Gosi na I Ji Akwụkwọ Anyị Kpọrọ Ihe n’Ezie
1 Ọla diamọnd na nkume ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa bụ ihe ndị a na-achọsi ike n’ihi ịma mma ha na n’ihi oké ihe ọ na-efu iji chọta ma gwupụta ha. (Ilu 2:4) Ihe ọmụma banyere Jehova na Jizọs Kraịst bara uru ọbụna karị, ọ bụkwa akwụkwọ anyị bụ nanị akwụkwọ dị n’ụwa ndị na-akọwa akụ̀ ime mmụọ ndị a n’ụzọ sara mbara site n’amamihe nke Chineke. (Rom 11:33; Fil. 3:8) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị ji akwụkwọ anyị kpọrọ ihe n’ezie?
2 Ọtụtụ ndị na ezinụlọ dị iche iche na-ewepụtachi anya onyinye ndị a ga-eji gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma tinye ha n’otu n’ime igbe ndị e dere “Contributions for the Society’s Worldwide Work—Matthew 24:14.” Ndị mmadụ n’otu n’otu na-enyekwu onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ mgbe ha weere akwụkwọ ma ọ bụ magazin nakwa mgbe ha na-etinye onyinye ndị ha natara n’ozi ubi.
3 Ụzọ ọzọ nke isi gosipụta ekele bụ site n’ịdị na-eme nhọrọ n’inye ndị anyị na-ezute n’ozi ubi akwụkwọ. Anyị agaghị eche echiche inye nwa a mụrụ ọhụrụ, bụ́ onye na-agaghị ama uru ọ bara, diamọnd dara oké ọnụ. Anyị adịghịkwa enye ndị na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe akwụkwọ dị oké ọnụ ahịa. (Tụlee Ndị Hibru 12:16.) Anyị inye onwe anyị na akwụkwọ anyị n’afọ ofufo kwesịrị ịbụ nke ezi uche na-eduzi. Onye nwe ụlọ ọ̀ dị njikere inwe mkparịta ụka? Ọ̀ na-ege ntị mgbe anyị na-ekwu okwu, na-aza ajụjụ ndị anyị na-ajụ, ma na-esonye ka anyị na-agụpụta Bible? Ọ bụrụ na e gosịrị ụdị mmasị ahụ, anyị ga-enwe obi ụtọ ịhapụrụ ya akwụkwọ kwesịrị ekwesị. Mgbe anyị ji akwụkwọ anyị na-eduzi ọmụmụ ihe, a na-enyere ndị mmadụ aka ịmata ihe Bible na-akụzi, a na-emeghekwara ha ụzọ nke iso Jehova nwee mmekọrịta dị mma. Ihe ga-ekpebi uru a ga-erite n’ezie site n’akwụkwọ anyị bụ otú e si jiri ya mee ihe.
4 Anyị pụkwara igosi ekele site n’inyefe akwụkwọ anyị mgbe ọ bụla ohere dapụtara n’ozi ụlọ n’ụlọ, tinyekwara ná nletaghachi na n’ọmụmụ Bible. Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị itinye mgbalị ịmata ihe dị n’akwụkwọ ma ọ bụ broshuọ ọ bụla a na-enyefe n’ọnwa ahụ. Inwe oge mmụgharị ihe ndị dị mkpirikpi iji nwalee ụzọ iche ihe n’ihu nke anyị na-eme atụmatụ iji mee ihe pụrụ inyere anyị aka inwekwu ịnụ ọkụ n’obi n’iche ozi anyị n’ihu mmadụ. Chebara akwụkwọ nke ị chọpụtara na ọ kasị arụpụta ihe n’ókèala gị echiche nke ọma. Akwụkwọ ndị dị ka Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ anọgidewo na-arụ ọrụ magburu onwe ya n’ebe ndị nwe ụlọ nọ. Traktị dị iche iche na-enyekwa aka nke ukwuu.
5 Na-echesi echiche ike mgbe nile banyere akwụkwọ ole ga-adị gị mkpa n’ezie maka ikesa. Iji ezi uche eme ihe dị mkpa. Ọ bụ ezie na inwe ókè ga-ezunụ dị mkpa, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-asụ ụzọ, ọ dịghị mkpa ịnọ na-ebukọju akwụkwọ, ebe ị pụrụ inwetakwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze tupu a malite nakwa mgbe e mechisịrị nzukọ. Nweta ọnụ ọgụgụ akwụkwọ ga-ezunụ iji malite n’ọnwa ma na-enwetakwu ka ndị nke i nwere na-agwụsị.
6 Akwụkwọ anyị na-aba uru karịsịa mgbe anyị nyere ya ndị ji eziokwu nke Okwu Chineke kpọrọ ihe. Ka anyị nile jiri amamihe na ezi uche na-eme ihe n’otú anyị si eji ihe ndị a e wepụtara eme ihe, si otú ahụ na-egosipụta otú anyị jiruru akwụkwọ anyị kpọrọ ihe nke ukwuu.