Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 2/1 p. 16-17
  • Banyere Ekpere Chineke Na-anụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Banyere Ekpere Chineke Na-anụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekpere niile ọ̀ na-adị Chineke mma?
  • Gịnị ka anyị kwesịrị ikpe n’ekpere?
  • Ànyị kwesịrị ikpe ekpere maka ndị ọzọ?
  • Gịnị mere anyị ga-eji nọgidesie ike n’ekpere?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 2/1 p. 16-17

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Ekpere Chineke Na-anụ

Jizọs na-agakarị ekpe ekpere n’ebe ndị mmadụ na-anọghị. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme otú ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “N’oge ọ nọ n’otu ebe na-ekpe ekpere, mgbe ọ kwụsịrị, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: ‘Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere’ . . . O wee sị ha: ‘Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, “Nna, ka e doo aha gị nsọ.”’” (Luk 5:16; 11:1, 2) Jizọs si otú ahụ gosi na ọ bụ Nna ya, bụ́ Jehova, ka anyị kwesịrị ikpeku ekpere. Ọ bụ naanị ya bụ Onye Okike anyị na “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.

Ekpere niile ọ̀ na-adị Chineke mma?

Ekpere e bu n’isi, a na-ekpe ugboro ugboro, anaghị adị Chineke mma. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.” (Matiu 6:7) Ekpere anyị ga-ekpeku Nna anyị nke eluigwe kwesịrị isi anyị n’obi. N’otu oge, Jizọs mere ka o doo ndị na-eso ụzọ ya anya na Chineke na-anụ ekpere onye ajọ omume nke ji obi ya chọọ ichegharị karịa ekpere onye dị mpako nke na-agbalịsi ike ime ihe okpukpe ya kwuru. (Luk 18:10-14) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nụ ekpere anyị, anyị kwesịrị iji obi umeala na-agbalị ime ihe ọ gwara anyị mee. Jizọs kwuru, sị: “M na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m . . . M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” (Jọn 8:28, 29) Jizọs kpere ekpere, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.”—Luk 22:42.

Gịnị ka anyị kwesịrị ikpe n’ekpere?

Ebe ọ bụ na e kwutọọla aha Chineke, Jizọs sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’” (Matiu 6:9, 10) Anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa n’ihi na ọ bụ ọchịchị Chineke ga-eji eme ka uche ya mezuo ma n’eluigwe ma n’ụwa. Jizọs kwuru na anyị nwere ike ikpe ekpere ka ‘e nye anyị nri anyị ga-eri taa.’ Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka anyị nweta ọrụ, nweta ebe anyị ga-ebi, na uwe anyị ga-eyi. Anyị nwekwara ike ịrịọ maka ahụ́ ike na ihe ndị ọzọ na-akpa anyị. Jizọs kwukwara na anyị kwesịrị ikpe ekpere ka a gbaghara anyị mmehie anyị.—Luk 11:3, 4.

Ànyị kwesịrị ikpe ekpere maka ndị ọzọ?

Jizọs kpere ekpere maka ndị ọzọ. Baịbụl gwara anyị, sị: “A kpọtaara ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka ma kpee ekpere.” (Matiu 19:13) Jizọs gwara Pita onyeozi, sị: “Arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà.” (Luk 22:32) Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha na-ekpe ekpere maka ndị ọzọ, ọbụna ndị na-akpagbu ha na ndị na-akparị ha.—Matiu 5:44; Luk 6:28.

Gịnị mere anyị ga-eji nọgidesie ike n’ekpere?

Jizọs wepụtara oge kpee ekpere, ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya “ka ha na-ekpe ekpere mgbe niile ma ghara ịda mbà.” (Luk 18:1) Jehova gwara anyị ka anyị na-akọrọ ya ihe na-echegbu anyị iji gosi na anyị tụkwasịrị ya obi. Jizọs sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu.” Ma, okwu ahụ Jizọs kwuru apụtaghị na Jehova anachaghị achọ ịza ekpere nke ndị hụrụ ya n’anya dị ka Nna ha ma na-akwanyere ya ùgwù. Kama, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:5-13.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu banyere ekpere, gụọ isi nke 17 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya