Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 1/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe I Kwesịrị Ime ma E Megbuo Gị Ma Ọ Bụ Ndị Ọzọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ị Pụrụ Idi Ikpe Na-ezighị Ezi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Chineke Ọ̀ Na-ekpe Ikpe Na-ezighị Ezi?”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Otú Anyị Ga-esi Edi Mmegbu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 1/1 p. 16
Nwaanyị bụ́ ogbenye ọnụ ntụ na nwa ya

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee ụdị onye Chineke bụ?

Chineke bụ mmụọ. Mmadụ enweghị ike ịhụ ya anya. Ọ bụ ya kere eluigwe, ụwa, na ihe niile dị ndụ. Ma, o nweghị onye kere Chineke n’ihi na o nweghị mmalite. (Abụ Ọma 90:2) Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ gbalịa ka ha na ya dịrị ná mma nakwa ka ha mata nke bụ́ eziokwu gbasara ya.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:24-27.

Anyị nwere ike ịmata aha Chineke. Anyị nwekwara ike ịmata àgwà ya ụfọdụ ma ọ bụrụ na anyị echebara ihe ndị o kere eke echiche. (Ndị Rom 1:20) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata Chineke nke ọma, ihe anyị kwesịrị ime bụ ịmụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Baịbụl ga-eme ka anyị mata àgwà ọma ndị Chineke nwere.—Gụọ Abụ Ọma 103:7-10.

Mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha ọ̀ na-ewute Chineke?

Mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha na-ewute Onye kere anyị, bụ́ Jehova. O kere ụmụ mmadụ n’onyinyo ya. (Diuterọnọmi 25:16) Ọ bụ ya mere mmegbu anaghị adị ọtụtụ ndị mma. Ọ bụghị Chineke kpatara mmegbu ma ọ bụ ihe ọjọọ anyị na-ahụ ebe niile. Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị họọrọ ime ihe ọjọọ ma na-emegbu ndị ọzọ. Ihe ọjọọ ndị ha na-eme ‘na-ewute Jehova n’obi.’—Gụọ Jenesis 6:5, 6; Diuterọnọmi 32:4, 5.

Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya. Ọ gaghị ekwe ka mmegbu dịgide. (Abụ Ọma 37:28, 29) Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-eme ka mmegbu niile ndị mmadụ na-emegbu ibe ha kwụsị n’oge na-adịghị anya.—Gụọ 2 Pita 3:7-9, 13.

Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-eme ka mmegbu niile ndị mmadụ na-emegbu ibe ha kwụsị n’oge na-adịghị anya

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 1 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya