isii, n’October 15, 1943.

M Kwagara n’Obodo Ọzọ

Na November, nwanne m nwoke bụ́ Fred gwara m ka m bịa lekọtawa ụlọ elu ya dị okpukpu atọ, nke dị na Toronto, n’ebe ọwụwa anyanwụ Canada. Ekwetara m, n’ihi na enwere m olileanya na m ga-enwere onwe m n’ebe ahụ ife Jehova. Tụpụ mụ agaa, m gara leta nwanne m nwaanyị bụ́ Ann, onye ka bi nso na Saskatchewan. Ọ gwara m ihe tụrụ m n’anya, Ndịàmà Jehova na-akụziri ya na Doris Baịbụl, ọ gbakwara m ume ka m mụwa Baịbụl. Mgbe ahụ, m gwara ha ihe ha na-amaghị, na abụ m Onyeàmà e mere baptizim!

Mụ na nwanne m nwaanyị nke m tọrọ bụ́ Emily bara ụgbọ okporo ígwè gawa Toronto bụ́ ebe dị anya. Bill cheere anyị n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè wee kpọrọ anyị gaa n’ụlọ ya, bụ́ ebe ya na Fred na John bi. Ajụrụ m Fred aha onye ọzọ bi n’ụlọ ahụ. Ya asị: “Ị̀ makwa na ọ bụ Alex Reed onye obodo anyị? Ì chetara ya? Ọ bụ ya bi n’elu. Isi adịghị nwoke m ahụ mma! Ị̀ makwa na ya na Ndị Mmụta Baịbụl na-amụ ihe?” Ọṅụ wee ju m obi.

M wee jiri nwayọọ nwayọọ gbagoo elu gaa hụ Alex ma mee ndokwa iso ya gaa ọmụmụ ihe ná mgbede ahụ. Achọrọ m ịga ọmụmụ ihe ozugbo ka ụmụnne m ghara ịhụ ohere ha ga-eji gbochie m ịga. N’ime ụbọchị ole na ole, agara m kwusaa ozi ọma nke mbụ m, ọ bụ ezie na o nwetụbeghị onye kụziiri m Baịbụl. Obi dị m ụtọ na m ji asụsụ m mụtara mgbe m bụ nwata kwusaara ndị Ukraine ozi ọma.

Ịgụ Ụlọ Nche na-amasị Bill. M na-edebekwa ya n’ọnụ ụlọ ya mgbe niile. Mgbe ọ kwagara British Columbia, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Canada, m mere ndokwa ka a na-ezigara ya Ụlọ Nche kwa ọnwa. Ọ bụ ezie na ọ naghị ekwu ọtụtụ okwu, o detaara m akwụkwọ ozi dị peeji iri wee kelee m. Ka oge na-aga, o nyefere Jehova ndụ ya ma ghọọ Onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi nke bụ́ okenye ọgbakọ. Ya mere, ụmụnne m ise, bụ́ Bill, Ann, Fred, Doris, na Emily, nyefere Jehova ndụ ha, na-efe ya ofufe. Nke a mekwara m obi ụtọ nke ukwuu!

Na May 22, 1945, ọchịchị ndị Canada kagburu iwu ha machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova.a N’ezie, amaghị m na a machibidoro anyị iwu ruo mgbe m nụrụ ọkwa a mara na a kagbuola iwu ahụ. Mụ na enyi m nwaanyị bụ́ Judy Lukus kpebiri ịghọ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile, kpebiekwa ịga n’ime ime ebe ọwụwa anyanwụ Canada, bụ́ Quebec, ebe a na-asụ French. Mgbe ụmụnne m bụ́ Doris na Emily nụrụ ihe anyị kpebiri ime, ha kpebiri ikwusa ozi ọma oge niile na Vancouver, nke dị na British Columbia, ná mpaghara ọzọ nke Canada.

Asị Ndị Okpukpe Kpọrọ Ndịàmà Jehova na Quebec

Ọ bụghị ka m gbanwee ebe m bi mere m ji kwaga Quebec. A na-emegide Ndịàmà nọ n’ebe ahụ nke ukwuu maka na ha na-ekwusa ozi ọma.b Anyị nwere obi ụtọ mgbe anyị so kesaa traktị bụ́ Quebec’s Burning Hate for God and Christ and Freedom Is the Shame of All Canada (Oké Asị Ndị Quebec Kpọrọ Chineke na Kraịst na Nnwere Onwe Bụụrụ Ndị Canada Niile Ihe Ihere). Ozi ahụ nke na-agba agba n’ahụ́ kpughere asị ndị okpukpe kpọrọ Ndịàmà.

Anyị ji abalị iri na isii kesaa traktị ahụ. Anyị na-amalite n’ihe dị ka elekere anya abụọ nke ime abalị, jiri nwayọọ na-afabanye ha n’okpuru ibo ụzọ. Mgbe anyị ruru n’otu ụlọ, anyị nụrụ na ndị uwe ojii na-abịa. Anyị zoro n’otu ụzọ dị warara, ha ahụghịkwa anyị. N’echi ya, anyị gaghachiri n’okporo ámá ahụ na-enye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! N’ime ọtụtụ ọnwa, ndị uwe ojii jidere anyị ọtụtụ ugboro nke na anyị amaghịzi ugboro ole ha jidere anyị. Ana m eji brọsh e ji asa ezé na uri anya mgbe niile iji dị njikere maka ịga mkpọrọ.

Na November 1946, Nathan Knorr, onye na-eduzi ọrụ Ndịàmà na-arụ n’ụwa niile n’oge ahụ, si Brooklyn, New York, bịa leta anyị. Ọ gwara anyị bụ́ mmadụ iri isii na anọ, ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile na Quebec, ka anyị bịa soro na klas nke itoolu nke Watchtower Bible School of Gilead na South Lansing, New York. N’ime ọnwa ise anyị nọrọ n’ụlọ akwụkwọ a, a kụziiri anyị Baịbụl n’esepụghị aka. Mgbe anyị gachara ụlọ akwụkwọ ahụ n’August 1947, e zigara anyị n’obodo niile dị na Quebec ka anyị malite ọgbakọ ọhụrụ n’ebe ndị ahụ.

Ozi Na-enye Obi Ụtọ

E zigara anyị bụ́ ụmụ agbọghọ anọ na Sherbrooke. Anyị mụsiri French ike. Anyị gawa ma ọ bụ lọtawa ebe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-ekwurịta otú e nwere ike isi kwugasia okwu ụfọdụ na French. Mgbe ụfọdụ, anyị anaghị enwe ego anyị ga-eji rie nri ehihie, ya mere, anyị na-ala n’ụlọ gaa mụọ ihe. Ụtọ asụsụ doro onye e zigara mụ na ya otu ebe, bụ́ Kay Lindhorst, anya nke ọma. O bu ụzọ kụziere m ụtọ asụsụ Bekee ka m wee mara ụtọ asụsụ French.

Ebe m na-agaghị echefu echefu m kwusara ozi ọma oge niile bụ Victoriaville, bụ́ obodo ihe dị ka puku mmadụ iri na ise bi n’oge ahụ. O siri ike ịhụ onye na-asụ Bekee n’ebe ahụ. Ya mere, ọ bụ ebe kacha mma anyị nwere ike ịnọ mụta French nke ọma. Izu mbụ anyị nọrọ n’ebe ahụ tọrọ anyị ụtọ. Ndị mmadụ natara anyị akwụkwọ n’ebe niile anyị gara. Mgbe anyị gaghachiri n’ebe ndị ahụ, ndị nwe ụlọ mechichara ụzọ ha na windo ha. Gịnị meziri?

Ụkọchukwu nke nọ n’ebe ahụ gwara ndị mmadụ ka ha ghara ige anyị ntị. Ya mere, mgbe anyị na-aga ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ, ụmụaka na-eso anyị n’azụ nọrọ ebe dị anya na-atụ anyị okwute na snoo. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị nwere mmasị ịnụ ihe Baịbụl kwuru. Ná mmalite, ha na-ekwe ka anyị bịa zie ha ozi ọma naanị n’abalị. Ma, ka ha na-amụtakwu ihe ndị dị na Baịbụl, ha kwetara ka anyị kụziere ha Baịbụl n’ebe ndị mmadụ ga na-ahụ ha, n’agbanyeghị na ọ gaghị amasị ndị agbata obi ha.

Tupu afọ 1960, mụ na ụmụnne m ndị nwaanyị gara Wakaw. Mgbe anyị gara ọmụmụ ihe, anyị kọrọ otú ozi ọma anyị si na-aga. Mgbe e mechara, otu okenye gwara anyị, sị: “Obi ga-atọ mama unu ụtọ ma o si n’ọnwụ bilie hụ na ụmụ ya bụzi Ndịàmà Jehova!” O kwuru na otu Onyeàmà nọ na-akụziri mama anyị Baịbụl tupu mama anyị anwụọ. Anyị bere ákwá mgbe anyị nụrụ na ọ nọ na-amụ eziokwu dị na Baịbụl bụ́ nke o doro anya na ọ gaara akụziri anyị ma à sị na ọ nwụchughị ọnwụ.

M Lụrụ Di, Mụ na Ya Amalite Ijekọ Ozi

Na 1956, mụ na Merton Campbell matara. Ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ọnwa iri abụọ na asaa maka na ọ jụrụ ije agha n’oge Agha Ụwa nke Abụọ n’ihi na ọ bụ Onye Kraịst. Ọ nọwo na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Brooklyn ihe fọrọ ntakịrị ka o ruo afọ iri mgbe ahụ. Merton nwere ọtụtụ àgwà ọma ndị ọ mụtara na Baịbụl. Achọpụtakwara m na ọ ga-abụ ezigbo di. Anyị derịtara akwụkwọ ọnwa ole na ole, ùgwù anyị na-akwanyere onwe anyị na mmasị anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ mere ka anyị hụ onwe anyị n’anya.

Mụ na Merton lụrụ na September 24, 1960. Mụ na nwoke a nke hụrụ nnọọ Chineke n’anya ibi kemgbe iri afọ anọ na asaa bụụrụ m ezigbo ngọzi! Merton arụwo ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi kemgbe iri afọ ise na asatọ. Ngalaba ahụ na-enyere ọgbakọ Ndịàmà Jehova niile dị na United States aka ma na-eduzi ha. Kemgbe ihe karịrị iri afọ atọ, ihe m na-arụ na Brooklyn bụ idozi ọnụ ụlọ ndị ọbịa na-anọ. Mgbe e mechara, m malitere idozi Ụlọ Mgbakọ buru ibu ndị dị gburugburu New York City. N’afọ 1995, e zigara mụ na Merton n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower nke dị na Patterson, bụ́ ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri site n’ebe ugwu New York City.

Mgbe m hapụrụ ụlọ n’oge m dị afọ iri na abụọ, ọ dịtụdịghị mgbe m chere na otu ụbọchị m ga-enwe ìgwè ndị na-efe Chineke ga-agba m gburugburu, tinyere ụmụnne m. N’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke ga-eweta, ana m atụ anya ịhụ mgbe anyị ga-agba mama anyị gburugburu wee kọọrọ ya ihe ndị merenụ kemgbe ọ nwụrụ, karịchaa, otú Jehova bụ́ Chineke si jiri ịhụnanya kụziere ụmụ ya okwu ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ na Jehova na-edu anyị “n’ụzọ ezi omume”!—Abụ Ọma 23:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ọchịchị machibidoro Ndịàmà Jehova iwu na July 4, 1940, maka na ha ekweghị itinye aka n’agha.

b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere mkpagbu ndị okpukpe kpagburu Ndịàmà na Quebec, gụọ Teta! nke May 8, 2000, peeji nke 20-23.

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Papa m na mama m na ụlọ mụ na ha na ụmụnne m asaa biri

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe mụ na ndị ibe m na-eje ozi ọma n’Ottawa, n’afọ 1952

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na ụmụnne m (malite n’aka ekpe ruo n’aka nri) Ann, Mary, Fred, Doris, John, mụ onwe m, Bill, na Emily

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na Merton taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya