Mee Ezi Ihe Ma Nweta Otuto!
1 “Obi ruru ha ala otú m na-ahụtụbeghị n’etiti ndị ọ bụla ọzọ.” “Ọ bụ ihe obi ụtọ inwe ìgwè a.” Ndị a bụ ụfọdụ n’ime okwu ọma ndị e nwetara site n’aka ndị na-ahụ ihe na-emenụ mgbe mgbakọ distrikti afọ gara aga gasịrị, na-emesi ike aha ọma anyị nwere dị ka otu nzukọ. (Ilu 27:2; 1 Kọr. 4:9) N’ikpeazụ, otuto dị otú ahụ na-agara Jehova. (Mat. 5:16) Ugbu a anyị nwere ohere ọzọ magburu onwe ya iji too Chineke ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke afọ a.
2 Kwa afọ, anyị na-enweta ihe ncheta e ji obiọma enye banyere àgwà kwesịrị ekwesị ná mgbakọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ka omume, ejiji, na akparamàgwà nke ụwa na-adịwanye njọ, anyị na-ajụ iṅomi ha. Anyị achọghị imetọ aha ọma anyị. (Efe. 2:2; 4:17) Ka anyị buru ịdọ aka ná ntị ndị na-esonụ n’uche.
3 Mee Ezi Ihe—N’ebe I Bi Nakwa na Họtel: A maara anyị dị ka ndị na-eme ihe n’eziokwu. (Hib. 13:18) N’ihi ya, anyị agaghị esi nri n’ime ọnụ ụlọ ma ọ bụrụ na a dịghị ekwe ka e mee nke a. Otu manịja kwuru na ya nwere ike igbudara Ndịàmà Jehova ego ọnụ ụlọ n’ihi na ya maara na ha ga-elekọta ụlọ ahụ nke ọma. N’ezie, anyị agaghị achọ iwere ihe ndị na-abụghị nke anyị dị n’ebe anyị bi ma ọ bụ na họtel. Kama nke ahụ, gosi ekele maka ozi ndị ha jeere anyị. Nweekwa ezi àgwà na ndidi mgbe ọ bụla gị na ndị ọzọ e nyekọrọ gị na ha ụlọ na-emekọ ihe.
4 Ọ na-atọ ndị na-ahụ ihe na-emenụ ụtọ mgbe ha na-ahụ ndị na-eto eto anyị ka ha na-akpa àgwà ọma ma na-erube isi. (Efe. 6:1, 2) Ndị mụrụ ụmụ, biko, na-elekọtanụ ụmụ unu mgbe nile ka ha ghara ịdị na-enye ndị ọzọ nsogbu. Mmadụ nile kwesịrị izere iji ike na-akwachi ụzọ ma ọ bụ ịdị na-eme oké ụ̀zụ̀, karịsịa n’abalị.
5 Mee Ezi Ihe—N’ebe A Na-enwe Mgbakọ: A chọpụtawo na ụfọdụ ndị bịara mgbakọ na-ajụ irubere ndị atendantị isi, ọbụna na-agwa ha okwu n’ụzọ na-ekwesịghị ndị Kraịst. N’ihi agbasoghị ntụziaka nke ụmụnna ndị ahụ na ịdọba ụgbọala ha n’ebe a na-enyeghị ikike ịdọba ụgbọala, e nwewo mgbe ụfọdụ agaghị ihu ma ọ bụ azụ nke ụgbọala. N’ezie, àgwà mụ onwe m godi adịghị eme ka a mata mmadụ dị ka onye na-eme ezi ihe, ọ dịghịkwa ewetara Jehova Chineke otuto. N’ihi ya, ka anyị na-ahụ n’anya, na-enwe ndidi, ma na-emekọ ihe ọnụ.—Gal. 5:22, 23, 25.
6 Ọ bụ ezie na a tụwo aro anyị iweta nri ehihie nke anyị dị mfe, o kwesịghị ekwesị iri nri na-adịghị agbari ngwa ngwa nke pụrụ ime ka mmadụ na-ehi ụra mgbe ihe omume ehihie na-aga n’ihu. Nke a ga-egosi enweghị ekele maka ihe omume dị otú ahụ dị mkpa.
7 Mee Ezi Ihe—Site n’Uwe na Ejiji Anyị: Mgbe otu n’ime mgbakọ distrikti ndị e nwere n’afọ gara aga gasịrị, editọ n’otu nnukwute ụlọ ọrụ dị n’obodo ukwu nke na-ebipụta akwụkwọ akụkọ dere, sị: “Karịa ihe ọ bụla ọzọ, ọ bụ omume Ndịàmà ahụ n’onwe ha bụ ihe kasị dị ịrịba ama. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịhụ ka ọtụtụ ndị mmadụ na-akwanyere onwe ha ùgwù ma nwee nsọpụrụ otú a. N’ijikere nke ọma, ọtụtụ narị ezinụlọ ndị si n’agbụrụ na ebo [nile] ji nwayọọ na-abanye n’ụlọ mgbakọ ahụ. Akparamàgwà ha dị nnọọ iche na nke ihe ka ukwuu n’ìgwè mmadụ ndị na-abanye n’ụlọ mgbakọ ahụ. N’eziokwu, Ndịàmà dị nnọọ iche n’ebe ihe ka ukwuu n’ìgwè mmadụ nọ n’ozuzu ha. Ọ ghọwo ihe a na-emekarị bụ́ ọha mmadụ ịkpa àgwà na-ezighị ezi. . . . N’ezie, ìgwè Ndịàmà na-enye obi ụtọ.” Ka anyị ghara ikwe ka uwe na ejiji ma ọ bụ àgwà anyị dọpụ uche n’ụzọ ọ bụla n’ọnọdụ ime mmụọ nke mgbakọ ahụ.—Fil. 1:10; 1 Tim. 2:9, 10.
8 Mee Ezi Ihe—Na Baptism: Ndị a ga-eme baptism kwesịrị ịkwanyere ihe omume a ùgwù kasịnụ. Iyi ákwà ịsa ahụ kwesịrị ekwesị ga-egosi na ha ghọtara ịdị nsọ nke ihe omume ahụ. Ọ ga-abụ ihe bara uru karịsịa ka ndị nduzi ọmụmụ Bible soro ndị ha na-eduziri ọmụmụ ihe tụleghachi “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke April 1, 1995, tupu ha abịa mgbakọ.
9 Ezi akparamàgwà anyị na omume nsọpụrụ Chineke anyị ga-enye ihe àmà nke nkwenkwe ndị Kraịst anyị ma mee ka ọ dịrị ndị nwere obi eziokwu mfe karị ịmata eziokwu ahụ. Ya mere, ka anyị “na-eme ezi ihe” ma nweta otuto mgbe anyị na-aga Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke.”—Rom 13:3.