Ime Ka E Nwee Ekele Maka Vidio Bụ́ The Bible—Mankind’s Oldest Modern Book
Ajụjụ ndị na-esonụ na-ewepụta isi ihe ndị ị pụrụ ịrịbawo ama mgbe ị na-ekiri vidio a: (1) Eziokwu ndị dị aṅaa na-eme ka Bible bụrụ nke na-enweghị atụ? (2) Nye ihe atụ nke otú Bible, n’agbanyeghị otú o si mee ochie, si ekwekọ na sayensị ọgbara ọhụrụ. (3) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Bible nke oge a agbanwebeghị site n’ihe odide ya ndị mbụ? (4) Olee ụdị ihe odide kwesịrị ịrịba ama nke dị n’ihe odide oge ochie nke Bible, obi ike dịkwa aṅaa ka nke a na-eme ka i nwee? (5) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka John Wycliffe, Johannes Gutenberg, William Tyndale, Mary Jones, na Charles Taze Russell si tụnye ụtụ n’ịgbasa Okwu Chineke n’ụwa nile? (6) Olee otú chọọchị si megide Bible n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, ma gịnị meworo ka o nwee ike ịdịgide ruo n’oge anyị? (7) Ruo ókè ha aṅaa ka nzukọ Jehova sụgharịworo ma bipụta Bible? (8) Olee otú ndụmọdụ dị irè nke dị na Bible siworo nyere ndị mmadụ aka imeri nsogbu iri ahụ nke ịgba chaa chaa (1 Tim. 6:9, 10), nkewa alụmdi na nwunye nakwa ekwesịghị ntụkwasị obi (1 Kọr. 13:4, 5; Efe. 5:28-33), na oké nchegbu maka ihe onwunwe (Mat. 16:26)? (9) Olee ihe àmà na-egosi na itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ pụrụ imeri ịkpọasị n’ihi mba, agbụrụ, na ebo mmadụ si, bụ́ nke dị n’ụwa? (10) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ịmụta ihe ndị dị na Bible siworo wetara gị obi ụtọ ka ukwuu? (11) Ole ndị ka i chere ga-erite uru site na vidio a, ị̀ ga-esikwa aṅaa mee ka ha kirie ya?