Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/00 p. 1
  • Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anyị Enwetụbeghị Ezi Ihe Otú A n’Ụzọ Ime Mmụọ!
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Mkpụrụ Nke Mmụọ Nsọ” Na-ewetara Chineke Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 9/00 p. 1

Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya

1 A na-ejikarị ego ole mmadụ na-enweta atụ ihe ịga nke ọma ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji ele ndị nwere ego anya dị ka ndị kasị enwe obi ụtọ na afọ ojuju. Otú ọ dị, ndị na-eche na ego pụrụ ịzụta obi ụtọ na-ehie nnọọ ụzọ. (Ekli. 5:12) “Ndị na-ezube ịba ọgaranya” n’ụzọ ihe onwunwe adịghị enwe ọṅụ na-adịgide adịgide. (1 Tim. 6:9) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ndị ohu Jehova na-enwe ọṅụ n’ezie ma bụrụ ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa. (Ilu 10:22; Mkpu. 2:9) N’ụzọ dị aṅaa?

2 Ihe Àmà nke Akụ̀ na Ụba Anyị: Anyị nwere amamihe ime mmụọ dị ukwuu na nghọta nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Site ná nzukọ elu ala ya, Jehova na-akụziri anyị ihe mgbe nile banyere onwe ya na Ọkpara ya maka abamuru anyị na-adịgide adịgide. Nghọta ziri ezi na-eme ka o kwe anyị omume ịbịaru Jehova nso na iso ya nwee mmekọrịta chiri anya. (Jes. 4:8) Ịghọta ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ na ịgbaso iwu Chineke na-echebe anyị pụọ n’ọrịa na n’ihe ize ndụ ụfọdụ. Anyị nwere obi ike na Jehova ga-enye anyị ihe na-akpa anyị, na-eme ka anyị nwee afọ ojuju nke Chineke na-enye na udo nke uche.—Mat. 6:33.

3 Anyị nwere udo na ịdị n’otu n’etiti òtù ụmụnna ime mmụọ anyị n’ihi na anyị na-azụlite mkpụrụ nke mmụọ Chineke. N’ịbụ ndị ihe nkekọ siri ike nke ịhụnanya mere ka anyị dị n’otu, ọ dịghị anyị mkpa mgbe ọ bụla inwe mmetụta nke ịbụ ndị Chineke ma ọ bụ ụmụnna anyị gbahapụrụ mgbe anyị na-eche ọdachi ihu.—Gal. 6:10.

4 Ndụ anyị nwere nzube n’ezie. Anyị na-ewere ya n’ihe ùgwù magburu onwe ya ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile. Nke a na-eweta ọṅụ na-adịgide adịgide ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka ịbịa soro Chineke nwee ezi mmekọrịta ma soro anyị na-eje ozi n’ịdị n’otu n’ofufe dị ọcha. Akụ̀ dị oké ọnụ ahịa anyị nwere nke bụ́ ozi ahụ na-ewetara Jehova nsọpụrụ ma na-enye anyị afọ ojuju nke ịtụnye ụtụ n’ido aha ya nsọ. Anyị na-anọgide na-enwe echiche uche ziri ezi, na-amara na a ga-emezu olileanya anyị nwere maka ọdịnihu n’isi nso.

5 Igosi Ekele Anyị Nwere: Ka anyị nọgide mgbe nile na-enwe ekele maka ngọzi Jehova, bụ́ nke mere ka anyị bụrụ n’ezie, ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa. (Ilu 22:4) Iwepụta oge kwa ụbọchị iji tụgharịa uche n’ihe anyị nwere, na-akpali anyị ikele Jehova maka ịhụnanya ya o ji mmesapụ aka na-egosi anyị ma nọgide na-efe ya ofufe a na-ekewaghị ekewa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya