Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 10/1 p. 4
  • È Nwere Onye Na-ege Ntị n’Ekpere Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • È Nwere Onye Na-ege Ntị n’Ekpere Anyị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Chineke Ọ̀ Na-anụ Ekpere Anyị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 10/1 p. 4
Ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs hulatara isi ha, Jizọs elewe anya n’eluigwe wee malite ikpe ekpere

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ọ̀ BADỊRỊ URU IKPE EKPERE?

È Nwere Onye Na-ege Ntị n’Ekpere Anyị?

Ụfọdụ ndị chere na mmadụ ikpe ekpere bụ igbu oge, na e nweghị onye na-ege ntị n’ekpere anyị. E nweela ndị gbalịrịnụ kpee ekpere, ma ya adị ha ka a zaghị ekpere ha. Otu onye na-ekweghị na Chineke dị nọkatara sị ka ya gwagodị onye o chere ndị mmadụ na-asị na ọ bụ Chineke okwu. O kpeziri ekpere sị ka Chineke takwunyere ya obere ihe ka ọ nụ, ma, Chineke ekwughị ihe ọ bụla.

Ma, Baịbụl gwara anyị na Chineke dị nakwa na ọ na-anụ ekpere. Ọtụtụ afọ gara aga, Baịbụl kwuru, sị: ‘Chineke aghaghị imere gị amara mgbe ọ nụrụ mkpu ákwá gị; ọ ga-aza gị ozugbo ọ nụrụ ya.’ (Aịzaya 30:19) Ebe ọzọ na Baịbụl kwuru na “ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ ya ụtọ.”—Ilu 15:8.

Jizọs kpegaara Nna ya ekpere, “a nụkwara olu ya.”​—Ndị Hibru 5:7

Baịbụl kwukwara gbasara ụfọdụ ndị a zara ekpere ha. Otu amaokwu Baịbụl kwuru na Jizọs kpesiri ekpere ike ma “rịọ Onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ, a nụkwara olu ya.” (Ndị Hibru 5:7) Na Daniel 9:21 na 2 Ihe E Mere 7:1, e dekwara ekpere ndị ọzọ Chineke zara.

Oleezi ihe mere o ji adị ụfọdụ ka a naghị aza ekpere ha? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a za ekpere anyị, anyị kwesịrị ikpegara naanị Chineke, onye aha ya bụ Jehova,a ekpere, ọ bụghị chi ọ bụla ọzọ ma ọ bụ ndị nna ochie. Chineke chọrọ ka anyị na-arịọ ya ihe “dị ka uche ya si dị.” Ọ bụrụ na ihe anyị na-arịọ bụ dị ka uche Chineke si dị, Chineke kwuru na ya ‘ga-anụ olu anyị.’ (1 Jọn 5:14) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a za ekpere anyị, anyị kwesịrị ịmata onye Chineke ahụ e kwuru okwu ya na Baịbụl bụ, matakwa ihe bụ́ uche ya.

Ọtụtụ ndị kweere na ekpere abụghị naanị ihe e ji ama ndị na-aga chọọchị. Kama, na Chineke na-anụ ekpere ma na-azakwa ya. Otu nwoke onye Kenya aha ya bụ Isaac, kwuru, sị: “M kpere ekpere ka Chineke nyere m aka ịghọta Baịbụl. Obere oge m kpechara ekpere ahụ, otu onye abịakwute m bido kụziwere m Baịbụl.” Otu nwaanyị Filipinz aha ya bụ Hilda chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga. Mgbe ọ gbalịchara ike ya ka ọ kwụsị ịṅụ sịga, ma o nweghị isi, di ya gwara ya, sị: “Rịọnụ Chineke ka o nyere gị aka.” O mere ihe a di ya gwara ya. O mechara kwuo, sị: “Otú Chineke si nyere m aka tụrụ m n’anya. O mere ka ịṅụ sịga kwụsị ịna-agụ m agụụ. M mechara kwụsị ịṅụ sịga.”

Chineke ọ̀ ga-emere gị ihe ị chọrọ ka o meere gị, nke dị ka uche ya si dị?

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya