Jehova Na-ezi Anyị Ihe
1 Ọrụ izi ihe nke zuru ụwa ọnụ na-aga n’ihu ugbu a n’ala 233 site ná nduzi Chineke. Ọ dịghị ihe ụwa pụrụ inye nke a pụrụ iji tụnyere ya. Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova, na-ezi anyị ụzọ isi baara onwe anyị uru ugbu a ka ọ na-ezikwa anyị ihe maka ndụ ebighị ebi.—Aịsa. 30:20; 48:17.
2 Ụlọ Akwụkwọ Izi Ihe Chineke: Cheedị echiche banyere ụlọ akwụkwọ ndị na-aga n’ihu ugbu a maka abamuru nke ndị Jehova. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nke a na-eduzi kwa izu n’ihe dị ka ọgbakọ 87,000, na-azụ ọtụtụ nde ndị nkwusa Alaeze ịbụ ndị ozi dị irè nke ozi ọma ahụ. Ì debawo aha gị na ya? Ì so n’ọtụtụ puku mmadụ jeworo Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ ahụ na-ewe izu abụọ? Ikekwe awa a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile nke e gbubilataworo ga-eme ka ọtụtụ ndị karị nwee ike ịsụ ụzọ ma ruo eru ije ụlọ akwụkwọ a. Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na-ewe ọnwa abụọ, nke a na-eduzi ugbu a n’ụwa nile n’asụsụ ndị bụ́ isi, na-akwadebe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwanyị iburukwu ibu ọrụ ọchịchị Chineke. Site n’oge ruo n’oge, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nile na-anata ọzụzụ pụrụ iche n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze.
3 A na-anọ n’ihe owuwu ndị dị n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, enwe ụlọ akwụkwọ ndị pụrụ iche, bụ́ ndị na-enye ọzụzụ ọchịchị Chineke sara mbara karị. Ọzụzụ ahụ na-ewe ọnwa ise, nke Watchtower Bible School of Gilead na-enye, na-akwadebe ndị ozi maka ije ozi n’ala ọzọ. Ndị so na Kọmitii Alaka dị iche iche si gburugburu ụwa na-aga ọzụzụ na-ewe ọnwa abụọ banyere nhazi alaka. N’ikpeazụ, ndị ohu Jehova nile na-erite uru ndị dị mma n’ọzụzụ Jehova na-enye site n’ụlọ akwụkwọ ndị a dị iche iche.
4 Ndị E Ziri Ihe Ime Gịnị? Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru, sị: “Usoro agụmakwụkwọ anyị nwere ugbu a bụ nke a haziri iji mee ka ndị Jehova n’ebe nile nọrọ n’ọnọdụ dị mma nke ntozu okè a kọwara n’Ilu 1:1-4.” Ka Jehova nọgide na-enye onye ọ bụla n’ime anyị “ire nke ndị mmụta.”—Aịsa. 50:4.