Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 4/15 p. 22-26
  • Jehova Maara Otú O Si Anapụta Ndị Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Maara Otú O Si Anapụta Ndị Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A NAPỤTARA YA N’IJU MMIRI AHỤ
  • A NAPỤTARA HA N’OKÉ OSIMIRI UHIE
  • HA LANAHỤRỤ MBIBI JERUSELEM
  • E MEELA KA OBI SIE ANYỊ IKE MAKA IHE GA-EME N’ỌDỊNIHU
  • Ụgbọ Noa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • E Chebere “Ya na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ—Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Nkịtị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 4/15 p. 22-26

Jehova Maara Otú O Si Anapụta Ndị Ya

“Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ [ya] n’ọnwụnwa.”—2 PITA 2:9.

GỊNỊ MERE OBI JI KWESỊ ISI ANYỊ IKE NA JEHOVA:

Maara mgbe ọ ga-emezu nzube ya?

Ga-eji ike ya napụta ndị ya?

Maara ihe ndị ga-eme n’oké mkpagbu ahụ?

1. Olee ihe ndị ga na-eme ‘n’oké mkpagbu’ ahụ?

A GA-EBIBI ụwa Setan n’otu ntabi anya, mgbe ndị mmadụ na-atụghị anya ya. (1 Tesa. 5:2, 3) ‘N’oké ụbọchị Jehova,’ ndị mmadụ ga-anọ n’ọgba aghara. (Zef. 1:14-17) Ihe ga-esi ezigbo ike, ndị mmadụ ga-anọkwa n’ụkọ. Ọ ga-abụ oge nsogbu “nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a.”—Gụọ Matiu 24:21, 22.

2, 3. (a) Olee nsogbu ga-abịara ndị Chineke ‘n’oké mkpagbu’ ahụ? (b) Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara ịtụ ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu?

2 Ka “oké mkpagbu” ahụ na-agwụ, “Gọg nke ala Megọg” ga-ebuso ndị Chineke agha kpụ ọkụ n’ọnụ. N’oge ahụ, “ọtụtụ ndị agha” ga-abịa ibuso ndị Chineke agha, chọọkwa ‘ikpuchi ala ha dị ka ígwé ojii.’ (Ezik. 38:2, 14-16) O nweghị òtù ụmụ mmadụ ga-agbatara ndị Jehova ọsọ enyemaka. Ọ bụ naanị Chineke ga-anapụta ha. Gịnị ka ha ga-eme mgbe ahụ ọ ga-eyi ka à na-aga igbuchapụ ha?

3 Ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova, ì kweere na Jehova ga-anapụtali ndị ya n’oké mkpagbu ahụ? Pita onyeozi dere, sị: “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa, ma ọ ga-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee bipụ ha.” (2 Pita 2:9) Ịtụgharị uche n’otú Jehova si napụta ndị ya n’oge gara aga ga-eme ka anyị ghara ịtụ ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ka anyị tụlee ihe atụ atọ ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-anapụtali ndị ya.

A NAPỤTARA YA N’IJU MMIRI AHỤ

4. Olee ihe ndị a ga-emerịrị tupu Iju Mmiri ahụ amalite?

4 Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere Iju Mmiri nke oge Noa. Iji mee uche Jehova, e nwere ihe ndị e kwesịrị ime tupu Iju Mmiri ahụ amalite. A ga-arụcharịrị nnukwu ụgbọ ahụ, chịbakwa ụmụ anụmanụ n’ime ya. Akwụkwọ Jenesis gosiri na Jehova echereghị ka a rụchaa ụgbọ ahụ tupu ya ekpebie mgbe Iju Mmiri ahụ ga-amalite, ka à ga-asị na ọ ga-agbanwe ya ma ọ bụrụ na a rụchaghị ụgbọ ahụ n’oge. Kama nke ahụ, ọtụtụ afọ tupu Chineke agwa Noa ka ọ rụọ ụgbọ ahụ, o kpebiela mgbe Iju Mmiri ahụ ga-amalite. Olee otú anyị si mara?

5. Gịnị ka ihe ahụ Jehova kwuru na Jenesis 6:3 pụtara, oleekwa mgbe o kwuru ya?

5 Baịbụl gwara anyị na Jehova nọ n’eluigwe nye iwu. Jenesis 6:3 kwuru na ọ sịrị: “Mmụọ m agaghị enwere mmadụ ndidi ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihi na ya onwe ya bụ anụ ahụ́. N’ihi ya, ụbọchị ya ga-adị otu narị afọ na iri abụọ.” Ihe o kwuru ebe a abụghị afọ ole ndị mmadụ ga na-adị ndụ. Ihe Jehova kpebiri bụ mgbe ọ ga-ekpochapụ ndị na-anaghị asọpụrụ ya n’ụwa.a Ebe ọ bụ na Iju Mmiri ahụ malitere n’afọ 2370 T.O.A., ọ pụtara na Chineke kwuru ihe a n’afọ 2490 T.O.A. N’oge ahụ, Noa dị narị afọ anọ na iri asatọ. (Jen. 7:6) Mgbe ihe dị ka iri afọ abụọ gachara, n’afọ 2470 T.O.A., Noa malitere ịmụ ụmụ. (Jen. 5:32) Ọ fọrọ ihe dị ka otu narị afọ tupu Iju Mmiri ahụ amalite, ma Jehova agwabeghị Noa ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụ iji chebe ezinụlọ ya. Chineke ọ̀ ga-eche afọ ole tupu ya agwa ya Noa?

6. Olee mgbe Jehova nyere Noa iwu ka ọ rụọ ụgbọ?

6 O nwere ike ịbụ na Jehova cheere ruo ọtụtụ afọ tupu ya agwa Noa ihe ọ chọrọ ime. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ihe e dere na Jenesis gosiri na ụmụ Noa etoola, lụọkwa nwaanyị mgbe Chineke nyere Noa iwu ka ọ rụọ ụgbọ ahụ. Jehova gwara ya, sị: “M na-eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị n’etiti mụ na gị; ị ga-abanyekwa n’ụgbọ ahụ, gị na ụmụ gị na nwunye gị na ndị nwunye ụmụ gị.” (Jen. 6:9-18) N’ihi ya, mgbe Chineke gwara Noa ka ọ malite ịrụ ụgbọ ahụ, ọ ga-abụ na ọ fọrọ naanị iri afọ anọ ma ọ bụ iri afọ ise ka Iju Mmiri ahụ malite.

7. (a) Olee otú Noa na ndị ezinụlọ ya si gosi na ha nwere okwukwe? (b) Olee mgbe Chineke mechara gwa Noa kpọmkwem mgbe Iju Mmiri ahụ ga-amalite?

7 Ka Noa na ezinụlọ ya na-arụ ụgbọ ahụ, ọ ga-abụrịrị na ha nọ na-eche otú Chineke ga-esi emezu nzube ya na mgbe Iju Mmiri ahụ ga-amalite. Ma, ha akwụsịghị ịrụ ụgbọ ahụ n’ihi na ha amaghị ihe ndị ahụ. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị, sị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.” (Jen. 6:22) Jehova mechara gwa Noa na ọ fọrọ ụbọchị asaa ka Iju Mmiri ahụ malite. Oge ahụ ga-ezuru Noa na ezinụlọ ya ịchịbasị ụmụ anụmanụ n’ụgbọ ahụ. N’ihi ya, mgbe e meghere ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe “na narị afọ nke isii ná ndụ Noa, n’ọnwa nke abụọ, n’abalị iri na asaa n’ọnwa ahụ,” e mechaala ihe niile e kwesịrị ime.—Jen. 7:1-5, 11.

8. Olee otú akụkọ Iju Mmiri ahụ si eme ka obi sie anyị ike na Jehova maara otú o si anapụta ndị ya?

8 Akụkọ Iju Mmiri ahụ gosiri na Jehova bụ Onye Na-edebe Oge, bụrụkwa Onye Nnapụta. Ka ụbọchị Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ a na-eru nso, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe niile o zubere ga-emezu n’oge ọ kara aka, kpọmkwem ‘n’ụbọchị ahụ na n’oge awa ahụ.’—Mat. 24:36; gụọ Habakọk 2:3.

A NAPỤTARA HA N’OKÉ OSIMIRI UHIE

9, 10. Olee otú Jehova si jiri ndị ya rata ụsụụ ndị agha Ijipt?

9 Ihe anyị tụlerela emeela ka anyị hụ na Jehova maara mgbe ọ ga-emezu ihe niile o zubere. Ihe atụ nke abụọ anyị ga-atụle ga-eme ka anyị ghọta ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-anapụta ndị ya. Ọ ga-eji ike ya na-enweghị atụ mezuo uche ya. N’ihi otú o si doo anya na Jehova ga-anapụta ndị ya, mgbe ụfọdụ, ọ na-eji ha arata ndị iro ya. Ọ bụ ihe merenụ mgbe ọ napụtara ndị Izrel n’Ijipt.

10 O nwere ike ịbụ na ndị Izrel ruru ihe dị ka nde mmadụ atọ mgbe ha hapụrụ Ijipt. Jehova si n’aka Mozis duo ha otú mere ka Fero chee na ha nọ ná mgbagwoju anya wee na-awagharị. (Gụọ Ọpụpụ 14:1-4.) Fero kwere ka e jiri ndị Izrel rata ya. N’ihi ya, o du ụsụụ ndị agha ya chụwa ndị ahụ bụ́bu ndị ohu ya, chụkwutekwa ha n’Oké Osimiri Uhie. Ọ dị ka o nweghị otú ndị Izrel ga-esi gbaa ọsọ. (Ọpụ. 14:5-10) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị ihe ga-eme ndị Izrel. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova ga-anapụta ha.

11, 12. (a) Olee otú Jehova si gbatara ndị ya ọsọ enyemaka? (b) Gịnị mere n’ihi ọsọ enyemaka ahụ Chineke gbataara ha, oleekwa ihe akụkọ a na-akụziri anyị banyere Jehova?

11 “Ogidi ígwé ojii” nke na-edu ndị Izrel gara n’azụ ha, mee ka Fero na ndị agha ya ghara ijide ndị Izrel, meekwa ka ha nọrọ n’ọchịchịrị. Ma, Jehova mere ka ogidi ígwé ojii ahụ na-enye ndị Izrel ìhè n’abalị. (Gụọ Ọpụpụ 14:19, 20.) Jehova jizi oké ifufe siri ike nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ kewaa oké osimiri ahụ abụọ ma mee “ka ala oké osimiri ahụ ghọọ ala akọrọ.” O doro anya na o were oge buru ibu, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “E mesịa, ụmụ Izrel gafere n’etiti oké osimiri ahụ, n’ala akọrọ.” Ọ bụrụ na e jiri ndị Izrel tụnyere ndị agha Fero na ụgbọ ịnyịnya agha ha, a ga-asị na ndị Izrel na-arị ka eju. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweghị otú ndị Ijipt ga-esi ejide ha, n’ihi na Jehova na-alụrụ ndị Izrel agha. “O wee tinye ndị agha Ijipt n’ọgba aghara. O wee na-ahịọpụsị ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha nke mere na ọ nọ na-esiri ha ike ịgba ya.”—Ọpụ. 14:21-25.

12 Ozugbo ndị Izrel niile gafechara n’akụkụ nke ọzọ nke oké osimiri ahụ, Jehova nyere Mozis iwu, sị: “Setịa aka gị n’elu oké osimiri a, ka mmiri ya laghachite rikpuo ndị Ijipt, ụgbọ ịnyịnya agha ha na ndị agha ịnyịnya ha.” Ka ndị agha ahụ na-achọ ịgbanahụ mmiri ahụ na-asọghachi, “Jehova tụbara ndị Ijipt n’etiti oké osimiri ahụ.” O nweghị otú ha ga-esi gbapụ. “Ọbụna otu n’ime ha afọdụghị.” (Ọpụ. 14:26-28) Jehova si otú ahụ gosi na ya ga-anapụtali ndị ya ná nsogbu ọ bụla.

HA LANAHỤRỤ MBIBI JERUSELEM

13. Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee, oleekwa ihe nwere ike ịgbagwoju ha anya?

13 Ihe atụ nke atọ anyị ga-atụle bụ ihe mere mgbe a nọchibidoro Jeruselem na narị afọ mbụ. Ọ ga-egosi na Jehova maara kpọmkwem otú ọ ga-esi mezuo nzube ya. Tupu e bibie Jeruselem n’afọ 70 O.A., Jehova si n’aka Ọkpara ya gwa Ndị Kraịst bi na Jeruselem nakwa na Judia ihe ha ga-eme iji lanahụ. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, nke Daniel onye amụma kwuru banyere ya, ka o guzo n’ebe nsọ, . . . mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.” (Mat. 24:15, 16) Ma, olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi mata mgbe amụma ahụ na-emezu?

14. Olee otú ihe ndị malitere ime na narị afọ mbụ si mee ka a ghọta ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee?

14 Ka ihe ndị ahụ malitere ime, ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtakwuru ihe ahụ o kwuru. N’afọ 66 O.A., Cestius Gallus du ndị agha Rom bịa Jeruselem iji mee ka ndị Juu kwụsị inupụrụ ọchịchị Rom isi. Mgbe ndị Juu ahụ na-enupụ isi gara zoo n’ụlọ nsọ, ndị agha Rom malitere ịkwatu mgbidi ụlọ nsọ ahụ. Ndị Kraịst mụ anya ghọtara nke ọma ihe nke ahụ pụtara. Ha ghọtara na ndị agha bú ọkọlọtọ ha ji ekpere arụsị (nke bụ́ “ihe arụ”) eruola ná mgbidi ụlọ nsọ Jeruselem (nke bụ́ ‘ebe nsọ’). Oge eruola ka ndị na-eso ụzọ Jizọs “malite ịgbaga n’ugwu.” Ma, olee otú ha ga-esi agbapụ n’obodo ndị agha nọchibidoro? Ihe a na-atụghị anya ya na-aga ime.

15, 16. (a) Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa ka ha rube isi? (b) Gịnị ga-eme ka a napụta anyị?

15 Cestius Gallus na ndị agha ya hapụrụ Jeruselem lawa, n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya. Ndị nnupụisi ahụ chụwara ha. Ebe ọ bụ na òtù abụọ ahụ na-alụ ọgụ apụọla n’obodo ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ohere ahụ gbapụ. Jizọs gwara ha hoo haa ka ha hapụ ngwongwo ha gbapụ n’egbughị oge. (Gụọ Matiu 24:17, 18.) Hà kwesịrị ịgbapụ ozugbo? Azịza ya doro anya n’oge na-adịghị anya. N’ime ụbọchị ole na ole, ndị nnupụisi ahụ lọghachiri ma malite ịmanye ndị bi na Jeruselem nakwa na Judia isoro ha ná nnupụisi ha. N’oge na-adịghị anya, ihe siri ezigbo ike n’obodo ahụ n’ihi na òtù dị iche iche nọ na-azọ onye ga-achị. Isi n’obodo ahụ gbapụ siziri ike. Mgbe ndị Rom lọghachiri n’afọ 70 O.A., o nwekwaghị otú mmadụ ga-esi gbapụ n’obodo ahụ. (Luk 19:43) Onye ọ bụla na-agbapụbeghị atọla! Ma, a zọpụtara Ndị Kraịst mere ihe Jizọs kwuru, ya bụ, ndị gbagara n’ugwu. Ha ji anya ha hụ otú Jehova si anapụta ndị ya. Olee ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a?

16 Ka ihe dị iche iche na-eme n’oké mkpagbu ahụ, ọ ga-adị mkpa ka Ndị Kraịst rubere Okwu Chineke na nzukọ ya isi. Dị ka ihe atụ, iwu ahụ Jizọs nyere ka ndị na-eso ụzọ ya “malite ịgbaga n’ugwu” gbasakwara anyị. Anyị amatabeghị otú anyị ga-esi gbapụ.b Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eme ka ihe ahụ Jizọs kwuru doo anyị anya mgbe oge ruru ka anyị mee ya. Ebe ọ bụ naanị irube isi ga-eme ka a napụta anyị, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka m na-eme ugbu a ma Jehova gwa ndị ya ihe ha ga-eme? Àna m erube isi ozugbo, ka m̀ na-egbu oge?’—Jems 3:17.

E MEELA KA OBI SIE ANYỊ IKE MAKA IHE GA-EME N’ỌDỊNIHU

17. Gịnị ka amụma Habakọk na-egosi banyere agha Gọg ga-ebuso ndị Chineke?

17 Ka anyị lebaghachi anya n’agha ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ Gọg ga-ebuso ndị Chineke, bụ́ nke anyị kwutụrụ banyere ya ná mmalite. Habakọk buru amụma yiri nke ahụ dị n’Ezikiel ma kwuo, sị: “M nụrụ ihe ndị a, afọ wee gbarụọ m; mgbe m nụrụ ụda ya, egbugbere ọnụ m mara jijiji; ọkpụkpụ m wee rewe ure; m mara jijiji n’ebe m nọ, m ga-anọrọ nwayọọ wee chere ụbọchị ahụhụ, chere mgbe [Chineke] ga-adakwasị ndị mmadụ [ya bụ, ndị agha ahụ na-ebuso ndị Chineke agha], ka o wee wakpo ha.” (Hab. 3:16) Naanị ịnụ akụkọ banyere agha a na-aga ibuso ndị Chineke mere ka afọ gbarụọ Habakọk, egbugbere ọnụ ya amaa jijiji, ike agwụkwa ya. Ihe ahụ mere Habakọk gosiri na anyị ga-eyi ndị na-enweghị olileanya mgbe ahụ ndị agha Gọg ga-abịa ibuso anyị agha. Ma, onye amụma ahụ nọọrọ nwayọọ chere oké ụbọchị Jehova, obi esiekwa ya ike na Jehova ga-anapụta ndị ya. Obi kwesịkwara isi anyị ike otú ahụ.—Hab. 3:18, 19.

18. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ agha Gọg ga-ebuso anyị egwu? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Ihe atụ atọ anyị tụlerela gosiri na Jehova maara otú o si anapụta ndị ya. Nzube ya enweghị ike ịkụ afọ n’ala; o nweghị ihe ga-eme ka Chineke ghara imeri. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ iso ya merie, anyị ga-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ugbu a? Ọ bụ ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Gụọ Ụlọ Nche Disemba 15, 2010, peeji nke 30-31.

b Gụọ Ụlọ Nche May 1, 1999, peeji nke 19.

[Foto dị na peeji nke 24]

È nwere ihe ndị agha Fero ga-eme ndị Izrel?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya