April—Oge Iji Nụọ Ọkụ n’Obi Maka Ọrụ Ọma!
1 Ka ajọ ifufe na-akpụdewe ógbè ndị mmadụ bijuru, ọ na-adịwanye mkpa ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ahụ na-abịanụ. Ka ajọ ifufe ahụ na-abịarukwu nso, otú a ka ịdọ aka ná ntị ahụ na-aghaghị isiwanye ike. N’ihi gịnị? N’ihi na ndụ nọ n’ihe ize ndụ! Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị anụghị ịdọ aka ná ntị ndị mbụ. Ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ nụrụ ya ma ha emeghị ihe ọ bụla. Otú ahụ ka ọ dịkwa banyere ịdọ aka ná ntị Chineke nke e nyeworo anyị ọrụ ịkpọsa tupu “oké ifufe” nke iwe ezi omume Chineke ebupụ akụkụ nile nke ụwa ọjọọ a. (Ilu 10:25) Ndụ ebighị ebi nke ọtụtụ ijeri mmadụ nọ n’ihe ize ndụ! A ghaghị ịkpọsa ịdọ aka ná ntị ahụ. Anyị aghaghị ịdị ‘na-anụ ọkụ n’obi maka ọrụ ọma.’—Taịtọs 2:11-14.
2 Ruo ọtụtụ iri afọ, a kpaliwo ndị Jehova ime oge Ememe Ncheta oge maka ịnụ ọkụ n’obi n’ụzọ pụrụ iche n’ozi. N’oge opupu ihe ubi nke afọ 1939, Informant, nke e nweburu tupu Ozi Alaeze Anyị, nyere agbamume a: “Ebe oge opupu ihe ubi na-aga ịmalite, ebe a na-agakwa inwe ihu igwe dị mma, anyị kwesịrị ịtụ anya na ndị nkwusa [ọgbakọ] ga-amụba awa ha na-etinye n’ubi okpukpu abụọ, oge ndị ọsụ ụzọ na-etinye amụbaakwa nke ukwuu. April bụ ọnwa nwere Sunday ise. O nwekwara Saturday ise. Mee Saturday na Sunday ọ bụla n’April . . . oge ịgba àmà n’ụzọ pụrụ iche.” Nke ahụ bụ ihe mgbaru ọsọ siri ike e setịpụụrụ ụmụnna afọ 60 gara aga! N’afọ a, dị ka ọ dị na 1939, ọnwa April nwere ngwụsị izu ise zuru ezu. Gịnị bụ atụmatụ gị n’ọnwa a? Olee ihe ndị i detuworo na kalenda gị maka April 2000? Mee atụmatụ isoro ndị Jehova ndị ọzọ kere òkè gbara ọkpụrụkpụ n’ịrụ ọrụ ọma n’ọnwa a pụrụ iche a na-arụ ọrụ ime mmụọ ka ukwuu.
3 Ihe Anyị Na-enwe Olileanya Ịrụzu: Ụbọchị kasị mkpa n’afọ 2000 dabara n’ọnwa a. Ọ bụ April 19, bụ́ ụbọchị ncheta ọnwụ Jisọs. Ka anyị tinye mgbalị pụrụ iche iji kpọọ ọtụtụ ndị ruo n’ókè o kwere mee òkù ịbịa Ememe Ncheta. Dị ka a tụrụ aro ya n’ọnwa gara aga, depụta aha ndị nile pụrụ ịbịa Ememe Ncheta ma leruo ya anya iji hụ na ọ dịghị onye a hapụrụ. Onye nkwusa ọ bụla nke na-adịghị ejekwa ozi, ndị nile a na-eduziri ọmụmụ Bible, ndị nletaghachi, ndị e duziere ọmụmụ ihe na mbụ, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị agbata obi, ndị ikwu na ndị ọzọ anyị maara kwesịrị iso ná ndị a kpọrọ òkù. Ndị chọrọ ịbịa hà nwere ụzọ ime njem ha ga-eji bịa? Ọ bụrụ na ha enweghị, ị̀ pụrụ iji ịhụnanya nye aka? N’abalị ahụ a ga-eme Ememe Ncheta, anyị nile nwere ihe ùgwù nke ime ka ahụ ruo ndị nile bịaranụ ala. Mgbe e mesịrị Ememe Ncheta, anyị pụrụ inyekwuru ndị dị otú ahụ nwere mmasị aka n’ụzọ ime mmụọ.
4 ‘Ịnụ ọkụ n’obi maka ọrụ ọma’ tupu na mgbe Ememe Ncheta ahụ gasịrị bụ ụzọ dị mma isi gosi Jehova na anyị nwere ekele n’ezie maka ihe nile o mewooro anyị. Ọ bụrụ na ị na-asụ ụzọ inyeaka, i kwesịrị ime ihe nile i nwere ike ime iji tinye awa 50 ma ọ bụ karịa n’ozi. (Mat. 5:37) Gbasosie usoro ihe omume i dokwara ná mmalite ọnwa ahụ ike. (Ekli. 3:1; 1 Kọr. 14:40) Ka anyị nile mee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọsụ ụzọ nile aka, ma site n’ịgba ha ume ma site n’iso ha na-arụ n’ozi ubi. (Tụlee 2 Ndị Eze 10:15, 16.) Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi ghaa mkpụrụ n’April, anyị pụrụ ịtụ anya inweta ọṅụ na ngọzi dị ukwuu site n’aka Jehova. (Mal. 3:10) Ikekwe nke a ga-abụ nzọụkwụ mbụ iji banye n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka n’akwụsịghị akwụsị ma ọ bụ n’ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ka nkwali anyị nwetara n’April dịgide banye n’ọnwa ndị ga-esochi ka anyị nọgidere na-abụ ndị nkwusa Alaeze na-ejechi ozi anya.
5 N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ọtụtụ puku ndị Jehova ga-amalite ọmụmụ Bible ebe obibi ndị ọzọ n’ọnwa a. Ị̀ ga-achọ ịmalite otu? Kpee ekpere kpọmkwem maka inwe onye ị na-eduziri ọmụmụ ihe, meekwa ihe kwekọrọ n’ekpere gị. Ị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-enwe mmasị n’arịrịọ i ji ịdị umeala n’obi rịọ maka enyemaka n’ịchọta ndị nwere obi eziokwu ị ga-akụziri ihe.—1 Jọn 3:22.
6 Lee ụzọ e jiworo mee ihe n’ụzọ dị irè n’iji malite mkparịta ụka. Malite site n’ịjụ, sị: “Ì chere na ihe ike nile a na-eme n’ụlọ akwụkwọ na-abụghị nke ndị mmadụ nwe n’onwe ha bụ n’ihi aka ọrụ ndị mmụọ ọjọọ ka ọ̀ bụ n’ihi ndị mụrụ ụmụ enyeghị ụmụ ha ọzụzụ?” Nye ohere maka nzaghachi. Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ọ bụ “aka ọrụ ndị mmụọ ọjọọ,” gụọ Mkpughe 12:9, 12, ma kọwapụta òkè Ekwensu na-ekere n’ịkwalite ọgba aghara n’ụwa. Mgbe ahụ sapeta ihe ọmụmụ nke 4 na broshuọ Na-achọ, ma jụọ onye ahụ ma ò chetụwo echiche ebe Ekwensu si bịa. Gaa n’ihu site n’ịgụ na ịtụle paragraf abụọ mbụ. Ọ bụrụ na onye ahụ ahọrọ “ndị mụrụ ụmụ enyeghị ụmụ ha ọzụzụ” dị ka ihe kpatara ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ, gụọ 2 Timoti 3:1-3 ma kọwapụta omume ndị o doro anya na ha so na-akpata nsogbu a. Mgbe ahụ sapeta ihe ọmụmụ nke 8 na broshuọ Na-achọ, gụọ paragraf nke 5, ma gaa n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ. Ọ bụrụ na i nwee ike iyi agba ịgaghachi, ọ pụrụ ịbụ na ị na-aga ịmalite iduziri onye ahụ ọmụmụ Bible. Mgbe ọzọ ị ga-aga, jụọ ya ma ọ̀ ma onye ọ bụla ọzọ nwere ike inwe mmasị n’ịmụta ihe ọ na-amụta.
7 Ụzọ ọzọ nke isi ‘nụọ ọkụ n’obi maka ọrụ ọma’ n’April bụ ikere òkè n’akụkụ dị iche iche nke ime nkwusa. Ị̀ nọwo na-eche echiche banyere ịgba àmà n’ogige ntụrụndụ ma ọ bụ n’ebe ndọba ụgbọala? N’ebe bọs ma ọ bụ ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị? Ka ị̀ ga-achọ ịnwale iji telifon gbaa àmà, ịgba àmà n’okporo ámá, ma ọ bụ n’ógbè achụmnta ego? Gịnị ma i tinye ihe ndị ahụ ị na-eche n’echiche n’ọrụ n’ọnwa a? Jehova ga-enyere gị aka ịzụlite anyaike dị mkpa. (Ọrụ 4:31; 1 Tesa. 2:2b) Ma eleghị anya gị na onye ọsụ ụzọ nwere ahụmahụ n’akụkụ ije ozi ndị a pụrụ iyi agba ịrụ.
8 Onye ọ bụla nke chọrọ ịmụba òkè ọ na-ekere n’ọrụ ịgba àmà ga-achọ ikere òkè n’ịgba àmà mberede. Ọtụtụ mgbe nanị ihe ọ na-ewe agwụla iso mmadụ malite inwe mkparịta ụka enyi na enyi. Nanị welite otu isiokwu nke unu abụọ nwere mmasị na ya, ma eleghị anya na-eji ụzọ njekwu a kọwapụtara na paragraf nke 6 eme ihe. Gbalịsie ike iji ọbụna ntakịrị oge ndị gaara efu nkịtị mee ihe n’ụzọ amamihe. Ị pụrụ iji ọbụna minit ise, minit iri, ma ọ bụ minit iri na ise mee ihe n’ụzọ bara uru n’ịgba àmà mberede.
9 Oge Iji Cheghachi Echiche Azụ: Cheghachi echiche azụ n’isi ihe gbara ọkpụrụkpụ ndị e kwuru n’ihe nkiri e mere ná Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999-2000. Ihe nkiri ahụ a kpọrọ Inwe Ekele Maka Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị, mere ka anyị chesie echiche ike banyere ọdịiche dị n’etiti Jekọb na Isọ. Isọ kwuru na ya nwere mmasị n’ihe ime mmụọ dịkwa ka Jekọb nwere, ma ihe ndị Isọ na-eme egosipụtaghị ya. (Jen. 25:29-34) Lee ihe ịdọ aka ná ntị dị ike ọ bụ nye anyị! Dị ka Jekọb, ka anyị dịrị njikere ịgbalịsi ike, ọbụna ịgba mgba, maka ngọzi Jehova. (Jen. 32:24-29) Gịnị ma anyị jiri April na ọnwa nile na-abịanụ tụtee ịnụ ọkụ n’obi anyị, ghara iji ihe nketa ime mmụọ anyị magburu onwe ya gwurie egwu mgbe ọ bụla?
10 “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zef. 1:14) A ghaghị ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Ndụ nọ n’ihe ize ndụ! Ka ọnwa a ghọọ ọnwa a gọziri agọzi n’ụzọ pụrụ iche nye ndị Jehova nile ka anyị jikọtara aka ọnụ na-egosi na anyị ‘na-anụ ọkụ n’obi maka ọrụ ọma.’
Igbe dị na peeji nke 4]
Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta
Ememe Ncheta nke afọ a dabara na Wednesday, April 19. Ndị okenye kwesịrị ilebara ihe ndị na-esonụ anya:
◼ N’isetịpụ oge maka nzukọ ahụ, jidenụ n’aka na a gaghị ebugharị ihe nnọchianya ndị ahụ ruo mgbe anyanwụ dasịrị.
◼ E kwesịrị ịgwa mmadụ nile, tinyere onye ọkà okwu, kpọmkwem oge na ebe a ga-eme ememe ahụ.
◼ E kwesịrị inweta ụdị achịcha na mmanya kwesịrị ekwesị, kwadebekwa ha.—Lee Ụlọ Nche February 15, 1985, peji nke 19.
◼ E kwesịrị iweta efere, iko, na ákwà tebụl kwesịrị ekwesị n’ụlọ nzukọ n’oge ma hazie ha.
◼ E kwesịrị ihichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ebe ọzọ a ga-ezukọ nke ọma tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ịhọpụta ndị atendantị na ndị ga-ebugharị ihe nnọchianya ndị ahụ ma gwa ha tupu oge eruo banyere ọrụ ha na ụkpụrụ kwesịrị ekwesị.
◼ E kwesịrị ime ndokwa ibujere onye ọ bụla so n’ime ndị e tere mmanụ, bụ́ onye nwere nkwarụ, nke na-enweghịkwa ike ịbịa, ihe nnọchianya ndị ahụ.
◼ Mgbe e mere ndokwa ka ihe karịrị otu ọgbakọ jiri otu Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe, e kwesịrị inwe ezi mmekọrịta ihe n’etiti ọgbakọ ndị o metụtara iji zere mgbakọta na-adịghị mkpa n’ụzọ mbata, okporo ụzọ, na n’ebe ndọba ụgbọala.