“Ka E Mee Ihe Nile Ka E Wee Wulie Mmadụ Nile Elu Dị Ka Ụlọ”
1 N’imeso ụmụnna anyị ihe, anyị kwesịrị ime ihe dị mma iji wulie ha elu. Nke a pụtara inwe nchegbu banyere ichebe ọdịmma ime mmụọ ha. Ọ bụrụ na anyị na-arụ ọrụ ego ụfọdụ metụtara ịkwalite ngwá ahịa ma ọ bụ ọrụ, ọ dị mkpa ka anyị lezie anya ka ihe anyị na-eme ghara ime ka ụmụnna anyị sụọ ngọngọ.—2 Kọr. 6:3; Fil. 1:9, 10.
2 Ụfọdụ etinyewo aka n’atụmatụ achụmnta ego dị iche iche, na-elekwasị ndị Kraịst ibe ha anya dị ka ndị pụrụ ịbụ ndị ahịa ha. Ụlọ ọrụ ụfọdụ na-ere ngwá ahịa na-agba ndị nnọchianya ha ume ka ha were onye ọ bụla dị ka onye pụrụ ịbụ onye ahịa ha—gụnyere ndị ha na ha nọ n’otu okpukpe. Ụfọdụ ụmụnna emewo ndokwa maka nnọkọ ndị buru ibu nke Ndịàmà ná nzube nke ịgba ha ume itinye aka n’otu achụmnta ego. Ndị ọzọ na-akwalite atụmatụ ha site n’izigara ndị kwere ekwe ibe ha ngwá ahịa, broshuọ, ma ọ bụ tepụ dị iche iche ha na-ekwughị ka e wetara ha. Ọ̀ ga-ekwesị ekwesị onye Kraịst iji nnọkọ ọchịchị Chineke eme ihe maka abamuru onwe onye site n’aka ụmụnna ime mmụọ ya? Ee e!—1 Kọr. 10:23, 24, 31–33.
3 Ụmụnna Kwesịrị Ilezi Anya: Nke a apụtaghị na onye Kraịst apụghị isoro nwanna ya chụkọọ nta ego. Ọ bụ okwu aka mmadụ. Otú ọ dị, ụfọdụ na-amalite atụmatụ achụmnta ego ndị na-akwalite anyaukwu, ha na-akwalikwa ndị kwere ekwe ibe ha isonyere ha. Ọtụtụ n’ime atụmatụ ndị a na-ada, na-efu ndị so na ha ego buru ibu. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ọchịchọ ịkpata ego ngwa ngwa kpaliri ndị sonyere n’achụmnta ego ahụ, onye ahụ na-ahazi ya ekwesịghị iche na ụta adịghịrị ya ma ọ bụrụ na atụmatụ ahụ adaa. O kwesịrị ibu ụzọ jiri nlezianya tụlee otú ọ pụrụ isi metụta ọdịmma ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ụmụnna ya ma ọ bụrụ na atụmatụ ahụ agaghị nke ọma. Ndị nwere ibu ọrụ ọchịchị Chineke kwesịrị ịkpachara anya karịsịa banyere ọrụ ego ha n’ihi na ndị ọzọ ji nkwanye ùgwù na-elegara ha anya ma nwee ntụkwasị obi dị ukwuu n’ebe ha nọ. Ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi imebi ntụkwasị obi ahụ. A pụrụ ịnapụ nwanna nwoke ihe ùgwù nke ije ozi dị nsọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ adịkwaghị akwanyere ya ùgwù.
4 Nzube anyị kwesịrị ịbụ “ka e mee ihe nile ka e wee wulie mmadụ nile elu dị ka ụlọ.” (1 Kọr. 14:26) Anyị aghaghị izere ime ihe ọ bụla na-ewebata ma ọ bụ na-akwalite azụmahịa n’ime ọgbakọ. O nweghị ihe jikọrọ ihe ndị dị otú ahụ na ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere anyị ji ezukọta ọnụ.—Hib. 10:24, 25.