Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/96 p. 1
  • Imezu Nkwa Anyị Kwa Ụbọchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Imezu Nkwa Anyị Kwa Ụbọchị
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Ihe I Kwere ná Nkwa, Mezuo Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ibi Ndụ n’Ụzọ Kwekọrọ ná Nkwa Alụmdi na Nwunye Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ndị Na-erubere Jehova Isi Na-emezu Nkwa Ha Kwere Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 7/96 p. 1

Imezu Nkwa Anyị Kwa Ụbọchị

1 A kpaliri onye ọbụ abụ bụ́ Devid ikwupụta gwa Jehova, sị: “M ga-abụku aha Gị abụ ọma ruo mgbe ebighị ebi, ka m wee kwụghachi nkwa m nile kwa ụbọchị.” (Abụ Ọma 61:8) Devid maara na ikwe nkwa bụ kpam kpam ihe afọ ofufo. Otú ọ dị, ọ ghọtakwara na ọ bụrụ na ya ekwee nkwa, na iwu ji ya imezu ya. Ka o sina dị, o toro Jehova maka ohere nke imezu nkwa ya kwa ụbọchị.

2 Mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova, anyị ji obi anyị nile kwee nkwa ime uche ya. Anyị jụrụ onwe anyị ma mee ijere Jehova ozi nchụso anyị bụ isi ná ndụ. (Luk 9:23) Ya mere, anyị onwe anyị aghaghịkwa ịkwụghachi nkwa anyị kwa ụbọchị. (Ekli. 5:4-6) Nkwupụta ihu ọha anyị mere n’oge baptism ime mmiri aghaghị ịpụta ìhè n’ụzọ ịdị ndụ anyị dum, ebe anyị maara na “a na-eji ọnụ kwupụta ruo nzọpụta.” (Rom 10:10) Nke a na-agụnye ikwusa ozi ọma ahụ. (Hib. 13:15) Ọnọdụ onwe onye dịgasị nnọọ iche iche, ma kwa ụbọchị, anyị nile pụrụ ịtụkwasị uche n’ịdị mkpa nke isoro ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma ahụ.

3 Wepụta Ohere Iji Mee Nkwusa Kwa Ụbọchị: Isoro onye ọzọ kerịta ozi ọma ahụ bụ ahụmahụ na-enye ọṅụ. Iji mee nke a kwa ụbọchị, anyị aghaghị iwepụta ohere iji mee nkwusa mgbe ọ bụla ọnọdụ anyị nyere ohere ya. Ndị buteworo ụzọ n’ịgbara ndị mmadụ àmà mberede n’ebe ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ na nye ndị agbata obi ma ọ bụ ndị ọzọ ha na-ezute kwa ụbọchị enwetawo ọtụtụ ahụmahụ obi ụtọ. Ọbụna ide akwụkwọ ozi ma ọ bụ iji telifon eme ihe pụrụ ịbụ ụzọ isi gbaa àmà nye ndị ọzọ. Iji ụzọ ndị a nile eme ihe tinyekwara iwepụta oge mgbe nile maka ịgba àmà site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ na ime nletaghachi pụrụ iduga n’ọṅụ pụrụ iche nke na-abịa site n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. Ee, kwa ụbọchị anyị pụrụ iwepụta ohere iji mee nkwusa.

4 Otu nwanna nwanyị malitere ịgụ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị n’oge nkwụsịtụ nwa oge n’ọrụ ya. Ọ kpọrọ otu onye ọrụ ibe ya òkù isoro ya na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, n’oge na-adịghị anya nke ahụ dugakwara n’isoro nwanyị ahụ na-enwe ọmụmụ Bible. Ha jiri nkera nke otu hour mụọ ihe kwa ụbọchị, ụbọchị ise n’otu izu. Onye ọrụ ibe ha ọzọ chọpụtara ọmụmụ ihe ha na-enwe kwa ụbọchị. O mesịrị kọwaa onwe ya dị ka nwanna nwoke na-adịghị ejekwa ozi. N’ịbụ onye ịnụ ọkụ n’obi nwanna nwanyị ahụ kpaliri, ọ kpọtụụrụ onye okenye iji bụrụ onye a tụteghachiri. Nwanna nwanyị a metụtara ndụ abụọ ọzọ n’ụzọ dị mma n’ihi ịnọgide na-emezu nkwa ya kwa ụbọchị.

5 Mgbe obi nke jupụtara n’ekele maka ihe ọma nile Jehova mewooro anyị kpaliri anyị, imezu nkwa nraranye anyị ruo n’ókè kasị mma anyị pụrụ ime kwa ụbọchị ga-ewetara anyị ọṅụ na afọ ojuju. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ, anyị pụrụ ikwupụta, sị: “M ga-eji obi m nile kelee Gị, Onyenwe anyị, Chineke; m ga-asọpụrụkwa aha Gị ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 86:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya