Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/00 p. 1
  • Ị̀ Na-eji Nkwuwa Okwu Eme Nkwusa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-eji Nkwuwa Okwu Eme Nkwusa?
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • ‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Gee Ntị Ka Ị Nụ Mgbe A Ga-aza Ajụjụ Ndị A:
    2018-2019 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Sekit nke Onye Nlekọta Sekit
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 12/00 p. 1

Ị̀ Na-eji Nkwuwa Okwu Eme Nkwusa?

1 N’agbanyeghị ịbụ ndị ndị mmegide nwụchiri ma yie egwu, Pita na Jọn nọgidere jiri nkwuwa okwu na-ekwusa ozi Alaeze ahụ. (Ọrụ 4:17, 21, 31) Gịnị ka iji nkwuwa okwu na-eme nkwusa pụtara nye anyị taa?

2 Iji Nkwuwa Okwu Na-agba Àmà: Okwu ya na “nkwuwa okwu” yiri bụ “anyaike,” bụ́ nke pụtara “atụghị egwu ma ọlị, obi ike, na ntachi obi.” Nye ezi ndị Kraịst, iji nkwuwa okwu na-eme nkwusa pụtara ikwupụta echiche ha n’atụghị egwu mgbe ọ bụla e nwere ohere kwesịrị ekwesị iji soro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. (Ọrụ 4:20; 1 Pita 3:15) Ọ pụtara na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme anyị. (Abụ Ọma 119:46; Rom 1:16; 2 Tim. 1:8) Ya mere, nkwuwa okwu bụ àgwà dị mkpa iji rụzuo ọrụ e nyere anyị nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’oge ọgwụgwụ a. Ọ na-akwali anyị ikwusara ndị mmadụ ozi ọma ahụ n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ha.—Ọrụ 4:29; 1 Kọr. 9:23.

3 Nkwuwa Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ: Àgwà ịtụ ụjọ ma ọ bụ ime ihere ọ̀ na-eme ka o siere gị ike ikwusara ụmụ akwụkwọ ibe gị ozi ọma? Ọ naghị adị mfe mgbe ụfọdụ; n’ezie, ọ pụrụ ịbụ ezigbo ihe ịma aka. Otú ọ dị, Jehova ga-eme ka ị dịkwuo ike ma ọ bụrụ na i kpee ekpere maka nkwuwa okwu iji kwusaara ndị ọzọ ozi ọma. (Abụ Ọma 138:3) Nkwuwa okwu ga-enyere gị aka ime ka a mara gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa iguzogide ịkwa emo. N’ihi ya, gị ime nkwusa n’ụlọ akwụkwọ pụrụ ịzọpụta ndị na-ege gị ntị.—1 Tim. 4:16.

4 Nkwuwa Okwu n’Ụlọ Ọrụ: À maara gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ụlọ ọrụ gị? Ọ pụrụ ịbụ na nanị ụzọ ozi ọma ahụ pụrụ isi rutere ndị ọrụ ibe gị bụ site na gị ikwusara ha ozi ọma. Nkwuwa okwu gị ga-enyekwara gị aka iwepụta oge maka nzukọ ndị Kraịst gị nakwa maka mgbakọ.

5 Nkwuwa Okwu Mgbe A Nọ n’Ule: Ịzụlite nkwuwa okwu dị oké mkpa mgbe anyị na-ezute mmegide. (1 Tesa. 2:1, 2) Ọ na-enyere anyị aka ijidesi okwukwe anyị ike mgbe a na-eyi anyị egwu, na-akwa anyị emo, ma ọ bụ na-akpagbu anyị kpọmkwem. (Fil. 1:27, 28) Ọ na-ewusi anyị ike iji guzosie ike mgbe a na-arụgide anyị imebi nrapara anyị na-araparasi ike n’ụkpụrụ Chineke anyị, bụ́ Jehova. Ọ na-ewusi anyị ike ịnọgide na-enwe omume ịchọ udo mgbe ndị ọzọ na-akpasu esemokwu.—Rom 12:18.

6 N’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị pụrụ iche ihu n’onwe anyị, ka anyị nọgidesie ike jiri nkwuwa okwu na-ekwusa ozi ọma ahụ.—Efe. 6:18-20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya