Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 2/1 p. 8-9
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ịtachi Obi Dị Ka Onye Agha nke Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 2/1 p. 8-9
Ivars Vigulis na nwunye ya na-akụziri nwa ha nwaanyị banyere paradaịs

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Nkwa Chineke Kwere na Ọ Ga-eme Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs Mere Ka Ndụ M Gbanwee

Akụkọ Ivars Vigulis kọrọ

  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1974

  • ABỤ M ONYE: LATVIA

  • NDỤ M BIRI: ANA M AGBABU ỌGBA TUM TUM ỌNWỤ ỌNWỤ

Oge Ivars Vigulis ka na-agba nnukwu ọgba tum tum

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’obodo Riga, nke bụ́ isi obodo Latvia. Ọ bụ mama m zụrụ mụ na nwanne m nwaanyị. Mama m bụ onye Katọlik. Ma, naanị mgbe anyị na-aga chọọchị bụ ma e mewe ememme n’ụlọ ụka. Kemgbe ụwa m, ama m na e nwere onye ka mmadụ niile ike. Ma, mgbe m na-eto okorobịa, e nwere ihe ndị ọzọ ka m mkpa.

Mgbe m ka bụ nwata, mama m chọpụtara na enwere m anya nkà. Ọ na-abụ m hụ ihe dị ka redio, mụ atụsasịa ya. E mechaa, mụ edoziekwa ya. Obi anaghị ekwe mama m ịhapụ naanị m n’ụlọ n’ihi na ọ ma na e nwere ọtụtụ ihe m nwere ike ịtụsasị. Ihe o meziri bụ ịzụtara m ihe e ji akụziri ụmụaka ihe nke e ji ígwè rụọ. Ọ na-atọ m ụtọ iji ya rụọ ihe a chọrọ ka e jiri ya rụọ, e mechaakwa, mụ atụsasịa ya. Ihe ọzọ masịkwara m n’oge ahụ bụ ịgba ọgba tum tum. Mama m denyere aha m n’ebe a na-amụ otú e si agba ọgba tum tum. M malitere iji obere ọgba tum tum asọ mpi. Emechakwara m gbawa nnukwu ọgba tum tum.

Ebe ọ bụ na m na-amụtakarị ihe ngwa ngwa, amụtara m ịgba ọgba tum tum ahụ nke ọma n’agbanyeghị na ụdị egwuregwu a nwere ike igbu mmadụ ma ọ bụ merụọ ya ahụ́. N’asọ­mpi ndị ọgba tum tum nwere na Latvia, m meriri ugboro atọ. M merikwara ugboro abụọ n’oge ndị ọgba tum tum si mba Lituenia, Estonia, na Latvia sọrọ mpi.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

N’oge ahụ m na-agba ọgba tum tum, enyi m nwaanyị m mechara lụọ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Aha enyi m nwaanyị ahụ bụ Evija. Otú ya na Ndịàmà Jehova si malite ịmụ Baịbụl bụ na ọ gụrụ akwụkwọ ha ma zigara ha ozi ka ha bịa mụwara ya Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, Ndịàmà Jehova abụọ bịara, ha na ya ebido ịmụ Baịbụl. Enweghị m nsogbu na ọ na-amụ Baịbụl. Ma n’oge ahụ, enwechaghị m mmasị n’ihe gbasara okpukpe.

Ndịàmà Jehova ahụ mechara gwa m ka m bịa soro ha mgbe ha na Evija na-amụ Baịbụl. Ekwetara m, ihe ha kwuru tọkwara m ụtọ. Ihe kacha metụ m n’obi bụ nkwa Chineke kwere na Baịbụl na ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Dị ka ihe atụ, ha gosiri m ihe e dere n’Abụ Ọma 37:​10, 11. Ebe ahụ kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Nkwa ahụ metụrụ m n’obi.

M mụkwuru gbasara Chineke, mụ achọpụta na ọtụtụ ihe ndị chọọchị na-akụzi abụghị eziokwu. Ihe ndị m na-amụta na Baịbụl mere m obi ụtọ n’ihi na ihe Baịbụl na-ekwu doro m anya, bụrụkwa eziokwu.

Baịbụl ahụ m na-amụ mere ka m ghọta na Jehova ejighị ndụ egwu egwu. (Abụ Ọma 36:⁠9) Ihe a m mụtara mere ka m chebara ọgba tum tum m ­na-agba echiche. Achọghịzi m iji ndụ m egwuri egwu. ­Achọrọ m iji ya na-enye Jehova otuto. Aha m a na-anụ ebe niile na otú ndị mmadụ si eto m na obi ụtọ m na-enweta ma m gbawa ọgba tum tum abụghịzi mkpa m.

Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka m ghọta na ọ bụ Jehova nyere m ndụ nakwa na m kwesịrị iji ndụ m mee ihe dị ya mm

N’afọ 1996, agara m mgbakọ Ndịàmà Jehova e mere n’obodo Talin, nke dị n’Estonia. Ndị si mba dị iche iche bịara ya. Ebe anyị nọ mee mgbakọ ahụ dị nso n’ámá egwuregwu m nọrọla ọtụtụ ugboro gbaa ọgba tum tum. Ná mgbakọ ahụ, ahụrụ m ka ndị si mba dị iche iche nọkọrọ ọnụ n’enweghị onye ya na ibe ya nwere nsogbu. Dị ka ihe atụ, mgbe akpa otu Onyeàmà Jehova funahụrụ ya, ekwuru m n’obi m na o nweghị ihe ga-eme ka ọ hụ ya ọzọ. Ma n’oge na-adịghị anya, Onyeàmà Jehova ọzọ hụrụ akpa ahụ ma wetara ya onye nwe ya, o nweghịkwa ihe furu n’ime ya. Ihe ahụ juru m nnọọ anya. Ma, o mere ka m ghọta na Ndịàmà Jehova na-eme ihe ha na-amụta na Baịbụl. Mụ na Evija mụsiwere Baịbụl ike, anyị ghọkwara Ndịàmà Jehova n’oge e mere anyị baptizim n’afọ 1997.

Ivars Vigulis na-aga arụzi ụgbọala n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova

URU NDỊ M RITERELA:

Ụfọdụ ndị enyi m mụ na ha na-agbabu ọgba tum tum anwụọla n’ihi otú ha si agba ya ọnwụ ọnwụ. Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka m ghọta na ọ bụ Jehova nyere m ndụ nakwa na m kwesịrị iji ndụ m mee ihe dị ya mma. O nwere ike ịbụ ihe a m mụtara mere m ji ka dịrị ndụ.

Mụ na nwunye m rụrụ ọrụ afọ anọ n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Riga. Ma ugbu a, anyị amụọla nwa nwaanyị. Aha ya bụ Alise. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na-enyere ya aka ka ọ hụ Jehova n’anya. Otu ugboro n’izu, ana m aga arụ ọrụ n’ebe Ndịàmà Jehova na-asụgharị akwụkwọ ha e ji amụ Baịbụl. M na-aga arụziri ha ụgbọala na ihe ndị ọzọ n’ebe ahụ. Obi dị m ụtọ na m ka ji ihe m mụtara n’oge m bụ nwata na-eme ihe bara uru. N’eziokwu, m ka na-atụsasị ihe dị iche iche ma na-edozi ha.

Obi dị m ụtọ na m mụtara ihe Baịbụl na-akụzi. O meela ka mụ na nwunye m na nwa m na-akụziri ndị mmadụ banyere ezi Chineke. N’eziokwu, nkwa Chineke kwere na ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs mere ka ndụ m gbanwee.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya