Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/96 p. 1
  • Na-efe Ofufe Dị Nsọ Ehihie na Abalị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-efe Ofufe Dị Nsọ Ehihie na Abalị
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • April—Oge Iji ‘Dọgbuo Onwe Anyị n’Ọrụ Ma Gbasie Mgba Ike’
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Iduzi Nzukọ Ozi Ubi Otú Ga-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 4/96 p. 1

Na-efe Ofufe Dị Nsọ Ehihie na Abalị

1 E nyewo anyị ihe ùgwù pụrụ iche. Ọ bụ nke ịbụ ndịàmà nke Jehova. Anyị bụ akụkụ nke nzukọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-ezisa ozi ọma Jehova ji arụzu ọrụ mkpọsa Alaeze nke kasị ukwuu a rụtụworo! (Mak 13:10) N’ihi ịdị ngwa nke oge anyị, ànyị na-ekere òkè n’ọrụ a ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasịnụ kwere omume?

2 Anyị amaghị ọnụ ọgụgụ ga-emesịa nakwere nkwusa anyị. Jehova na-emesi anyị obi ike na ọ ga-abụ “oké ìgwè mmadụ,” ndị e ji ‘ife ofufe dị nsọ ehihie na abalị’ mara ha nile. (Mkpu. 7:9, 15) Ihe karịrị nde Ndịàmà ise jirịị ọrụ n’aka n’ofufe Chineke abụghị nanị ndị nwere mmasị na-ege ntị, ha abụghịkwa nanị ndị na-aga nzukọ. Ha bụ ndị ọrụ na-akpọsa ozi ọma ahụ gburugburu ụwa!

3 Kwa ụbọchị, e nwere ohere ito Jehova, ma ọ̀ bụ n’ozi ubi ma ọ bụ n’ọnọdụ mberede. Chee echiche banyere oké àmà a pụrụ ịgba ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị ebute ụzọ n’isoro nanị otu onye kerịta eziokwu ahụ kwa ụbọchị. Obi ekele anyị maka Jehova kwesịrị ịkpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu banyere ya.—Abụ Ọma 92:1, 2.

4 Nyere Ndị Ọzọ Aka Ife Ofufe: Jehova nọgidere jiri mmụba na-agọzi anyị. (Hag. 2:7) N’ime afọ ije ozi gara aga na Nigeria, e duziri nkezi nke 272,954 ọmụmụ Bible ebe obibi kwa ọnwa. Ihe mgbaru ọsọ anyị n’ịmụrụ ndị a ihe bụ inyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs. (Mat. 28:19, 20) Ọtụtụ n’ime ha enweworị ọganihu dị mma site n’ịdị na-abịachi nzukọ anya. Ha amalitewo ịgwa ndị ha maara okwu “banyere oké ọrụ nile nke Chineke” ha mụtaworo. (Ọrụ 2:11) À pụrụ ịkpọ ha òkù ugbu a ikere òkè n’ozi ihu ọha?

5 N’April anyị kwesịrị itinye mgbalị pụrụ iche ịkpọ ndị ọhụrụ ruru eru òkù isonyere anyị n’ozi ubi. Onye ị na-amụrụ ihe ò gosiwo mmasị ime nke a? Ọ bụrụ otú ahụ, ò nwere iru eru ndị ahụ nke Akwụkwọ Nsọ? (Lee akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 97-99.) Mgbe onye ahụ ị na-amụrụ ihe nwere ọchịchọ ikere òkè n’ije ozi ubi, soro onye isi oche ndị nlekọta kparịta ọchịchọ ya, bụ́ onye ga-edokwa ka ndị okenye abụọ nyochaa okwu ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ a na-amụrụ ihe ruru eru ịnakwere dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism, kpọọ ya ka o sonyere gị n’ubi. Ndị nlekọta ije ozi na ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị iburu n’uche karịsịa inyere ndị pụrụ iru eru aka ịmalite ime nkwusa n’April.

6 Ndị nne na nna pụrụ ịtụle ma ụmụ ha hà ruru eru ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. (Abụ Ọma 148:12, 13) Ọ bụrụ na nwa gị nwere ọchịchọ ikwupụta obi ya n’ozi Alaeze, o nweekwa àgwà ọma, ị pụrụ ịgakwu otu n’ime ndị okenye so n’òtù ije ozi iji tụlee ọnọdụ ahụ. Mgbe gị na ha na nwa gị zukọsịrị, ndị okenye abụọ ga-ekpebi ma ò ruru eru ka a gụọ ya dị ka onye nkwusa. E nwere ihe pụrụ iche na-enye ọṅụ mgbe ụmụaka sonyeere anyị n’ito Chineke!

7 Nanị Jehova ruru eru ịnara ofufe anyị dị nsọ. (Luk 4:8) Ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri ihe ùgwù anyị dị ebube nke ito ya “nke ukwuu” mee ihe.—Abụ Ọma 109:30; 113:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya