Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
Usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche bụ́ nke ga-amalite na March 2000 nwere isiokwu bụ́: “Inyoba Anya n’Ihe Omimi nke Chineke.” (1 Kọr. 2:10) Olee ihe ndị bara uru anyị ga-amụta?
N’ọchịchọ ha na-achọ ihe ọmụma, ọtụtụ ndị adịghị enweta ume ọhụrụ n’ihe ndị ha na-achọpụta. Bible na-enye anyị ume, dị ka onye nlekọta sekit ga-egosi n’ihe omume ọ ga-eme bụ́ nke isiokwu ya bụ́ “Inyocha Okwu Chineke Na-eweta Ume Ọhụrụ.” Ọkà okwu si esi bịa ga-akọwapụta njikọ dị n’etiti inyocha ihe dị omimi nke Chineke na ikwusa ozi ọma ahụ ka ọ na-ekwu okwu n’ajụjụ bụ́ “Olee Otú I Si Ele Nkwusa Alaeze Anya?”
Olee otú ndị mụrụ ụmụ ga-esi nyere ụmụ ha aka igwuba n’Okwu Chineke n’ụzọ miri emi? A ga-atụ aro ndị dị irè n’isiokwu bụ́ “Kụnyenụ Okwu Chineke n’Ime Ụmụ Unu.” Isoro ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ n’ọgbakọ na-akpakọrịta na-enwe mmetụta dị mma n’ahụ ndị na-eto eto bụ́ ndị Kraịst. A ga-eme ka ihe atụ nke ụzọ dị mma o si emetụta ha pụta ihè n’akụkụ bụ́ “Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-amụta Ihe Site n’Aka Ndị Mere Okenye Karị.”
N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji ịdị uchu na-achọ akụ̀ ime mmụọ zoro ezo n’oge a? Jehova bụ Onye na-ekpughe ihe nzuzo. Ọkà okwu si esi bịa ga-akọwa ihe ndị Jehova kpughere n’oge ochie na n’oge a n’okwu bụ́ “Jehova Na-ekpughe Ihe Ndị Dị Omimi n’Ụzọ Na-aga n’Ihu n’Ihu.” Nke a ga-eme ka mkpebi anyị mere ịnọgide ‘na-enyocha ihe nile dị omimi nke Chineke’ siwanye ike.
Mee atụmatụ ugbu a ịga. Ndị chọrọ igosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova site na baptism kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta ngwa ngwa o kwere mee. Ihe anyị ga-anụ ga-eme ka anyị nwekwuo ọchịchọ siri ike ịmụ Okwu Chineke nke ọma. Ya mere ekwela ka ụbọchị a pụrụ iche a ga-enye ntụziaka ime mmụọ kwaa gị!