Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 7/1 p. 22
  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Aha Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Aha Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọpụta Aha Chineke?
    Teta!—1999
  • A4 Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 7/1 p. 22

Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Aha Chineke?

AHA Chineke pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro puku asaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ nke a na-akpọkarị “Agba Ochie.” Lee otú e si dee ya: יהוה (a na-esi n’aka nri gụrụ ya gaa n’aka ekpe). E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, aha Chineke bụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ bụ́ Yohdh, He, Waw, na He, nke ọtụtụ ndị na-ede YHWH ná mkpụrụ akwụkwọ ha.

N’oge ochie, ndị Juu nwere echiche na-enweghị isi bụ́ na ọ dị njọ ịkpọ aha Chineke. N’ihi ya, ha kwụsịrị ịkpọ aha ahụ, malitekwa iji okwu ọzọ na-edochi ya mgbe ha na-ede ihe. Ma, ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl dere aha ahụ “Yahweh,” ma ọ bụ “Jehova.” Otu n’ime nsụgharị Baịbụl e mere otú ahụ bụ Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik. Dị ka e dere na Baịbụl ahụ, mgbe Mozis jụrụ Chineke onye ya ga-agwa ụmụ Izrel na ọ bụ ya zitere ya ma ha jụọ ya, Chineke zara ya, sị: “Gwa ụmụ Izrel nke a, ‘Yahweh, Chineke nke nnanna ụnụ ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb, zitere m nye ụnụ.’ Nke a bụ aha m ebeebe, otu a ka a ga-esi na-echeta m site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.”—Ọpụpụ 3:15.

Mgbe Jizọs na-ekpe ekpere, o kwuru ihe gosiri na ya onwe ya kpọrọ aha Chineke. Ọ sịrị: “Emere m ka ha mata aha gị, aga m na-emekwa ya.” Jizọs kwukwara n’ekpere nke ọtụtụ ndị na-akpọ ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, sị: “Nna anyị nọ n’eluigwe ka otito dịrị aha Gị.”—Jọn 17:26; Matiu 6:9, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Ya mere, ọ bụ ihe ijuanya na Poopu Benedict nke Iri na Isii dere banyere ịkpọ aha Chineke n’akwụkwọ ya bụ́ Jesus of Nazareth, nke e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya, sị: ‘Ndị Izrel mere nnọọ nke ọma ná nkwụsị ha kwụsịrị ịkpọ aha a Chineke na-akpọ onwe ya, nke a na-ede YHWH, ka e wee ghara iweda ya ala, ya na aha arụsị dị iche iche ewee bụrụ otu ihe. N’ihi ya, nsụgharị Baịbụl ndị e wepụtara n’oge na-adịbeghị anya mere ihe na-ezighị ezi mgbe ha depụtara aha a—nke ndị Izrel weere kemgbe na ọ dị omimi nke na a naghị akpọ ya akpọ—dị ka à ga-asị na ọ bụ otu n’ime aha ndị mgbe ochie ọzọ.’

Gịnị ka i chere? Ò ziri ezi, ka ọ̀ dị njọ, ịkpọ aha Chineke? Ọ bụrụ na Jehova n’onwe ya sịrị: “Nke a bụ aha m ebeebe, otu a ka a ga-esi na-echeta m site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,” ò nwere onye ruru eru ịgbagha ya?

[Foto dị na peeji nke 22]

Jizọs kpọrọ aha Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya