Ị̀ Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe?
1 Ọ bụrụ na a jụọ anyị ma anyị na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, o yiri ka anyị ga-aza ee n’egbughị oge! Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndokwa ndị dị nsọ nke Chineke ndị anyị na-eji akpọrọ ihe?
2 Lee ka anyị si jiri mmekọrịta e kwere ka anyị na Nna anyị nke eluigwe na-enwe kpọrọ ihe nke ukwuu! Ọ na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị ‘abịaruo ya nso, ọ ga-abịarukwa anyị nso.’ (Jes. 4:8) E wezụga àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst, ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16 ) N’ihi ekele sitere n’obi anyị, n’ekpere anyị na-ekpe kwa ụbọchị, anyị na-ekwupụta ekele dị omimi anyị nwere maka onyinye a dị oké ọnụ ahịa nke sitere n’aka Chineke.
3 Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ, dịkwa nsọ nye anyị, dịkwa ka nzukọ Jehova n’elu ala dị. Anyị na-egosi ekele kwesịrị ekwesị maka ndokwa ndị a sitere n’aka Jehova mgbe anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, na-ewusi ihe nkekọ nke ịhụnanya ụmụnna ike, jiri nlezianya na-agbaso ịdị n’usoro nke ọchịchị Chineke, ma na-erubere ndị na-edu ndú isi.—1 Pita 1:22.
4 Site n’aka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, anyị na-enweta ụbara nri ime mmụọ. Nke ahụ ga-abụ eziokwu n’afọ a ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke.” Anyị ga-enweta ntụziaka dị oké mkpa n’ebe ahụ ma nwee mkpakọrịta ịhụnanya ndị dị anyị oké mkpa. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele sitere n’ala ala obi maka ndokwa a dị nsọ?
5 Ahapụla Ụlọ Jehova: Nehemaịa dụrụ ndị rụsiri ọrụ ike iji wughachi mgbidi Jerusalem ọdụ ka ha ‘ghara ịhapụ ụlọ Chineke ha.’ (Neh. 10:39) Taa, “ụlọ” Jehova bụ ndokwa o mere maka ife ofufe. Mgbakọ distrikti anyị bụ otu akụkụ nke ndokwa ahụ. Ka anyị wee ghara ịhapụ ndokwa a, anyị aghaghị ịga ma ṅaa ntị nke ọma, na-egosi Jehova na anyị ji ndokwa ya kpọrọ ihe nke ukwuu. (Hib. 10:24, 25) Olee atụmatụ ndị anyị kwesịrị ime ugbu a iji gosi na anyị ji ihe omume a dị nsọ kpọrọ ihe n’ụzọ zuru ezu?
6 Gaa Ụbọchị Atọ ahụ Dum: Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime ndokwa ịgazu ụbọchị atọ dum nke mgbakọ ahụ. Ị̀ na-eme atụmatụ ịbịarute n’oge kwa ụbọchị na ịnọgide ruo mgbe e kpere ekpere ikpeazụ na Sunday? Ya bụrụ otú ahụ, ị ga-enweta ngọzi bara ụba. Ịga mgbakọ anaghị adịcha mfe mgbe nile. Ime mgbanwe n’ọrụ ego ị na-arụ pụrụ ịchọ ka i were nguzo siri ike. Usoro ime njem anaghị adịcha ntụsara ahụ mgbe nile. Ma ekwela ka ihe ndị a kụdaa gị mmụọ i wee ghara ịga mgbakọ ahụ.
7 Chee Echiche Banyere Ihe Nlereanya A Magburu Onwe Ya: Ka ha nọ na-aga mgbakọ distrikti n’afọ gara aga, otu ìgwè ụmụnna nọ n’otu mba n’Africa bụ́ ebe e nwere ọgba aghara obodo zutere otu ìgwè ndị agha. A jụrụ ụmụnna ahụ, sị: “Olee ndị unu bụ, ebeekwa ka unu na-aga?” Ha zara, sị: “Anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị na-agakwa mgbakọ distrikti.” Otu n’ime ndị soja ahụ kwuru, sị: “Unu bụ́ Ndịàmà Jehova adịghị atụ ihe ọ bụla ụjọ. Gawanụ, unu ga-enwekwa mgbakọ unu n’enweghị nsogbu ọ bụla. Otú ọ dị, maranụ na unu ga-ezute ọtụtụ ndị soja. Nọgidenụ na-aga n’etiti ụzọ! Ọ bụrụ na unu ahụ ka ọtụtụ mmadụ gbakọrọ, nọgidenụ na-aga n’etiti ụzọ!” Ha mere otú ahụ ma jeruo mgbakọ ahụ n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ụmụnna ndị a nwetara ụgwọ ọrụ n’ihi na ha gosipụtara na ha ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe.
8 Dị ka ụmụnna anyị nọ ná mba ahụ, anyị na-ezutekwa ihe ịma aka. Ma, n’enweghị ihe ịrụ ụka, anyị pụrụ iṅomi okwukwe ha ma kpebisie ike ịgazu nnọkọ nile nke mgbakọ distrikti anyị. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka anyị hazigharịa ihe, dabere n’ebe Jehova nọ maka nduzi, na-amata na ọ ga-agọzi mgbalị anyị na-eme ịnọrọ ya mgbe usoro ihe omume ahụ dum na-aga n’ihu.
9 Nweta Ngọzi Ndị Dị na Ya: Agụụ Okwu Chineke na-agụsi anyị ike, ebe anyị matara na anyị pụrụ ito ruo nzọpụta site na ya. (1 Pita 2:2) Anyị ịga mgbakọ distrikti ahụ na ịṅa ntị n’usoro ihe omume ahụ ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka iwulite okwukwe siri ike n’Okwu ahụ wee si otú ahụ nwekwuo ike iguzogide mwakpo Setan. N’ime otú ahụ, anyị ga-egosi Jehova na ndị nile na-ahụ ihe na-emenụ na anyị ji ihe ndị dị nsọ akpọrọ ihe n’ụzọ zuru ezu nakwa na anyị “adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi; . . . kama n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.”—Hib. 10:39; 12:16; Ilu 27:11.
10 Anyị pụrụ ịtụ anya na Jehova Chineke ga-emeghe windo nile nke eluigwe ma mee ka ọtụtụ ngọzi ime mmụọ zokwasị anyị dị ka mmiri. (Mal. 3:10) Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ịnọ ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” site ná mmalite ihe omume n’ụtụtụ Friday ruo n’ekpere mmechie na “Amen!” nke ehihie Sunday. Ị ga-enwe obi ụtọ na i mere otú ahụ!