“Ịgha Mkpụrụ nke Alaeze” n’Ụzọ Magazin
1 Isiokwu abụ nke 133 n’akwụkwọ abụ Sing Praises to Jehovah bụ “Ịgha Mkpụrụ nke Alaeze.” Ọ dabeere n’ilu Jisọs nke jiri ịgha mkpụrụ tụnyere ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 13:4-8, 19-23) Okwu dị n’abụ ahụ na-agụ, sị: “Mkpụrụ unu ole ga-ada n’ala dị mma/Pụrụ ịdabere nke ukwuu n’aka unu.” Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ozi anyị dịkwuo irè? Otu ụzọ bụ site n’iguzobe na ịnọgide na-enwe ụzọ magazin.
2 A pụrụ imezu ọtụtụ nzube site n’ụzọ magazin. (1) Ime nleta chiri anya n’izu abụọ ọ bụla na-eme ka i nwee ike iwulite mmekọrịta enyi n’ebe onye ahụ nwere mmasị nọ. (2) Ị na-anọgide na-enye onye ahụ ihe ọmụma na-azọpụta ndụ nke dị n’Ụlọ Nche na Teta! (3) Site ná nkwurịta okwu unu ị pụrụ inyere onye ahụ aka inwe agụụ maka eziokwu Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke nwere ike iduje n’ọmụmụ Bible.—1 Pita 2:2.
3 Otú E Si Amalite Ụzọ Magazin: Mgbe ọ bụla mmadụ gosiri mmasị na magazin, kọwaa na isiokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ na-apụta na mbipụta ọ bụla nakwa na ọ ga-amasị gị iweta ha izu abụọ ọ bụla. Mgbe ị lawara, detuo aha na adres onye ahụ, ụbọchị i mere nleta ahụ, mbipụta ndị i nyefere, isiokwu ndị i chere ya n’ihu, na isiokwu ndị dọọrọ mmasị onye ahụ karịsịa.
4 Ị pụrụ ịmalite ụzọ nke nwere nanị mmadụ ole na ole na ya. Mgbe ahụ rụọ ọrụ iji mụbaa ya site n’ịgbakwụnye ndị ọzọ i nyefere magazin. Ka ụzọ gị na-agbasawanye, ị pụrụ ịhazi ya dabere n’ókèala ka o wee dị mfe ịgazu. Jiri nlezianya dekọọ mbipụta e nyefere ná nleta nke ọ bụla na mgbe e mere nleta ahụ. Detukwuo ihe ndị unu kwurịtara na otú ị pụrụ isi gaa n’ihu n’iwulite mmasị onye ahụ n’eziokwu ahụ ná nleta ọzọ.
5 Gụnye Ndị Ọchụ Nta Ego na Ndị Ọrụ: Ahụmahụ egosiwo na ndị nwere ụlọ ahịa na ndị ọrụ ndị ọzọ yikarịrị ka ha ga-anara magazin anyị mgbe nile. Ọbụna otu onye okenye nwere onyeisi obodo ya n’ụzọ magazin ya. Otu onye nkwusa maliteere otu onye gbara afọ 80 nke na-ere ngwá ọrụ ihe owuwu ọmụmụ ihe mgbe o wegasịịrị ya magazin ruo afọ iri n’akwụsịghị akwụsị!
6 Otu nwanna nwanyị bụ́ ọsụ ụzọ banyere n’otu ụlọ ahịa wee zute otu di na nwunye na-anabatachaghị ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Otú ọ dị, ebe ha naara magazin, o kpebiri itinye di na nwunye ahụ n’ụzọ magazin ya. Ka oge na-aga, nwanna nwanyị ahụ chọrọ ịhapụ ịdị na-akpọtụrụ ha n’ihi na ha enweghị nnọọ omume enyi, ha ekwukebeghịkwa okwu, ọbụna mgbe ọ jụrụ ajụjụ njụta echiche. Ma nwanna nwanyị ahụ kpere ekpere banyere ihe ahụ, n’ikpeazụkwa o nyefere di na nwunye ahụ akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi. Mgbe ọ gụsịrị ya, nwanyị ahụ tiri mkpu, sị: “N’ikpeazụ, achọtawo m eziokwu ahụ!” A malitere ọmụmụ Bible, mgbe e mesịkwara e mere di na nwunye ahụ baptism. Nnọgidesi ike nke ọsụ ụzọ ahụ mịrị ezi mkpụrụ n’ezie.
7 Ime Nletaghachi Ya: Mgbe ị natara magazin ọhụrụ, gụọ isiokwu nile. Chọọ isi ihe ndị ga-amasị onye nke ọ bụla nọ n’ụzọ gị. E mesịa mgbe ị gaghachiri, ị pụrụ ịsị: “Ka m na-agụ isiokwu a, echere m banyere gị na otú ọ pụrụ isi amasị gị.” Inwe ụzọ magazin pụrụ ịtọ ndị nkwusa nọ n’afọ ndụ nile ụtọ. Ọbụna nwatakịrị pụrụ ịsị: “Obi dị m ụtọ ịhụ gị ọzọ. Mbipụta ọhụrụ gị nke Ụlọ Nche na Teta! abịawo. Echere m na ị ga-enwe mmasị n’isiokwu a a kpọrọ . . . ”
8 Kpalie atụmanya maka isiokwu ndị na-abịanụ site n’ịdọrọ uche gaa n’igbe isiokwu ya bụ “N’Ime Mbipụta Anyị Ọzọ.” Mgbe isiokwu pụtara dị ka nke nwere ọtụtụ akụkụ, kọwapụta nke a ma gbaa onye ahụ na-agụ ya ume ịghara ikwe ka akụkụ nke ọ bụla n’ime ya kwaa ya. Echezọla na oge ọ bụla i nyere onye nọ n’ụzọ magazin gị magazin, a pụrụ ịgụ ya dị ka nletaghachi. Nke ka nke, cheta na ihe mgbaru ọsọ anyị bụ iwulite nleta ndị a ka ha ghọọ ọmụmụ Bible ebe obibi.
9 Leta Ndị Nọ n’Ụzọ Gị n’Ụzọ Chiri Anya: Ị pụrụ ijezu ụzọ magazin gị n’oge ọ bụla kwere omume—n’ụtụtụ nke ụbọchị izu, n’ehihie, ná mgbede, ma ọ bụ ná ngwụsị izu mgbe i tinyesịrị oge n’ọrụ ụlọ n’ụlọ. Ọ bụrụ na i nweghị ike ijezu ụzọ gị n’ihi ọrịa ma ọ bụ ịga njem ezumike, gwa onye nkwusa ọzọ nọ n’ezinụlọ ma ọ bụ n’ọgbakọ gị ka ọ gaa nyere gị magazin ndị ahụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ dịghị mgbe ndị nọ n’ụzọ gị ga-ahapụ inweta magazin ha n’oge.
10 Otu ụzọ isi ghaa mkpụrụ nke Alaeze bụ iwegara ndị nile nọ n’ụzọ magazin gị Ụlọ Nche na Teta! n’ụzọ chiri anya. Ka ị na-akụziri ha eziokwu Akwụkwọ Nsọ, ha pụrụ ịghọta okwu Alaeze ahụ ma mesịa soro gị mịa mkpụrụ nke Alaeze ahụ.—Mat. 13:8, 23.