Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 7/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 7/1 p. 16
Ebe agadi nwoke na-ekpe ekpere

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị mere anyị ga-eji na-ekpe ekpere?

Jehova Chineke chọrọ ka anyị na-akọrọ ya ihe ndị na-enye anyị nsogbu. Ọ chọrọ ka anyị na-eme otú ahụ mgbe niile. (Luk 18:1-7) Chineke na-ege anyị ntị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-ekpegara Nna anyị nke bi n’eluigwe ekpere ebe ọ bụ na ọ gwara anyị ka anyị na-eme otú ahụ?—Gụọ Ndị Filipaị 4:6.

Ihe mere anyị ji ekpe ekpere abụghị naanị ka anyị rịọ Chineke ka o nyere anyị aka. Kama, ekpere na-enyere anyị aka ka anyị bịaruo Chineke nso. (Abụ Ọma 8:3, 4) Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere mgbe niile, na-akọrọ Chineke otú obi dị anyị, anyị na ya ga-adịkwu ná mma.—Gụọ Jems 4:8.

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?

Mgbe anyị na-ekpe ekpere, Chineke achọghị ka anyị na-agwa ya okwu otú ga-eme ka a sị na anyị ma ekpere ekpe. Ọ chọghịkwa ka ihe anyị na-agwa ya bụrụ ihe anyị bu n’isi. Jehova agwaghị anyị na e nwere otú pụrụ iche anyị ga na-anọ ekpegara ya ekpere tupu ya anụ ya. Ma, ọ chọrọ ka ihe niile anyị na-agwa ya si anyị n’obi. (Matiu 6:7) Dị ka ihe atụ, n’Izrel oge ochie, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Hana. O kpere ekpere kọọrọ Chineke nsogbu o nwere n’ezinụlọ ha. Chineke mechara meere Hana ihe ọ rịọrọ ya. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya ejiri obi ya niile kpee ekpere kelee Chineke.—Gụọ 1 Samuel 1:10, 12, 13, 26, 27; 2:1.

Ihe ọma a Chineke meere anyị, nke bụ́ ịgwa anyị ka anyị na-ekpegara ya ekpere, enweghị atụ. Ihe ọ pụtara bụ na anyị nwere ike ịkọrọ ya ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’obi. Anyị nwekwara ike ito ya na ikele ya maka ihe ndị ọ na-emere anyị. N’eziokwu, anyị ekwesịghị iji ihe ọma a Chineke meere anyị egwu egwu.—Gụọ Abụ Ọma 145:14-16.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 17 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya