Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/99 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ka Anyị Na-edebe Ebe Anyị Na-anọ Efe Ofufe n’Ọnọdụ Dị Mma
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Ụlọ Nzukọ Alaeze Anyị Na-adị Mma n’Anya?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Inwe Ebe Ndị A Na-anọ Efe Jehova
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 11/99 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Ònye ka ọ bụ ọrụ ya idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha?

Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ọcha ma maa mma na-enwe mmetụta dị mma n’ozi anyị na-ekwusa. (Tụlee 1 Pita 2:12.) Idebe ụlọ nzukọ ọcha nakwa n’usoro dị oké mkpa, onye ọ bụla pụkwara ikere òkè n’ilekọta ya. Anyị ekwesịghị ịtụ anya ka nanị mmadụ ole na ole buru ibu ahụ dum. A na-ahazikarị idebe ya ọcha dị ka ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ dị iche iche si dị, onye nduzi ọmụmụ ihe ma ọ bụ onye na-enyere ya aka ana-eduzikwa ya. N’ụlọ nzukọ ebe ihe karịrị otu ọgbakọ na-ezukọ, ndị okenye ga-ahazi ka ọgbakọ nile na-ekere òkè ná nlekọta ahụ.

Olee otú anyị pụrụ isi rụọ ọrụ a n’ụzọ kasị mma? E kwesịrị idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha dị ka usoro e depụtara ịgbaso mgbe nile si dị. E kwesịrị inwe ihe ndị dị mkpa na ngwá ọrụ iji mee mkpocha. E kwesịrị ịmapanye ndepụta nke ihe ndị dị mkpa ka a rụọ n’ebe ndị ga-arụ ha pụrụ ịga nweta ntụziaka. A pụrụ inwe ihe ndepụta abụọ dịgasị iche, otu maka nhicha na nzacha nkịtị mgbe a gbasara nzukọ ọ bụla, nke ọzọ maka nhicha na nzacha zuru ezu karị kwa izu. Onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị idokwa nhicha na nzacha ahụ zuru ezu n’ụbọchị na oge ga-adịrị ndị nile e kenyere ya mma. E kwesịkwara ịdị na-elekọta ahịhịa, okooko osisi, na osisi mgbe nile. E kwesịghị imetọ ụzọ ngafe na ebe a na-adọba ụgbọala. E kwesịrị inwe nhicha na nzacha zuru ezu kwa afọ, ikekwe kpọmkwem tupu e nwee Ememe Ncheta. Nke a pụrụ ịgụnye ịsa windo, ahụ ájá, kapet, na ákwà nkwụba.

N’ezie, anyị nile pụrụ ime ka ibu ahụ ka mfe site n’atụsaghị akwụkwọ, chịngọm, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ n’ime ụlọ nzukọ ma ọ bụ n’èzí ya. Anyị pụrụ idebe ụlọ mposi ọcha mgbe ọ bụla anyị gasịrị na ya, mee ka ọ dị ọcha maka onye ọzọ ga-aga na ya. Lezie anya ka ị ghara ịkụwa ngwá ma ọ bụ imebi ngwongwo dị iche iche. Rịba ama ebe ndị ihe tụsara na kapet, oche ndị mebiri emebi, nsogbu paịpụ mmiri, bọlb ndị nwụrụ anwụ, na ihe ndị ọzọ, gwakwa nwanna na-ahụ maka ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ozugbo.

Ka anyị nile dị njikere ime òkè anyị. Nke a na-eme ka e nwee ụlọ ofufe dị mma ma na-eme ka anyị dịrị iche dị ka ndị dị ọcha na-asọpụrụ Jehova Chineke.—1 Pita 1:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya