Iji Internet Na-eme Ihe—Nọrọ na Nche Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya!
1 Ndị Jehova na-eso ibe ha enwe mkpakọrịta na-ewuli elu. Ọ na-atọ ha ụtọ ịkọ ahụmahụ ndị sitere n’ozi ubi ma na-enwe mmasị ịnụ ihe ndị na-emenụ n’ihe banyere Ndịàmà Jehova na ọrụ Alaeze ahụ n’ụwa nile. Ha na-enwe mmasị ịnụ ihe ọ bụla pụrụ iche ndị pụrụ ime ụmụnna anyị, dị ka nsogbu ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha, ha na-achọkwa ịma ma ọ̀ dị ihe ọ bụla ha pụrụ ime iji nye aka. Ụdị mmasị ahụ na-egosi ịdị n’otu nke òtù ụmụnna ahụ, na-egosi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya n’ezie.—Jọn 13:34, 35.
2 Taa, anyị na-anụ ihe ndị na-eme n’ụwa ngwa ngwa. Ụlọ ọrụ redio na telivishọn na-akọrọ ndị nọ n’ụwa nile na-ege ntị ihe ndị na-emenụ n’ozuzu ha mgbe ahụ ha na-eme. Telifon na-emekwa ka o kwe omume iso ndị mmadụ nọ n’akụkụ nile nke ụwa kwurịta okwu ozugbo. Otu ihe omume na-ewu ewu karị n’ụwa nile n’ihe banyere nzirịta ozi bụ Internet.—Lee Teta! (Bekee), July 22, 1997.
3 Mmepụta nke telifon mere ka o kwe omume mmadụ na mmadụ inwe nkwurịta okwu ngwa ngwa n’ụwa nile. Ọ bụ ezie na telifon bara nnọọ uru, ọ dị mkpa ịkpachara anya n’ụzọ e si eji ya eme ihe, ebe a pụrụ iji ya nwee mkpakọrịta ma ọ bụ mee ihe omume ndị na-ekwesịghị ekwesị, iji telifon emebiga ihe ókè pụkwara ifu oké ego. Telivishọn na redio pụrụ ịba uru n’inye mmụta. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ihe dị ukwuu n’ihe omume ha rụrụ arụ, itinye uche na ha bụkwa igbu oge. Amamihe ga-eme ka anyị na-eme nnọọ nhọrọ n’ikiri telivishọn na ige ntị na redio.
4 Internet na-eme ka mmadụ nwee ike iso ọtụtụ nde ndị ọzọ nọ n’akụkụ nile nke ụwa nwee nkwurịta okwu n’emefughị oké ego, ọ na-emekwa ka e nwee ike inweta ihe ọmụma buru ibu. (Teta! (Bekee), January 8, 1998) Otú ọ dị, iji Internet eme ihe n’ajụghị ase pụrụ ime ka mmadụ daba n’oké ihe ize ndụ ime mmụọ na nke omume. N’ụzọ dị aṅaa?
5 Ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu banyere ihe ọmụma ndị a pụrụ inweta ngwa ngwa bụ́ ndị na-egosi ụzọ isi rụpụta ngwá agha, tinyere bọmbụ. Ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-eme mkpesa banyere oge ndị ọrụ ha na-atụfu n’iji Internet eme ihe. E kwuwo ọtụtụ ihe n’akwụkwọ anyị dị iche iche banyere ihe ize ndụ ime mmụọ ndị o doro anya na a na-enweta n’Internet. Ọtụtụ ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet na-egosi ime ihe ike na ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ ndị na-ekwesịghị ekwesị ma ọlị maka ndị Kraịst. (Abụ Ọma 119:37) Tụkwasị n’ihe ize ndụ ndị a, e nwere ihe ize ndụ zoro ezo karị nke ọ dị mkpa ka Ndịàmà Jehova karịsịa nọrọ na nche maka ya. Gịnị bụ ihe ize ndụ a?
6 Ị̀ ga-akpọbata onye ị na-amabughị n’ụlọ gị n’ebughị ụzọ chọpụta onye ọ bụ? Gịnị ma ọ bụrụ na ọ dịghị ụzọ ị ga-esi chọpụta? Ị̀ ga-ekwe ka onye ahụ ị na-amabughị na ụmụ gị nọrọ nanị ha? Nke a bụ ihe na-enweghị mgbagha nke pụrụ ime n’Internet.
7 A pụrụ ịnata ma zipụrụ ndị ị na-amaghị ozi site n’ígwè nzipụ ozi. Nke ahụ pụkwara ime mgbe unu na-akparịta ụka n’ígwè nzipụ ozi ma ọ bụ n’ebe a na-enwe mkparịta ụka na kọmputa. Mgbe ụfọdụ ndị so na-enwe mkparịta ụka pụrụ ikwu na ha bụ Ndịàmà Jehova, ma ọtụtụ mgbe ha anaghị abụ. Mmadụ pụrụ ikwu na ya bụ onye ntorobịa mgbe ọ na-abụghị. Ma ọ bụ mmadụ pụrụ ọbụna ịgha ụgha na ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.
8 Ihe ọmụma e ziteere gị pụrụ ịbịa n’ụdị ahụmahụ ma ọ bụ okwu banyere nkwenkwe anyị. A na-ezigara ndị ọzọ ihe ọmụma a, bụ́ ndị na-ezigakwara ya ndị ọzọ. A dịghị enwekarị ike ịnwapụta ma ihe ọmụma ahụ ọ̀ bụ eziokwu, ọ pụkwara ịbụ ụgha. Okwu ndị ahụ pụrụ ịbụ ụzọ zoro ezo nke isi na-agbasa echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ.—2 Tesa. 2:1-3.
9 N’iburu ihe ize ndụ a n’uche, ọ bụrụ na ị na-eji Internet eme ihe, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m na-eji ya eme? Ọ̀ pụrụ ikwe mee na a ga-emerụ m ahụ n’ụzọ ime mmụọ site n’otú m si eji ya eme ihe? M̀ pụrụ ịdị na-ekere òkè n’imerụ ndị ọzọ ahụ n’ụzọ ime mmụọ?’
10 Ebe “Ndịàmà Jehova” Na-edebe Ihe Ọmụma n’Internet: Dị ka ihe atụ, cheedị banyere ebe ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndịàmà Jehova nwetara n’Internet. Ha na-akpọ gị òkù ịga n’ebe ndị ahụ ha nwetara iji gụọ ahụmahụ dị iche iche ndị ọzọ sị na ha bụ Ndịàmà tinyere na ha. A na-agba gị ume ikwu ihe bụ echiche gị banyere akwụkwọ Society. Ụfọdụ na-atụ aro ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị a pụrụ iji mee ihe n’ozi ubi. Ebe ndị a a na-edebe ihe ọmụma na-enwe ebe mkparịta ụka bụ́ ebe ndị mmadụ ga-esonye na ha, na-eme ka o kwe omume iso ndị ọzọ zirịta ozi ozugbo ahụ, n’ụzọ yiri iji telifon na-ekwurịta okwu. Ha na-ezokarịrị gị aka n’ebe ndị ọzọ a na-edebe ihe ọmụma bụ́ ebe ndị ị pụrụ isoro Ndịàmà Jehova nọ gburugburu ụwa na-enwe mkpakọrịta site na kọmputa. Ma ì ji n’aka na ebe ndị a abụghị ndị si n’ezi ofufe dapụ nwe ha?
11 Ịdị na-enwe mkpakọrịta site n’Internet apụghị ikwekọ n’aro ahụ dị ná Ndị Efesọs 5:15-17. Pọl onyeozi dere, sị: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ. N’ihi nke a unu aghọla ndị na-enweghị uche, kama ghọtanụ ihe bụ ihe Onyenwe anyị na-achọ.”
12 Ọgbakọ ndị Kraịst bụ ụzọ ọchịchị Chineke nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” si enye anyị nri ime mmụọ. (Mat. 24:45-47) N’ime nzukọ Chineke, anyị na-enweta nduzi na nchebe iji mee ka anyị dị iche n’ụwa nakwa ihe mkpali iji na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. (1 Kọr. 15:58) Ọbụ abụ ahụ gosiri na ya nwere ọṅụ na mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’etiti ndị Chineke zukọtaranụ. (Abụ Ọma 27:4, 5; 55:14; 122:1) Ọgbakọ na-enyekwa ndị nọ n’ime ya nkwado na enyemaka ime mmụọ. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ìgwè ndị enyi na-ahụ n’anya, ndị na-eche banyere gị, ma na-elekọta gị—ndị ị maara n’onwe gị bụ́ ndị dị njikere inyere ndị ọzọ aka na ịkasi ha obi n’oge nsogbu. (2 Kọr. 7:5-7) A na-echebe ndị nọ n’ọgbakọ site ná ndokwa ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị ma ọ bụ ndị na-akwalite echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. (1 Kọr. 5:9-13; Taị. 3:10, 11) Ànyị pụrụ ịtụ anya ịhụ otu ndokwa ịhụnanya ndị a mgbe anyị na ndị ọzọ na-akpakọrịta site n’Internet?
13 Ọ pụtawo ìhè na ọ bụ ihe dị iche na nke ahụ na-eme. Ebe ụfọdụ a na-edebe ihe ọmụma n’Internet bụ n’ụzọ doro anya ebe ndị a na-akwalite echiche ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ebe ndị dị otú ahụ a na-edebe ihe ọmụma n’Internet pụrụ ikwu na ha abụghị, ndị na-akwadokwa otu ebe a na-edebe ihe ọmụma pụrụ inye nkọwa sara mbara iji gosipụta na ha bụ Ndịàmà Jehova n’eziokwu. Ha pụrụ ọbụna ikwu ka i nye ha ihe ọmụma iji nwapụta na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
14 Jehova chọrọ ka i jiri nghọta mee ihe. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ maara na ọ ga-echebe gị pụọ n’ihe ize ndụ dị iche iche. Ilu 2:10-19 malitere site n’ikwu, sị: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.” Chebe gị pụọ na gịnị? N’ihe ndị dị ka “n’ụzọ onye ọjọọ,” ndị na-ahapụ ụzọ nke izi ezi, na ndị rụrụ arụ n’omume ha ma na-akpa àgwà ọjọọ n’ụzọ ha si ebi ndụ.
15 Mgbe anyị gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, obi abụọ adịghị ya na ọ bụ anyị na ụmụnna anyị nọ. Anyị maara ha. Ọ dịghị onye na-achọ ihe nnwapụta maka nke a n’ihi na ịhụnanya ụmụnna a na-egosipụta na-eme ka o doo anya. A dịghị achọ n’aka anyị n’otu n’otu inye ihe nnwapụta iji gosi na anyị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’eziokwu. Ọ bụ n’ebe a ka anyị na-enweta ezi mgbarịta ume ahụ Pọl kwuru maka ya ná Ndị Hibru 10:24, 25. A pụghị ịdabere n’ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma n’Internet iji nweta nke a bụ́ ndị na-agba ume isite na kọmputa na-enwe mkpakọrịta. Iburu ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma 26:4, 5 n’uche pụrụ ime ka anyị mara ihe ize ndụ ndị a pụrụ izute n’ụzọ dị mfe mgbe e ji ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma n’Internet na-eme ihe.
16 E nweghị ịkpa ókè ma ọ bụ ihe mgbochi n’ụdị ihe ọmụma ndị na-eji Internet eme ihe na-edebe na ndị ha pụru inweta. Ọtụtụ mgbe, ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma na-abụ ndị dị mfe imeso mpụ ma rigbuo n’ebe a. Ụmụaka na-atụkwasị mmadụ obi, na-achọ ịmata ihe, ma na-enwe oké agụụ inyocha usoro njikọ dị mgbagwoju anya nke kọmputa bụ́ nke dịtụ ọhụrụ. Ya mere ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa ilekọta ụmụ ha na inye ha nduzi dị mma sitere n’Akwụkwọ Nsọ banyere iji Internet na-eme ihe, dị nnọọ ka ha ga-esi nye ha nduzi n’ịhọrọ egwú ma ọ bụ ihe nkiri.—1 Kọr. 15:33.
17 N’ụzọ dị mwute, a chụpụwo ndị ụfọdụ bụbu ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị n’ihi mkpakọrịta ndị malitere site n’izute ndị ụwa n’ebe mkparịta ụka n’Internet ma mesịa duga ha n’omume rụrụ arụ. N’ụzọ siri nnọọ ike ikweta, ndị okenye edewo na ụfọdụ ahapụwo di ha ma ọ bụ nwunye ha n’ezie iji gaa n’ihu ná mmekọrịta ndị malitere n’Internet. (2 Tim. 3:6) Ndị ọzọ agbahapụwo eziokwu ahụ n’ihi ikweta ihe ọmụma nke ndị si n’ezi ofufe dapụ nyere. (1 Tim. 4:1, 2) N’iburu oké ihe ize ndụ ndị a n’uche, ọ̀ bụ na o yighị ihe ezi uche dị na ya ịkpachara anya banyere isonye ná nnọkọ mkparịta ụka n’Internet? N’ezie, iji amamihe, ihe ọmụma, izuzu, na nghọta, bụ́ ndị e kwuru banyere ha n’Ilu 2:10-19, eme ihe kwesịrị ichebe anyị na nke a.
18 N’ụzọ dị ịrịba ama, e nwewo ọtụtụ ndị nwetaworo ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma n’Internet dị ka o yiri iji kwusaa ozi ọma ahụ. Ọ bụ ụmụnna ndị na-enweghị uche na-akwado ọtụtụ n’ime ebe ndị a a na-edebe ihe ọmụma. Ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị chọrọ ịrata ndị na-amụghị anya pụrụ ịkwado ebe ndị ọzọ a na-edebe ihe ọmụma. (2 Jọn 9-11) N’ikwu okwu ma ọ̀ dị mkpa ka ụmụnna anyị nweta ebe ndị dị otú ahụ a na-edebe ihe ọmụma n’Internet, Ozi Alaeze Anyị nke November 1997, peji nke 3, kwuru, sị: “Ọ dịghị mkpa ka onye ọ bụla kwadebe ihe ọmụma maka Internet banyere Ndịàmà Jehova, ọrụ anyị, ma ọ bụ nkwenkwe anyị. Ógbè anyị kwadoro [www.watchtower.org] na-enye ihe ọmụma ziri ezi maka onye ọ bụla chọrọ ya.”
19 È Kwesịrị Izipụ Ihe Ndị E Ji Amụ Ihe Site n’Internet? Ụfọdụ echewo na ha na-enyere ụmụnna aka site n’itinye ihe ọmụma e nwetara site n’ime nnyocha banyere akụkụ dị iche iche nke ọrụ ọchịchị Chineke. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ ime nnyocha n’otu ndepụta okwu ihu ọha ma tinye nke a, na-eche na ihe ọmụma dị otú ahụ ga-abara ndị ọ ga-adị mkpa ịkwadebe otu ndepụta ahụ uru. Ndị ọzọ ga-etinye akụkụ akwụkwọ nsọ nile maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-abịanụ ma ọ bụ nye ebe e si nweta ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụ Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ụfọdụ pụrụ ịtụ aro banyere ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ n’ozi ubi. Ihe ndị dị otú ahụ hà na-enye aka n’ezie?
20 Akwụkwọ ndị nzukọ Jehova wepụtara na-eji echiche ndị na-ewuli elu akpali uche anyị ma na-azụ anyị “ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Hib. 5:14) Ànyị pụrụ ịsị na a na-emezu nke a ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-emere anyị nnyocha anyị?
21 E kwuru na ndị Kraịst nọ na Beria “ka ndị bi na Tesalọnaịka mma n’obi.” N’ihi gịnị? N’ihi na ha “weere obi dị ọkụ nile nara okwu ahụ nke ọma, na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a dị otú a.” (Ọrụ 17:11) Ọ bụ ezie na ọ bụ Pọl na Saịlas kwusaara ha ozi ọma, ha apụghị ime eziokwu ahụ nke ha n’etinyeghị mgbalị n’onwe ha.
22 Iji nnyocha onye ọzọ mere kwadebe okwu ma ọ bụ nzukọ ọzọ na-emebi n’ezie nzube nke ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ̀ bụ na ọ bụghị ọchịchọ gị iwulite okwukwe i nwere n’Okwu Chineke? Dabere n’ihe i kwenyere n’onwe gị, ị pụziri ime nkwupụta nke okwukwe gị n’ihu ọha—n’okwu gị, n’azịza gị ná nzukọ, na n’ozi ubi. (Rom 10:10) Iji nnyocha onye ọzọ mere eme ihe ekwekọghị ná nkọwa ahụ e nyere n’Ilu 2:4, 5 nke bụ ka ị ‘nọgide na-achọ ihe ọmụma Chineke dị ka akụ̀ zoro ezo’ n’onwe gị.
23 Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-asapeta akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche na Bible nke gị, ị pụrụ ịtụleghachi ná mkpirikpi ihe ndị gbara akụkụ akwụkwọ nsọ nke ọ bụla gburugburu. Ị pụrụ ‘isoro ihe nile nke ọma,’ dị ka Luk mere mgbe o dere Oziọma ya. (Luk 1:3) Mgbalị ahụ ị ga-etinyekwu ga-enyekwara gị aka ịdị nkà n’ịchọta akụkụ akwụkwọ nsọ n’ozi ubi na mgbe ị na-ekwu okwu. Ọtụtụ ndị ekwuwo na ha nwere mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ n’ihi na ha maara otú e si eji Bible eme ihe. Nanị ụzọ nke a pụrụ isi bụrụ eziokwu n’ebe anyị nọ bụ ma ọ bụrụ na anyị emee ka ọ bụrụ omume anyị ịdị na-asapeta akụkụ akwụkwọ nsọ n’onwe anyị n’ime Bible nke anyị.
24 Iji Oge Anyị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe: Ihe ọzọ a ga-echebara echiche n’akụkụ a bụ oge a na-eji ede, na-agụ, ma na-azaghachi n’ihe ọmụma ndị e tinyere n’Internet. Abụ Ọma 90:12 na-agba anyị ume ikpe ekpere, sị: “Mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.” Pọl kwuru, sị: “E mewo ka oge a dị mkpụmkpụ.” (1 Kọr. 7:29) Ọzọkwa: “Ya mere otú a, otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.”—Gal. 6:10.
25 Ndụmọdụ dị otú ahụ na-emesi ike mkpa ọ dị anyị iji oge anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe. Lee ka o si baa uru karị iwepụta oge iji gụọ Okwu Chineke! (Abụ Ọma 1:1, 2) Nke ahụ bụ mkpakọrịta kasị mma anyị pụrụ inwe. (2 Tim. 3:16, 17) Ndị mụrụ ụmụ, ùnu na-akụziri ụmụ unu abamuru dị n’iji oge ha eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya n’ịchụso ọdịmma Alaeze? (Ekli. 12:1) Oge e ji nwee ọmụmụ Bible onwe onye na nke ezinụlọ, gaa nzukọ, na ozi ubi bara nnọọ uru karịa oge e ji legharịa anya n’Internet.
26 N’akụkụ a, ọ bụ ihe amamihe anyị itinye uche anyị n’ihe ime mmụọ na n’ihe ndị bara uru ma dị mkpa ná ndụ anyị dị ka ndị Kraịst. Nke a na-achọ ime nhọrọ ndị e chebaara echiche nke ọma banyere ihe ọmụma ndị anyị kwesịrị itinyere oge na echiche anyị. Dị ka ndị Kraịst, Kraịst chịkọtara ihe dị mkpa ná ndụ anyị, ọ sịrị: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Mat. 6:33) Ọ̀ bụ na ị dịghị enwekarịsị obi ụtọ mgbe ndụ gị jupụtara ná nchụso Alaeze kama ịbụ n’ihe omume ọ bụla ọzọ?
27 Ozi E-Mail n’Internet: Ọ bụ ezie na ndị òtù ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi na-ebidebeghị ibe ha ịkọrịta ahụmahụ na echiche ha kwesịrị ekwesị, ọ̀ bụ ịhụnanya n’ezie ịkọrọ ndị ọzọ bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha amaghị ndị òtù ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị ihe ndị a? Ka è kwesịrị itinye ihe ndị a n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet ka onye ọ bụla gụwa? À ga-edepụtaghachi ozi onwe onye ndị a ma zipụ ha aghara aghara nye ndị ị maara na ndị ọ pụrụ ịbụ na ị maghị? N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na i nweta site n’aka ndị ọzọ ozi ndị o doro anya na ọ bụghị gị ka e zubere izitere ha, ọ̀ bụ ịhụnanya izigara ya ndị ọzọ?
28 Gịnị ma ọ bụrụ na ahụmahụ ị na-akọsa ezighị ezi? Nke a ọ́ gaghị abụ ikere òkè n’ime ka ihe na-abụghị eziokwu nọgide na-aga n’ihu? (Ilu 12:19; 21:28; 30:8; Kọl. 3:9) N’ezie, ‘ilezi anya nke ọma otú anyị na-ejegharị n’adịghị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe’ ga-eme ka anyị tụgharịa uche na nke a. (Efe. 5:15) Lee ka obi si dị anyị ụtọ na Yearbook, Ụlọ Nche, na Teta! jupụtara n’ahụmahụ ndị a pụrụ ịnwapụta ma hà bụ eziokwu bụ́ ndị na-agba anyị ume ma na-akpali anyị ịnọgide na-eje ije ‘n’ụzọ ahụ’!—Aịsa. 30:20, 21.
29 E nwekwara ihe ize ndụ ọzọ. Pọl onyeozi kwuru banyere ụfọdụ ndị, sị: “Ha na-amụtakwa ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, na-eje n’ụlọ dị iche iche; ma ọ bụghị nanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha bụkwa ndị na-ekwu okwu nzuzu, bụrụkwa ndị na-etinye aka n’ọrụ na-abụghị nke aka ha, na-ekwu okwu na-ekwesịghị ka ha kwuo.” (1 Tim. 5:13) Nke a na-emegide itinye oge na mgbalị n’ịgbasara ụmụnna anyị ihe ọmụma na-enweghị isi.
30 Cheekwa echiche banyere oge ọ na-ewe iji na-aza ozi E-mail buru ibu. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, akwụkwọ bụ́ Data Smog kwuru, sị: “Ka mmadụ na-etinyekwu oge ya ná nkwurịta okwu site na kọmputa, ozi e-mail na-agbanwe n’egbughị oge site n’ịbụ ihe ọhụrụ na-akpali akpali gaa n’ịbụ ibu arọ na-eri oge, na-enwe ọtụtụ ozi a ga-agụ ma zaa kwa ụbọchị site n’aka ndị ha na mmadụ na-arụkọ ọrụ, ndị enyi, ezinụlọ, . . . na mkpọsa ngwá ahịa a na-ekwughị ka e zite.” Ọzọkwa, ọ na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-anabata ụdị ihe ọmụma ọ bụla amụtawo àgwà ọjọọ nke izigara onye ọ bụla ha nwere adres o ji enweta e-mail ihe ọmụma ọ bụla na-akpali akpali ha nwetara—okwu egwuregwu, echiche ụgha nke oge a, akwụkwọ ozi ndị a na-ekwu ka e zipụrụ ọtụtụ ndị site na e-mail, na ihe ndị ọzọ.”
31 Nke a apụtawo ìhè n’ozi E-mail ọtụtụ ụmụnna na-ezigarịtara onwe ha—dị ka okwu egwuregwu ma ọ bụ akụkọ ndị na-atọ ọchị banyere ozi anyị; uri ndị e chere na ha sitere na nkwenkwe anyị; ihe atụ ndị a nụrụ site n’okwu dị iche iche e kwuru ná mgbakọ dị iche iche, ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze; ahụmahụ ndị sitere n’ozi ubi; na ihe ndị ọzọ—ihe ndị yiri ka ọ dịghị oké ihe ọjọọ dị na ha. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-ezigara ndị ọzọ ozi E-mail ndị dị otú ahụ ọtụtụ mgbe n’achọpụtaghị ebe o si, na-eme ka o sie ike ịmata onye o si n’aka n’ezie, bụ́ nke kwesịrị ime ka mmadụ chee echiche ma ihe ọmụma ahụ ọ̀ bụ eziokwu n’ezie.—Ilu 22:20, 21.
32 Ozi ndị dị otú ahụ bụ́ ndị na-abụkarị ndị na-enweghị isi abụghị ụdị okwu na-enye ezi ndụ Pọl bu n’uche mgbe o deere Timoti akwụkwọ ozi, na-asị: “Jide ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ nke ị nụrụ n’ọnụ m, n’ime okwukwe na ịhụnanya nke dị n’ime Kraịst Jisọs.” (2 Tim. 1:13, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) “Egbugbere ọnụ dị ọcha” nke eziokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwere “ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ” nke dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’ozi Bible bụ́ iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta site n’Alaeze ahụ. (Zef. 3:9) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike iji oge na ume anyị nile na-akwado mwepụ a nke ọbụbụeze Jehova n’ụta.
33 Ebe anyị bamiworo n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ugbu a abụghị oge anyị ga-akwụsị ịmụ anya. Bible na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Ọ gara n’ihu kwuo, sị: “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụ iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.”—Efe. 6:11.
34 Ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, Internet pụrụ ịbụ ụzọ Setan si enweta ndị o ji ike ya rafuo. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbatụ uru, ihe ize ndụ dị na ya ma ọ bụrụ na e jighị nlezianya na-ele ya anya. Ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa karịsịa inwe nchegbu banyere otú ụmụ ha si eji Internet na-eme ihe.
35 Inwe echiche ziri ezi banyere Internet bụ ihe nchebe. Anyị ji ihe ncheta bịara n’ezi oge nke Pọl nyere kpọrọ ihe: “Ka ndị na-eji ụwa [eme] ihe wee dị ka ha ejibigaghị ya ókè: n’ihi na ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga.” (1 Kọr. 7:29-31) Iburu ihe ndị a n’uche ga-enye aka ime ka anyị na ezinụlọ anyị zere ịbụ ndị ihe nile ụwa na-enye dọpụrụ uche ha, gụnyere ihe ndị dị n’Internet.
36 Ọ dị mkpa na anyị nọdebere ụmụnna anyị nọ n’ime ọgbakọ nso ma jiri oge fọdụrụnụ na-eme ihe n’ụzọ amamihe, si otú a na-ewepụta onwe anyị maka ịmụba ọdịmma nke Alaeze. Ka usoro ihe a na-abịa ná njedebe ya, ka anyị “ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharịkwa, n’ihe efu nke uche ha,” kama ka anyị “[na-aghọta] ihe bụ ihe Onyenwe anyị na-achọ.”—Efe. 4:17; 5:17.