Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 10/1 p. 23
  • “Onye Na-anụ Ekpere”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Onye Na-anụ Ekpere”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ụdị Onye Ekpere M Na-egosi na M Bụ?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ònye Bụ Onye Na-anụ Ekpere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Toonụ Jehova, Onye Na-anụ Ekpere
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Ọ “Maara Obi Ụmụ Mmadụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 10/1 p. 23

Bịaruo Chineke Nso

“Onye Na-anụ Ekpere”

1 IHE E MERE 4:9, 10

JEHOVA CHINEKE ọ̀ na-aza ekpere nke ndị ji obi ha niile na-efe ya? Ihe Baịbụl kọrọ banyere otu nwoke anyị na-amaghị ọtụtụ ihe banyere ya, nke aha ya bụ Jebez, na-egosi na Jehova bụ n’ezie “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Akụkọ a dị mkpirikpi dị n’ebe nwere ike ịtụ ọtụtụ ndị n’anya—n’ihe ndekọ usoro ọmụmụ nke malitere akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ. Ka anyị tụlee 1 Ihe E Mere 4:9, 10.

Naanị ihe anyị maara banyere Jebez dị n’amaokwu abụọ ahụ. Amaokwu 9 kwuru na nne ya “gụrụ ya Jebez, sị: ‘M mụrụ ya n’ihe mgbu.’”a Olee ihe mere nne ya ji họrọ aha ahụ? Ihe mgbu o nwere mgbe ọ mụrụ nwa nwoke a ọ̀ karịrị nke ụmụ nwaanyị na-enwekarị mgbe ha na-amụ nwa? Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ, ya ana-ewute ya na di ya anọghị hụ nwa ọhụrụ ha? Baịbụl agwaghị anyị. Ma otu ụbọchị, a ga-enwe ihe ga-eme ka nwaanyị a jiri nnọọ nwa a mee ọnụ. O nwere ike ịbụ na ụmụnne Jebez bụcha ezigbo mmadụ, ma “Jebez [ghọrọ] onye a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya.”

Jebez ejighị ekpere egwuri egwu. Ọ malitere ekpere ya site n’ịrịọ Chineke ka ọ gọzie ya. Ọ rịọziri arịrịọ atọ ndị gosiri na o nwere okwukwe siri ike.

Nke mbụ, Jebez rịọrọ Chineke, sị: “Mee ka ókèala m sakwuo mbara.” (Amaokwu 10) Nwoke a a na-asọpụrụ abụghị onye anyaukwu nke na-achọ ịnara ndị mmadụ ala ha. O nwere ike ịbụ na ihe ọ rịọsiri ike bụ mmadụ, ọ bụghị ala. Ọ ga-abụ na ọ na-arịọ ka ókèala ya sakwuo mbara n’udo ka o nwee ike ịba ndị ọzọ na-efe ezi Chineke ofufe.b

Nke abụọ, Jebez rịọrọ ka “aka” Chineke dịnyere ya. Aka ihe atụ Chineke bụ ike o ji na-arụ ọrụ, bụ́ nke o ji enyere ndị na-efe ya aka. (1 Ihe E Mere 29:12) Onye Jebez tụrụ anya isi n’aka ya nweta ihe niile obi ya na-arịọ bụ Chineke nke aka ya na-adịghị mkpụmkpụ imere ndị nwere okwukwe na ya ihe ha rịọrọ.—Aịzaya 59:1.

Nke atọ, Jebez kpere ekpere, sị: “Gị echebekwa m n’ọdachi, ka ọ ghara imerụ m ahụ́.” O nwere ike ịbụ na okwu bụ́ “ka ọ ghara imerụ m ahụ́” na-egosi na Jebez kpere ekpere, ọ bụghị ka ọ gbanahụ ọdachi, kama ka e chebe ya ka ihe ọjọọ ghara ịkpatara ya obi mgbawa ma ọ bụ merie ya.

Ekpere Jebez gosiri na ọ na-echegbu onwe ya banyere ezi ofufe nakwa na o nwere okwukwe n’ebe Onye na-anụ ekpere nọ, tụkwasịkwa ya obi. Olee ihe Jehova mere banyere arịrịọ ya? Akụkọ a dị nkenke ji okwu ndị a mechie: “Chineke wee meere ya ihe ọ rịọrọ.”

Onye ahụ na-anụ ekpere agbanwebeghị. Ekpere nke ndị na-efe ya na-atọ ya ụtọ. Ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ma tụkwasị ya obi nwere ike inwe obi ike a: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Aha ahụ bụ́ Jebez si n’okwu nwere ike ịpụta “ihe mgbu.”

b Targum, bụ́ Akwụkwọ Nsọ ndị Juu a kọwara akọwa, sụgharịrị okwu Jebez otú a: “Jiri ụmụ gọzie m, jirikwa ndị na-eso ụzọ mee ka ókèala m saa mbara.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya