Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 12/1 p. 9
  • Ha Achọpụtala Ihe Bara Uru Karịa Krismas

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Achọpụtala Ihe Bara Uru Karịa Krismas
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-atụ Anya Ya n’Oge Krismas
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Gịnị Ka Krismas Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 12/1 p. 9

Ha Achọpụtala Ihe Bara Uru Karịa Krismas

ỌTỤTỤ nde Ndị Kraịst taa anaghị agba Krismas. Olee otú obi na-adị ha? Hà na-eche na o nwere ihe na-akwa ha? Ụmụ ha hà na-eche na e nwere ezigbo ihe na-akwa ha maka na ha anaghị agba Krismas? Legodị ihe Ndịàmà Jehova si n’ebe dị iche iche n’ụwa kwuru banyere nke a.

● Icheta Jizọs Kraịst: “Tupu mụ aghọọ Onyeàmà Jehova, ọ na-esiri m ike ịga chọọchị. M gaakwanụ agaa, mara na ọ bụ n’ụbọchị Krismas ma ọ bụ n’Ista. M gachagodị lọta, anaghị m eche echiche banyere Jizọs Kraịst. Akwụsịla m ịgba Krismas. Ma m na-aga ọmụmụ ihe ugboro abụọ n’izu, m na-agadị akụziri ndị ọzọ ihe Baịbụl kwuru banyere Jizọs Kraịst!”—EVE, ỌSTRELIA.

● Obi ụtọ a na-enweta ma e nye ndị ọzọ onyinye: “Obi na-atọ m ezigbo ụtọ ma ndị mmadụ nye m onyinye mgbe m na-atụghị anya ya. Ụdị onyinye a na-adị m mma. Ọ na-amasịkwa m imere ndị mmadụ kaadị na isere ha ihe n’ihi na nke a na-eme ka ha nwekwuo obi ụtọ, ọ na-emekwa ka m nwee obi ụtọ.”—REUBEN, NỌTAN AYALAND.

● Inyere ndị nọ ná mkpa aka: “Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị siere ndị ọrịa ihe oriri. Mgbe ụfọdụ, anyị na-enye ha okooko osisi, keeki, ma ọ bụ obere onyinye ọzọ nke ga-eme ka obi tọọ ha ụtọ. Obi na-atọ anyị ụtọ ime ihe ndị a n’ihi na anyị nwere ike ime ha n’oge ọ bụla n’afọ.”—EMILY, ỌSTRELIA.

● Oge ezinụlọ ji anọrị: “Mgbe ọ bụla ndị ezinụlọ anyị nọ n’ebe dị iche iche bịakọtara otu ebe, ụmụntakịrị anyị na-amata nne na nna ha ochie na ụmụnne nna ha na ụmụnne nne ha, ụmụ ụmụnne nna ha na ụmụ ụmụnne nne ha. Ahụ́ na-erukwa ha ala n’oge ahụ. Ebe ọ bụ na ọ bụghị naanị n’oge Krismas ka anyị na-eme nke a, ndị ezinụlọ anyị amarala na ihe mere anyị ji eleta ha bụ maka na anyị hụrụ ha n’anya.”—WENDY, KEMAN AỊLANDS.

● Udo: “N’oge Krismas, mere nke a mere nke ọzọ anaghị ekwe ọtụtụ ndị chee echiche banyere udo. Ahụ́ eruola m ala ugbu a m matara nkwa Chineke kwere ụmụ mmadụ na Baịbụl. O doola m anya ugbu a na ụmụ m ga-ekpori ndụ n’ọdịnihu.”—SANDRA, SPEN.

[Foto dị na peeji nke 9]

EVE

[Foto dị na peeji nke 9]

REUBEN

[Foto dị na peeji nke 9]

EMILY

[Foto dị na peeji nke 9]

WENDY

[Foto dị na peeji nke 9]

SANDRA

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya