Olee Otú Ịmụ Mmadụ Ọzọ Dịruru ná Mkpa?
N’IHE niile ahụ Jizọs na Nikọdimọs kwurịtara, Jizọs gosiri nnọọ na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa. Olee otú o si mee ka nke a doo anya?
N’ụka ahụ Jizọs na Nikọdimọs kparịtara, lee ihe Jizọs kwuru bụ́ nke gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ dị mkpa. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Okwu bụ́ “ọ bụrụ na” na “ọ pụghị” gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na mmadụ asị, “Ọ bụrụ na anwụ achaghị, a pụghị inwe ìhè,” ihe ọ na-ekwu bụ na anwụ bụ ihe dị oké mkpa na-eme ka e nwee ìhè. N’otu aka ahụ, Jizọs kwuru na ịmụ mmadụ ọzọ bụ ihe dị oké mkpa ga-eme ka mmadụ hụ Alaeze Chineke.
Iji mee ka ihe ọ na-ekwu doo anya nke ọma, Jizọs kwuziri, sị: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ.” (Jọn 3:7) O doro anya na dị ka Jizọs kwuru, a ga-amụrịrị mmadụ ọzọ ka onye ahụ nwee ike “ịbanye n’Alaeze Chineke.”—Jọn 3:5.
Ebe ọ bụ na Jizọs kweere na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa otú ahụ, Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ na ha ghọtara nke ọma ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara. Dị ka ihe atụ, ì chere na Onye Kraịst nwere ike iji aka ya họrọ ka a mụọ ya ọzọ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 5]
“Ọ bụrụ na anwụ achaghị, a pụghị inwe ìhè”