Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 7/1 p. 3
  • Mmadụ Ò Nwere Ike Ịghọta Baịbụl?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmadụ Ò Nwere Ike Ịghọta Baịbụl?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Chepụtara Baịbụl Ọ̀ Chọrọ Ka Anyị Ghọta Okwu Ya?
  • 3. Nabata Enyemaka Ndị Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • 1. Gwa Onye Chepụtara ya ka o Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Mmadụ Ịghọtahie Ihe Baịbụl Kwuru, Ọ̀ Bụ Obere Ihe?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 7/1 p. 3

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịghọta Baịbụl?

“Ezinụlọ anyị na-agụ Baịbụl kwa Sunday. Ọ naghị atọcha m ụtọ. M kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke, ma aghọtaghị m ọtụtụ ihe m gụrụ na ya.”—Steven, Britain.

“Mgbe m dị afọ iri na asaa, m nwara ịgụ Baịbụl. O siiri m ike nghọta, n’ihi ya m kwụsịrị ịgụ ya.”—Valvanera, Spen.

“O nwere mgbe m gụrụ Baịbụl maka na m chere na m kwesịrị ịgụ ya ebe m bụ onye Katọlik. O were m afọ atọ ịgụcha ya! Ma, o nweghị ezigbo ihe m ghọtara na ya.”—Jo-Anne, Australia.

BAỊBỤL ka bụ akwụkwọ a kacha mara amara n’ụwa. Ọ ka bụ akwụkwọ a kacha erepụ erepụ, ọtụtụ ndị na-enwetakwa ya n’ọtụtụ asụsụ nakwa n’ụdị dị iche iche karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-esiri ọtụtụ ndị nwere Baịbụl ike ịghọta ya. Ọ̀ na-esiri gịnwa ike?

Onye Chepụtara Baịbụl Ọ̀ Chọrọ Ka Anyị Ghọta Okwu Ya?

Baịbụl kwuru, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) N’ezie, ọ bụ Jehova Chineke chepụtara Baịbụl. Ọ̀ chọrọ ka anyị ghọta Okwu ya? Ka ọ̀ ma ụma mee ka Baịbụl bụrụ akwụkwọ naanị mmadụ ole na ole, dị ka ndị ụkọchukwu na ndị ọkà mmụta Baịbụl, ga-aghọta?

Lebagodị anya n’amaokwu ndị a si na Baịbụl:

“Iwu a m na-enye gị taa esighịrị gị oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe dị anya.”—Diuterọnọmi 30:11.

“Ikpughe okwu gị na-enye ìhè, na-eme ka ndị na-amaghị ihe nwee nghọta.”—Abụ Ọma 119:130.

“N’oge awa ahụ, [Jizọs] nwere oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ, wee sị: ‘Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma ma kpugheere ha ụmụ ọhụrụ.’”—Luk 10:21.

N’ezie, Onye chepụtara Baịbụl chọrọ ka ị ghọta Okwu ya! Ma nke bụ́ eziokwu bụ na akwụkwọ a na-esiri ọtụtụ ndị ji ezi obi na-agụ ya ike nghọta. Olee ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịghọta ya? Isiokwu ndị na-esonụ tụrụ aro atọ ndị nwere ike inyere gị aka ịghọta Baịbụl.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya