Nrụgide Ndị Ọgbọ na Ihe Ùgwù I Nwere Ime Nkwusa
1 Nrụgide ndị ọgbọ na-enwe mmetụta dị ike—n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. Ndị ibe anyị bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi na-enwe mmetụta ziri ezi n’ebe anyị nọ, bụ́ nke na-akpali anyị ịrụ ọrụ ọma nke ndị Kraịst. (Hib. 10:24) Otú ọ dị, ndị òtù ezinụlọ na-abụghị Ndịàmà, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị agbata obi anyị, ma ọ bụ ndị ọzọ anyị maara, pụrụ ịrụgide anyị ịgbaso ụzọ ndụ megidere ụkpụrụ ndị Kraịst. Ha pụrụ ikwu okwu ‘ịkparị ibi obi ọma anyị n’ime Kraịst.’ (1 Pita 3:16) Olee otú anyị pụrụ isi nọgide ná mkpebisi ike anyị ịga n’ihu na-eme nkwusa n’agbanyeghị ajọ nrụgide ndị ọgbọ nke anyị pụrụ inwe?
2 Ndị Ezinụlọ Anyị: Mgbe ụfọdụ, onye bụ́ di na nna na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova nwere ike ọ gaghị achọ ka ụmụ ya na nwunye ya kere òkè n’ozi a na-eje maka ọha. Nke a bụ ihe mere n’otu ezinụlọ na Mexico. Nwunye nke otu nwoke na ụmụ ya asaa batara n’eziokwu. Na mbụ, o megidere ha n’ihi na ọ chọghị ka ezinụlọ ya na-eme nkwusa ma na-enyefe akwụkwọ e ji amụ Bible site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O chere na nke a ekwesịrịghị ha. Otú ọ dị, nwunye ya na ụmụ ya nọgidesiri ike ná mkpebi ha ijere Jehova ozi na ikerechi òkè anya n’ozi. Ka oge na-aga, nwoke ahụ malitere ịhụ abamuru nke ịnakwere ndokwa Chineke mere maka ịrụ ọrụ nkwusa, ọ rarakwaara onwe ya nye Jehova. O were ya afọ 15 ịnakwere eziokwu ahụ, ma ọ̀ gaara eme otú ahụ ma a sị na ezinụlọ ya anọgidesighị ike n’ihe ùgwù ha nwere ime nkwusa?—Luk 1:74; 1 Kọr. 7:16.
3 Ndị Ọrụ Ibe Anyị: Mgbalị ndị ị na-eme iji gbaara ndị ọrụ ibe gị àmà nwere ike ghara ịmasị ụfọdụ. Otu nwanna nwanyị kọrọ na mgbe e nwere otu nkwurịta okwu n’ọfịs ha banyere ọgwụgwụ ụwa, a kwara ya emo n’ihi na ọ tụrụ aro ka ha gụọ Matiu isi 24. Otú ọ dị, ka ụbọchị ole na ole gasịrị, otu n’ime ndị ọrụ ha gwara ya na ya agụwo isiakwụkwọ ahụ ma nwee mmasị na ya. E nyere ya otu akwụkwọ ma mee ndokwa ịmụrụ ya na di ya Bible. Ọmụmụ ihe mbụ ha nwere ruru elekere abụọ nke ụtụtụ. Mgbe ha mụsịrị ihe nke ugboro atọ, ha malitere ịga nzukọ, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, ha hapụrụ iji ụtaba eme ihe ma malite ikere òkè n’ozi. Nke a ọ̀ gaara eme ma a sị na nwanna anyị nwanyị emeghị mgbalị isoro ndị ọzọ kerịta olileanya ya?
4 Ụmụ Akwụkwọ Ibe Anyị: Ọ bụghị ihe na-adịghị emekebe bụ́ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà inwe nrụgide ndị ọgbọ n’ụlọ akwụkwọ na ịtụ egwu na ndị ntorobịa ndị ọzọ ga-eme ha akaje n’ihi ikere òkè n’ọrụ nkwusa. Otu onye Kraịst nọ n’afọ iri na ụma na United States sịrị: “Ụjọ na-atụ m ịgbara ndị ọzọ na-eto eto àmà n’ihi na egwu na-atụ m na a ga-eji m eme ihe ọchị.” N’ihi ya, o jighị ohere ndị dapụtaranụ mee ihe n’ịgbara ndị ọgbọ ya àmà n’ụlọ akwụkwọ na n’ókèala ha. Olee otú ị pụrụ isi nwee ume iji guzogide nrụgide ndị ọgbọ? Tụkwasị Jehova obi, na-achọ nnwapụta ya. (Ilu 29:25) Nwee obi ụtọ n’ikike i nwere iji Okwu Chineke eme ihe n’ozi gị. (2 Tim. 2:15) Onye ntorobịa ahụ a kpọtụrụ uche n’elu malitere ikpeku Jehova ekpere, na-arịọ ya ka o nyere ya aka ịzụlite ọchịchọ ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe ya okwu. Ọ malitere ịgba àmà mberede n’ụlọ akwụkwọ, rụpụta ihe ndị dị mma, n’oge na-adịghịkwa anya, na-agwa mmadụ nile ọ maara okwu. O kwubiri, sị: “Ndị ahụ na-eto eto chọrọ olileanya maka ọdịnihu, Jehova jikwa anyị na-enyere ha aka.”
5 Ndị Agbata Obi Anyị: Anyị pụrụ inwe ndị agbata obi ma ọ bụ ndị ọzọ anyị maara bụ́ ndị na-ewesotụ anyị iwe n’ihi ndị anyị bụ na ihe anyị kweere. Ọ bụrụ na ị na-atụ ihe ha na-eche n’echiche ụjọ, jụọ onwe gị, sị: ‘Hà maara eziokwu ahụ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi? Gịnị ka m pụrụ ime iji ruo ha n’obi?’ Otu onye nlekọta sekit chọpụtara na a na-arụpụta ihe ndị dị mma mgbe a na-agbara ndị agbata obi àmà n’ụzọ dị nta ma chie anya. Rịọ Jehova maka ume na amamihe ndị dị gị mkpa iji nọgide na-achọ ndị nwere obi eziokwu.—Fil. 4:13.
6 Anyị ikwe ka ajọ nrụgide ndị ọgbọ merie anyị pụrụ ime ka obi tọọ ndị na-emegide anyị ụtọ, ma ime otú ahụ, ọ̀ ga-abụ maka ọdịmma ha kasịnụ—ma ọ bụ nke anyị? Ndị obodo Jisọs megidere ya. O diri ọbụna okwu ọjọọ nke ụmụnne ya gwara ya. Ma ọ maara na ya pụrụ inyere ha aka nanị site n’ịnọgidesi ike n’ụzọ Chineke setịpụwooro ya. N’ụzọ dị otú a, Jisọs ‘tachiri obi ná nkwugide dị otú ahụ, bụ́ nke ndị mmehie na-ekwugide onwe ha.’ (Hib. 12:2, 3) Anyị aghaghị ime otu ihe ahụ. Kpebisie ike ijiri ihe ùgwù i nwere ikwusa ozi Alaeze ahụ eme ihe kasị mma. Site n’ime otú ahụ, “ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.”—1 Tim. 4:16.