Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 3/15 p. 12-16
  • Tụkwasị Jehova Obi Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tụkwasị Jehova Obi Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Tụkwasị Chineke Obi Mgbe Ọ Dị Gị Ka Gị Mee Ihe Na-adịghị Mma
  • Tụkwasị Chineke Obi Mgbe A Na-enweghị Mmasị n’Ozi Ọma Ị Na-ezi Nakwa Mgbe A Na-akpagbu Gị
  • Tụkwasị Chineke Obi Mgbe Ị Na-enwe Nchegbu
  • Ka “Udo nke Chineke” Na-eche Obi Unu Nche
  • Mee Ka Ntụkwasị Obi Gị n’Ebe JEHOVA Nọ Sikwuo Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ntụkwasị Obi Dị Mkpa Iji Bie Ndụ Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ị Ga-atụkwasịli Ụmụnna Gị Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 3/15 p. 12-16

Tụkwasị Jehova Obi Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso

“Tụkwasịnụ Jehova obi mgbe niile.”—AỊZA. 26:4.

1. Olee otú ndị ohu Chineke si dị iche ná ndị ọzọ nọ n’ụwa?

ANYỊ bi n’ụwa ebe ọtụtụ nde mmadụ na-amaghịzi onye ha ga-atụkwasị obi ma ọ bụ ihe ha ga-atụkwasị obi. Ikekwe, ihe mere nke a ji dị otú a bụ n’ihi na e mewaala ha obi ọtụtụ ugboro. Ndị ohu Jehova dị nnọọ iche. Ebe amamihe Chineke na-eduzi ha, ha ma na ha ekwesịghị ịtụkwasị ụwa a ma ọ bụkwanụ “ndị a ma ama” nọ n’ime ya obi. (Ọma 146:3) Kama nke ahụ, ha tinyere ndụ ha n’aka Jehova, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-eme ka ihe dịrị ha mma n’ọdịnihu n’ihi na ha ma na ọ hụrụ ha n’anya nakwa na ọ ga-emezu ihe niile o kwuru.—Rom 3:4; 8:38, 39.

2. Olee otú Jọshụa si gosi na Chineke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi?

2 Jọshụa, bụ́ onye dịrị ndụ n’oge ochie, gosiri na Chineke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi. Obere oge tupu ya anwụọ, ọ gwara ndị Izrel ibe ya, sị: “Unu jikwa obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu.”—Jọsh. 23:14.

3. Gịnị ka aha Chineke na-eme ka anyị mara banyere ya?

3 Ihe mere Jehova ji emezu nkwa ya abụghị naanị n’ihi na ọ hụrụ ndị ohu ya n’anya, kamakwa ọ bụ n’ihi aha ya. (Ọpụ. 3:14; 1 Sam. 12:22) Okwu mmalite nke Baịbụl bụ́ The Emphasized Bible, bụ́ nke J. B. Rotherham sụgharịrị kọwara na aha Chineke pụtara na Chineke nwere ike ịghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nkwa ya. Mgbe ọ bụla anyị nụrụ aha ya, anyị na-echeta na ọ na-emezu ihe ọ bụla o kwuru. Ọ na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ ime n’oge ọ bụla ma ọ bụkwanụ n’ebe ọ bụla. O nweghị ihe na-esiri ya ike omume. Chineke ga-emerịrị ihe kwekọrọ n’aha ya.

4. (a) Gịnị ka Aịzaya 26:4 na-agba anyị ume ka anyị mee? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Jụọ onwe gị, sị: ‘Àma m Jehova nke ọma ruo otú ga-eme ka m tụkwasị ya obi? Nke a ò meela ka m ghara ịtụ egwu ihe ọdịnihu ga-eweta ebe m maara na Chineke nọ ya?’ Aịzaya 26:4 sịrị: “Tụkwasịnụ Jehova obi mgbe niile, n’ihi na Jaa Jehova bụ Oké Nkume mgbe ebighị ebi.” Ọ bụ eziokwu na Chineke anaghị arụrụ ndị ohu ya ọrụ ebube ugbu a otú o mere mgbe ụfọdụ n’oge e dere Baịbụl, ma, anyị nwere ike ịtụkwasị ya obi “mgbe niile” n’ihi na ọ bụ “Oké Nkume mgbe ebighị ebi.” Olee otú Chineke anyị kwesịrị ka a tụkwasị ya obi si enyere ndị ohu ya nọsiri ike na-efe ya ofufe aka taa? Ka anyị tụlee ụzọ atọ o si eme nke a: Ọ na-eme ka okwukwe anyị sie ike mgbe anyị rịọrọ ya ka o nyere anyị aka ka anyị merie ọnwụnwa bịaara anyị, ọ na-enyere anyị aka mgbe anyị zutere ndị na-enweghị mmasị n’ozi ọma anyị ma ọ bụkwanụ mgbe a na-akpagbu anyị, ọ na-agbakwa anyị ume mgbe anyị nwere ọtụtụ ihe na-echu anyị ụra. Ka anyị na-atụle ihe ndị a, chee echiche otú i nwere ike isi tụkwasịkwuo Jehova obi.

Tụkwasị Chineke Obi Mgbe Ọ Dị Gị Ka Gị Mee Ihe Na-adịghị Mma

5. Olee mgbe ịtụkwasị Chineke obi na-akacha esiri anyị ike?

5 O nwere ike ịdịrị anyị mfe ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-emezu nkwa o kwere iweta Paradaịs nakwa na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, bụ́kwanụ ihe ndị anyị na-achọsi ike. Ma, o nwere ike isiri anyị ike ịtụkwasị ya obi mgbe anyị na-ekpebi ụdị omume anyị ga-eme. O nwere ike isiri anyị ike ikwetacha na ọ ga-akara anyị mma ma anyị mee ihe o kwuru, nakwa na ime ihe o kwuru ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ dị ukwuu. Eze Sọlọmọn dere ndụmọdụ a, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” (Ilu 3:5, 6) Ị̀ chọpụtara na e kwuru okwu banyere “ụzọ” n’ebe a? N’eziokwu, ihe niile anyị na-eme ná ndụ, ọ bụghị naanị olileanya anyị nwere, kwesịrị igosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị?

6. Gịnị ga-enyere anyị aka ikpebisi ike na anyị agaghị na-eche ihe ọjọọ n’echiche?

6 Anyị ga-ebu ụzọ wepụ ihe ọjọọ n’obi anyị tupu anyị enwee ike ịhapụ ihe ọjọọ ahụ. (Gụọ Ndị Rom 8:5; Ndị Efesọs 2:3.) Oleezi otú i nwere ike isi kpebisie ike ịkwụsị iche ihe ọjọọ n’echiche? Tụlee ihe ise a: Nke mbụ: Rịọ Chineke n’ekpere ka o nyere gị aka. (Mat. 6:9, 13) Nke abụọ: Tụgharịa uche n’akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl banyere ndị na-egeghị Jehova ntị na ndị gere ya ntị. Mata otú ihe si gaara onye ọ bụla n’ime ha.a (1 Kọr. 10:8-11) Nke atọ: Chee echiche banyere obi mgbawa mmehie nwere ike ịkpatara gị na ndị ị hụrụ n’anya. Nke anọ: Chee echiche otú ọ ga-adị Chineke ma ọ bụrụ otu n’ime ndị ohu ya emee mmehie dị oké njọ. (Gụọ Abụ Ọma 78:40, 41.) Nke ise: Chee ụdị ọṅụ Jehova ga-enwe mgbe ọ hụrụ ka ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ itinye aka n’ihe ọjọọ ma na-eme ezi ihe, ma mgbe ya na ndị ọzọ nọ ma mgbe ọ nọ naanị ya. (Ọma 15:1, 2; Ilu 27:11) Gịnwa nwekwara ike igosi na ị tụkwasịrị Jehova obi.

Tụkwasị Chineke Obi Mgbe A Na-enweghị Mmasị n’Ozi Ọma Ị Na-ezi Nakwa Mgbe A Na-akpagbu Gị

7. Olee ule ndị bịaara Jeremaya, oleekwa otú nke a dị ya mgbe ụfọdụ?

7 Ọtụtụ ụmụnna anyị na-eje ozi ọma n’ókèala ebe ha nwere ọtụtụ ihe ha na-edi. Jeremaya jere ozi n’ụdị ebe a, ya bụ, na Juda n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu, mgbe e nwere nnukwu ọgba aghara. E nwere ọtụtụ ule ndị bịaara ya n’ihi na o rubeere Chineke isi wee kpọsaa ikpe ọ mara Juda. E nwedịrị mgbe odeakwụkwọ ya nke na-arụsi ọrụ ike, bụ́ Barọk, kwuru na ike agwụla ya. (Jere. 45:2, 3) Jeremaya ò kwere ka ihe ndị a mee ka ọ daa mbà? N’eziokwu, e nwere mgbe o nwere nkụda mmụọ. O kwuru, sị: “Ka ụbọchị a mụrụ m bụrụ ụbọchị a bụrụ ọnụ! . . . Gịnị mere m ji si n’afọ nne m pụta ka m bịa hụ ọrụ ike na iru uju, ụbọchị ndụ m ewee gwụchaa naanị n’ihere?”—Jere. 20:14, 15, 18.

8, 9. Dị ka e kwuru na Jeremaya 17:7, 8 na Abụ Ọma 1:1-3, gịnị ka anyị kwesịrị ime iji nwee ike ịnọgide na-amị ezigbo mkpụrụ?

8 Ma, Jeremaya adaghị mbà. Ọ nọgidere na-atụkwasị Jehova obi. Nke a mere ka onye amụma a kwesịrị ntụkwasị obi hụ mgbe Jehova mezuru ihe ahụ o dere na Jeremaya 17:7, 8, bụ́ ebe sịrị: “Ngọzi na-adịrị dimkpa nke tụkwasịrị Jehova obi, onye Jehova bụ obi ike ya. Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ n’akụkụ ọwa mmiri; ọ gaghịkwa ahụ mgbe okpomọkụ bịara, kama akwụkwọ ya ga na-ama pokopoko. Ọ gaghị echegbu onwe ya n’afọ e nwere ụkọ mmiri ozuzo, ọ gaghịkwa akwụsị ịmị mkpụrụ.”

9 Dị ka osisi ahụ́ dị mma nke “a kụrụ n’akụkụ mmiri,” ma ọ bụkwanụ nke a kụrụ n’ubi a na-akụ mkpụrụ osisi, bụ́ ebe a na-agba mmiri nke ọma, Jeremaya akwụsịghị “ịmị mkpụrụ.” O kweghị ka ndị ajọ mmadụ na-akwa emo mee ka ọ daa mbà. Kama nke ahụ, o guzosiri ike n’akụkụ Isi Iyi nke “mmiri” na-enye ndụ ma mee ihe niile Jehova gwara ya mee. (Gụọ Abụ Ọma 1:1-3; Jere. 20:9) Jeremaya setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya, karịchaa ndị na-ejere Chineke ozi n’ókèala ọtụtụ ndị na-anaghị anabata ozi ọma. Ọ bụrụ otú a ka ọ dị n’ebe i bi, nọgide na-atụkwasị Jehova obi kpamkpam, ọ ga-eme ka i jiri ntachi obi “na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.”—Hib. 13:15.

10. Olee ihe ndị Chineke nyere anyị, oleekwa ihe anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

10 Jehova enyela anyị ọtụtụ ihe ndị ga-enyere anyị aka idi ihe ndị na-abịara anyị n’ụbọchị ikpeazụ a. Otu n’ime ihe ndị o nyere anyị bụ Okwu ya nke zuru ezu, bụ́ nke a sụgharịrị nke ọma n’ọtụtụ asụsụ. Ọ na-enye anyị nri ime mmụọ hiri nne n’oge kwesịrị ekwesị site n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. O mekwaala ka anyị nwee ìgwè ụmụnna anyị ndị anyị na ha na-anọ n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ dị iche iche, bụ́ ndị na-enyere anyị aka. Ị̀ na-ekwe ka ihe a niile na-abara gị uru? Ndị niile kwere ka ha baara ha uru “ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị ha mma.” Ma, ndị na-ekweghị ege Chineke ntị ‘ga-eti mkpu ákwá n’ihi obi mwute, ha ga-akwakwa ákwá n’ihi ịda mbà na mmụọ.’—Aịza. 65:13, 14.

Tụkwasị Chineke Obi Mgbe Ị Na-enwe Nchegbu

11, 12. Olee ihe anyị kwesịrị ime n’ihi nsogbu juru n’ụwa?

11 Dị ka e buru n’amụma, nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe na-aka njọ. (Mat. 24:6-8; Mkpu. 12:12) Ka nsogbu ndị a na-akakwu njọ, ọtụtụ nde mmadụ na-eche na ndị ọchịchị, ndị okpukpe, na nkà na ụzụ ga-echebe ha. Ha na-echekwa na o nweghị ihe ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha enwee ego hiri nne. Ma, o nweghị nke ọ bụla n’ihe ndị a nke ga-echebeli ha. (Jere. 17:5, 6) Ma, ndị ohu Jehova nwere ebe ha ga-agbaba obi eruo ha ala, ya bụ, ‘n’Oké Nkume mgbe ebighị ebi.’ (Aịza. 26:4) Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “[Jehova] bụ oké nkume m na nzọpụta m, ebe m dị elu e wusiri ike.” (Gụọ Abụ Ọma 62:6-9.) Olee otú anyị ga-esi eme Oké Nkume a ebe mgbaba anyị?

12 Anyị na-arapara Jehova n’ahụ́ mgbe anyị mere ihe e dere n’Okwu ya, bụ́ nke na-adịkarị iche n’amamihe mmadụ. (Ọma 73:23, 24) Dị ka ihe atụ, ndị na-ege ntị n’amamihe mmadụ nwere ike ịna-ekwu, sị: ‘Kporie ndụ na ndụ adịghị abụọ.’ ‘Chọta ọrụ ga na-enye gị ezigbo ego.’ ‘Kpatahie ego nne.’ ‘Zụta nke a, zụta nke a.’ ‘Pụtụ apụ gaa hụ ụwa.’ Ma, amamihe Chineke kwekọrọ na ndụmọdụ bụ́: “Ka ndị ji ụwa eme ihe dịrịkwa ka ndị na-adịghị eji ya eme ihe n’uju; n’ihi na ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (1 Kọr. 7:31) Jizọs gbakwara anyị ume ka anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, si otú a ‘na-akpakọba akụ̀ n’eluigwe,’ bụ́ ebe ọ na-enweghị ihe ọ bụla ga-eme ya.—Mat. 6:19, 20.

13. Olee ajụjụ ihe dị na 1 Jọn 2:15-17 kwesịrị ime ka anyị jụọ onwe anyị?

13 Otú i si ele “ụwa” na “ihe ndị dị n’ụwa” anya ọ̀ na-egosi na ị tụkwasịrị Chineke obi kpamkpam? (1 Jọn 2:15-17) Akụ̀ ime mmụọ ndị i nwere na ihe ùgwù i nwere ijere Jehova ozi hà dị oké ọnụ ahịa n’anya gị karịa ihe ndị dị n’ụwa? (Fil. 3:8) Ị̀ na-agbasi mbọ ike ka ‘anya gị na-elegide otu ebe’? (Mat. 6:22) N’eziokwu, Chineke achọghị ka ị ghara iji ezi uche na-eme ihe, karịchaa ma ọ bụrụ na i nwere ezinụlọ ị na-elekọta. (1 Tim. 5:8) Ma, ọ chọrọ ka ndị ohu ya tụkwasị ya obi kpamkpam, ọ bụghị ụwa Setan nke na-ala n’iyi.—Hib. 13:5.

14-16. Olee otú ụfọdụ ndị sirila rite uru site n’ime ka ‘anya ha na-elegide otu ebe’ nakwa site n’ibute Alaeze Chineke ụzọ?

14 Tụlee ihe banyere Richard na Ruth, bụ́ nne na nna mụrụ ụmụ atọ. Richard kwuru, sị: “Obi m na-agwa m na m nwere ike imekwu ihe n’ozi Jehova. Abara m ọgaranya, ma, ọ dị m ka ihe m na-enye Chineke bụ ihe m rifọrọ erifọ. Mgbe mụ na Ruth kpechara ekpere banyere nke a ma chee ihe ọ ga-ewe, anyị kpebiri na m ga-arịọ onyeisi ọrụ m ka m na-arụzi ọrụ ụbọchị anọ n’izu, n’agbanyeghị na ihe siri ike ná mba anyị. Ọ nabatara ihe m rịọrọ ya, amalitekwara m ịrụ ọrụ ụbọchị anọ n’izu n’ọnwa sochirinụ.” Olee otú obi dị Richard ugbu a?

15 O kwuru, sị: “Ihe a na-akwụ m agbadaala, ma enwekwuola m ụbọchị iri ise n’afọ nke mụ na ezinụlọ m ga-eji na-anọ nakwa nke m ga-eji na-akụziri ụmụ m ihe. Oge m ji aga ozi ọma ejirila okpukpu abụọ karịa nke m jibu aga ozi ọma, ọnụ ọgụgụ ndị m na-amụrụ Baịbụl ejirikwala okpukpu atọ karịa ndị m nweburu, m na-arụkwa ọrụ ka ukwuu n’ọgbakọ. Ebe m na-enwekwu ohere ilekọta ụmụ anyị, Ruth na-enwe ike ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge. Ekpebiela m ịnọgide na-arụsi ọrụ ike otú a.”

16 Roy na Petina, bụ́ ndị ha na nwa ha nwaanyị ka bi, belatara oge ha ji arụ ọrụ ego ka ha wee nwee ike ịbanye n’ozi oge niile. Roy kwuru, sị: “M na-arụ ọrụ ụbọchị atọ n’izu ebe Petina na-arụ ọrụ ụbọchị abụọ n’izu. Anyị sikwa n’ụlọ anyị bi kwafee na nke dị ọnụ ala, bụ́ nke ga-adịrị anyị mfe nlekọta. Anyị rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ ruo mgbe anyị mụrụ nwa anyị nwoke na nwa anyị nwaanyị, ọ ka dịkwa anyị n’obi ịsụ ụzọ. N’ihi ya, mgbe ụmụ anyị toro, anyị banyeghachiri n’ọrụ ịsụ ụzọ. E nweghị ego a ga-eji tụnyere ngọzi ndị anyị nwetarala.”

Ka “Udo nke Chineke” Na-eche Obi Unu Nche

17. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si akasi gị obi n’agbanyeghị na o nweghị onye ma echi?

17 Ọ dịghị onye n’ime anyị ma echi, n’ihi na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” na-abịakwasị anyị niile. (Ekli. 9:11) Ma, na anyị amaghị echi ekwesịghị ime ka obi koro anyị n’elu, dị ka ọ na-adị ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma. (Mat. 6:34) Pọl onyeozi dere, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.”—Fil. 4:6, 7.

18, 19. Olee otú Chineke si akasi anyị obi? Nye ihe atụ.

18 Udo nke Jehova emeela ka ahụ́ ruo ọtụtụ ụmụnna anyị ndị ihe na-esiri ike ala. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Otu dọkịta na-awa ahụ́ gbalịrị ọtụtụ ugboro ime ka m kwere ka a mịnye m ọbara. Ekele ọ na-ekele m ma ọ hụ m bụ ịjụ m ma m ka siri ọnwụ na mụ agaghị anara ọbara. Ma, m na-ekpeku Jehova ekpere n’obi m, ahụ́ na-erukwa m ala ma m kpechaa. Obi na-esi m ike ka okwute. N’agbanyeghị na ume adịghị m n’ihi na ọbara adịchaghị m n’ahụ́, m ji Akwụkwọ Nsọ mee ka ha ghọta ihe mere na m gaghị anara ọbara.”

19 Chineke nwere ike inyere anyị aka mgbe ụfọdụ site n’izite nwanna anyị nke ga-abịa kasie anyị obi ma ọ bụkwanụ site n’inye anyị nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. Eleghị anya, ị nụtụla mgbe otu nwanna kwuru, sị: “Isiokwu a ruru m n’ahụ́. Ọ bụ m ka e kwo dee ya!” N’eziokwu, n’agbanyeghị ihe bụ́ nsogbu ma ọ bụ mkpa anyị, Jehova ga-egosi anyị na ya hụrụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi. A sị kwuwe, anyị bụ “atụrụ” ya, ọ kpọkwasịkwara anyị aha ya.—Ọma 100:3; Jọn 10:16; Ọrụ 15:14, 17.

20. Gịnị mere a ga-eji echebe ndị ohu Jehova mgbe a ga-ebibi ụwa Setan?

20 “N’ụbọchị oké iwe Jehova” nke na-eru nso n’ike n’ike, ihe niile ụwa Setan tụkwasịrị obi ga-ala n’iyi. Ọlaedo, ọlaọcha, na ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa, agaghị echebe ndị mmadụ. (Zef. 1:18; Ilu 11:4) Naanị ebe mgbaba a ga-enwe bụ ‘Oké Nkume anyị nke mgbe ebighị ebi.’ (Aịza. 26:4) Ya mere, ka anyị gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam ugbu a site n’ịkọsara ya ihe na-echegbu anyị, site n’irubere ya isi ma na-eje ije n’ụzọ ezi omume ya, nakwa site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ya n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị enweghị mmasị, e nweekwa ndị na-akpagbu anyị. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị “ga-ebi n’obi iru ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa enye [anyị] nsogbu.”—Ilu 1:33.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Gụọ akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” peeji nke 102-106.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

Olee otú anyị nwere ike isi tụkwasị Chineke obi

• mgbe ọ dị anyị ka anyị tinye aka n’ihe ọjọọ?

• mgbe e nwere ndị na-enweghị mmasị n’ozi ọma anyị, ma ọ bụkwanụ mgbe a na-akpagbu anyị?

• mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị?

[Foto dị na peeji nke 13]

Anyị ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Chineke kwuru

[Foto dị na peeji nke 15]

“Jehova bụ Oké Nkume mgbe ebighị ebi”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya