Rịọ Maka Enyemaka
1 Okwu ahụ e dere n’ike mmụọ, nke bụ́ “[siri ike nnagide, NW]” na-akọwa oge anyị dị oké egwu nke ọma. (2 Tim. 3:1) N’ihi ya, gịnị ka ị pụrụ ime mgbe i nwere ihe ịma aka ime mmụọ siri ike bụ́ nke ị pụrụ iche na ị dịchaghị njikere ịnagide?
2 Ị̀ dị njikere ịgwa onye òtù ọgbakọ tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ? Ụfọdụ ndị pụrụ ịla azụ ime nke a n’ihi ihere, n’achọghị inye onye ọ bụla nsogbu, ma ọ bụ na-enwe obi abụọ ma ọ̀ dị onye pụrụ inyere ha aka n’ezie. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ilekọta ibu ọrụ anyị otú anyị nwere ike, ma anyị kwesịrị inwere onwe anyị ịchọ enyemaka n’ihe ndị metụtara ọdịmma ime mmụọ anyị.—Gal. 6:2, 5.
3 Ebe Ị Ga-amalite: Ị pụrụ ịgakwuru onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ nke ìgwè unu ma jụọ ya ma ị̀ pụrụ iso ya rụọ n’ubi. Nke a ga-enye gị ohere ịgwa ya banyere ọchịchọ gị ito eto n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na ọ bụ ohu na-eje ozi, mee ka ọ mara na enyemaka ime mmụọ dị gị mkpa, ọ ga-agwakwa ndị okenye ka ha nyere gị aka. Ma ọ bụ, ị pụrụ ijekwuru otu n’ime ndị okenye ma kọọrọ ya ihe ndị na-echegbu gị.
4 Enyemaka dị aṅaa dị gị mkpa? Ò nwewo ihe mere ka ịnụ ọkụ n’obi gị belata? Ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ nke na-agbalị ime ka ụmụ ya nọrọ ọgbakọ nso? Ị̀ bụ onye meworo agadi enyemaka dị mkpa? Ka è nwere nsogbu ụfọdụ na-akụda gị mmụọ? Ịnagide oge anyị dị oké egwu pụrụ isi ike—ma ọ bụghị ihe na-agaghị ekwe omume. E nwere enyemaka.
5 Otú Ndị Okenye Si Enye Aka: Ndị okenye na-eche banyere gị n’ezie. Ha ga-ege ntị ná nchegbu gị. Ọ bụrụ na ndị nkwusa ọzọ enwee ihe mgbochi ndị yiri nke ahụ, ndị okenye ga-eburu nke a n’uche ka ha na-elekọta ọgbakọ ma na-akụziri ha ihe. Dị ka “ihe atụ ìgwè atụrụ nta ahụ ga-eṅomi,” ha dị njikere mgbe nile iji ọṅụ soro gị rụkọọ ọrụ. (1 Pita 5:3) Ige ụmụnna ndị a nwere ahụmahụ ntị ka ha na-esoro ndị ọzọ atụgharị uche n’ụkpụrụ Bible pụrụ imeziwanye ozi gị ma nyere gị aka ná ndụ gị.—2 Tim. 3:16, 17.
6 Jisọs enyewo anyị ọtụtụ “onyinye [n’ụdị] mmadụ.” (Efe. 4:8, nkọwa ala peji nke NW.) Nke a pụtara na ndị okenye dị njikere inyere gị aka. Ha nọ ya inyere gị aka. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha “bụ nke [gị].” (1 Kọr. 3:21–23) Ya mere, kama ịla azụ, nwere onwe gị ikwupụta echiche gị. Rịọ maka enyemaka dị gị mkpa.